Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 28 Septemba
Kalenda Ọtọdọks · 15 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 28 Septemba 2027
Tiuzdee · Izu nke 15 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Afterfeast of the Exaltation of the Cross
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi (maka Mọnde)
11Ma mgbe Sefas bịaruru Antiọk, eguzogidere m ya nʼihu ya, nʼihi na ihe o mere mara ya ikpe. 12Tupu ndị Jemis zitere abịaruo ebe ahụ, ya na ndị mba ọzọ na-erikọ nri, ma mgbe ha rutere, ọ wepụrụ aka na nri laghachi azụ nʼihi na egwu ndị e biri ugwu na-atụ ya. 13Ndị Juu ụfọdụ sonyekwara ya inwe ihu abụọ a, nke mere na e si otu a duhiekwa Banabas nʼonwe ya. 14Ma mgbe m hụrụ na ha adịghị eme ihe dị ka eziokwu nke oziọma ahụ si dị, agwara m Sefas okwu nʼihu ha niile, sị, “Ọ bụrụ na gị nwa onye Juu na-ebi ndụ dịka onye mba ọzọ, na-abụghị dịka onye Juu, olee otu ị ga-esi manye ndị mba ọzọ ka ha na-ebi ndụ dịka ndị Juu?” 15Anyị onwe anyị bụ ndị Juu site nʼọmụmụ a mụrụ anyị, anyị abụkwaghị ndị mba ọzọ ndị mmehie, 16ma anyị maara na a dịghị agụ mmadụ ọbụla dị ka onye ezi omume site nʼọrụ nke iwu kama ọ bụ naanị site nʼokwukwe na Jisọs Kraịst. Ọ bụ nke a mere anyị ji kwere na Jisọs Kraịst ka a gụọ anyị na ndị ezi omume, site nʼokwukwe anyị kwere na Kraịst, ọ bụghị nʼihi na anyị rụrụ ọrụ nke iwu. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a ga-agụnye ka onye ezi omume nʼihi na ọ rụrụ ọrụ nke iwu.
Akwụkwọ ozi
21Anaghị m akpọ amara Chineke ihe na-enweghị isi. Nʼihi na a sị na a pụrụ ịgụ mmadụ dị ka onye ezi omume site nʼidebe iwu, mgbe ahụ ọnwụ Kraịst nwụrụ abaghị uru. 3:1Ndị nzuzu a kpọrọ onwe ha ndị Galeshịa! Onye napụrụ unu akọnuche unu? Nʼihu unu ka a nọ kọwaa nʼụzọ doro anya mkpọgide nʼobe a kpọgidere Jisọs Kraịst. 2Ọ bụ naanị otu ihe ka m chọrọ ịmata nʼaka unu. Unu natara Mmụọ Nsọ site nʼịrụ ọrụ iwu chọrọ, ka ọ bụ site na nkuzi nke okwukwe? 3Ọ ga-abụ na unu aghọọla ndị na-enweghị uche? Unu malitere site nʼike Mmụọ Nsọ, ma ugbu a unu na-akwụsịzi nʼike nke anụ ahụ? 4Unu tara ọtụtụ ahụhụ dị otu a nʼefu, ọ bụrụ nʼezie na ọ bụ nʼefu? 5Mmụọ nsọ ahụ Chineke nyere unu na ọrụ ebube ọ rụrụ nʼetiti unu, o mere ha nʼihi iwu unu debere, ka ọ bụ nʼihi na unu nụrụ ma kwerekwa oziọma? 6Nʼotu ụzọ ahụ, Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume. 7Matanụ nke a, na ọ bụ ndị nwere okwukwe bụ ụmụ Ebraham.
Oziọma (maka Mọnde)
24Ya mere, Jisọs soro ya gawa. Oke igwe mmadụ sokwa ya na-akpagbu ya. 25Ma otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ. 26Ọ taala ahụhụ dị ukwuu nʼaka ndị dibịa, mefukwaa ihe niile o nwere. Ma kama ọrịa ya ịdị mma, ọ na-aga nʼihu ịdị njọ. 27Ebe ọ nụrụla akụkọ banyere Jisọs, o sooro igwe mmadụ ndị ahụ, sitere nʼazụ metụ uwe ya aka. 28Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m enwe ike metụ naanị uwe ya aka, a ga-agwọkwa m.” 29Ngwangwa oruru ọbara ya kwụsịrị. Ọ matakwara nʼime onwe ya na ya enwerela onwe ya site nʼọrịa ya. 30Nʼotu oge ahụ Jisọs matara na ike esitela ya nʼahụ pụọ. Ọ tụgharịrị gburugburu nʼetiti igwe mmadụ ahụ jụọ sị, “Onye metụrụ uwe m aka?” 31Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Lee ọtụtụ igwe mmadụ gbara gị gburugburu, i sikwa aṅaa na-ajụ, ‘Onye metụrụ uwe m aka?’ ” 32Ma Jisọs gara nʼihu na-ele anya gburugburu ịhụ onye mere ya. 33Ma nwanyị ahụ, ebe ọ matara ihe mere nʼahụ ya, bịara nʼegwu nʼịma jijiji daa nʼụkwụ ya, gwa ya eziokwu niile. 34Ọ sịrị ya, “Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo nwerekwa onwe gị site nʼọrịa gị.”
Oziọma
1Ọ sitere nʼebe ahụ pụọ laghachi nʼobodo nke a mụrụ ya. Ndị na-eso ụzọ ya sooro ya gaa. 2Nʼụbọchị izuike, ọ banyere nʼụlọ ekpere bido izi ihe. Ozizi ya juru ọtụtụ ndị gere ya ntị anya. Ha kwuru sị, “Ebee ka nwoke si mụta ihe ndị a niile? Gịnịkwa bụ amamihe nke a e nyere ya? Lekwa ọrụ ebube nke a ọ rụrụ? 3Onye a ọ bụghị onye kapinta ahụ? Ọ bụghị nwa Meri, bụrụkwa nwanne Jemis, Josef, Judas na Saimọn? Ụmụnne ya ndị inyom ha esoghị anyị nọrọ nʼebe a?” Iwe were ha nʼebe ọ nọ. 4Ma Jisọs zara ha sị, “Onye amụma adịghị enwe nsọpụrụ ọbụla nʼobodo a mụrụ ya, na nʼetiti ndị ikwu ya na nʼezinaụlọ o siri pụta.” 5Ọ rụghị ọrụ ebube ọbụla nʼebe ahụ. Ihe o mere bụ naanị ibikwasị mmadụ ole na ole ahụ na-esighị ike aka nʼisi gwọọ ha. 6Enweghị okwukwe ha juru ya anya. O jegharịkwara nʼobodo nta niile gburugburu na-ezi ihe. 7Ọ kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ya, nye ha ikike zipụ ha, abụọ abụọ. O nyere ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 15 Septemba na kalenda nzukọ bụ 28 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike