Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 30 Septemba
Kalenda Ọtọdọks · 17 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 30 Septemba 2027
Tọọzdee · Izu nke 15 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Afterfeast of the Exaltation of the Cross
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
23Ma tupu okwukwe abịa, e ji iwu na-eche anyị nche. Iwu nọ ọnọdụ dị ka ụlọ mkpọrọ ebe e tinyere anyị tutu ruo mgbe a ga-eme ka okwukwe pụta ìhè. 24Ya mere, iwu bụ onye nlekọta anyị, ruo mgbe Kraịst bịara, ka a gụọ anyị na ndị ezi omume site nʼokwukwe. 25Ma ebe ọ bụ na okwukwe abịala, anyị anọkwaghị nʼokpuru onye nlekọta ọzọ. 26Unu niile bụ ụmụ Chineke site nʼokwukwe nʼime Kraịst Jisọs. 27Nʼihi na ka unu niile ha, bụ ndị e mere baptizim nʼime Kraịst, abụrụla ndị yikwasịrị onwe ha Kraịst. 28E nwekwaghị onye Juu, maọbụ onye Griik, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya; nwoke maọbụ nwanyị, nʼihi na unu niile bụ otu nʼime Kraịst Jisọs. 29Ọ bụrụ na unu bụ ndị nke Kraịst, mgbe ahụ unu bụkwa mkpụrụ Ebraham, ndị nketa dị ka nkwa ahụ si dị. 4:1Isiokwu m bụ nke a, mgbe nwa bụ onye ga-eketa ihe nna ya ka dị na nwata, ọnọdụ ya akaghị mma karịa nke ohu, ọ bụ ezie na akụ ahụ niile bụ nke ya. 2Ma ha ka nọ nʼokpuru ndị nlekọta na ndị e tinyere ya nʼaka ruo oge nna ya kwuru. 3Otu a ka ọnọdụ anyị dị, mgbe anyị bụ ụmụntakịrị. Anyị nọ dị ka ohu nʼokpuru mmụọ nke ụwa. 4Ma mgbe oge a kara aka ruru, Chineke zitere Ọkpara ya, bụ onye amụrụ site na nwanyị, onye amụrụ nʼokpuru iwu, 5ka ọ gbapụta ndị nọ nʼokpuru iwu, ime anyị ndị a ga-agụ dị ka ụmụ a họpụtara.
Oziọma
30Ndị ozi Jisọs gbara ya gburugburu kọọrọ ya ihe niile ha mere, na ihe niile ha kuziri. 31Nʼoge ahụ, nʼihi na ọtụtụ ndị mmadụ na-abịa na-apụkwa nke mere na ha enweghị ohere iri nri, ọ sịrị ha, “Soronụ m, unu niile, ka anyị ga ebe dị jụụ, zuo ike nwa oge nta.” 32Ya mere ha pụrụ baa nʼime ụgbọ mmiri gaa nʼebe ha ga-anọdụrụ naanị onwe ha. 33Ma ọtụtụ mmadụ ndị hụrụ ha mgbe ha na-apụ matara ha, sitekwara nʼobodo niile dị ebe ahụ gburugburu gbara ọsọ gbaruo ebe ahụ tupu ya na ndị na-eso ụzọ ya abịaruo. 34Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ a ka ha zukọrọ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, nʼihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. Ọ malitekwara izi ha ọtụtụ ihe. 35Nʼoge a, ọchịchịrị ebidola ịgba, nʼihi ya, ndị na-eso ụzọ ya bịara gwa ya, “Ebe a bụ ọzara, chi ejiekwala. 36Zilaga ndị a, ka ha gaa nʼobodo nta ndị dị gburugburu ebe a, zụtara onwe ha ihe ha ga-eri.” 37Ma ọ zara sị ha, “Nyenụ ha ihe ha ga-eri.” Ha sịrị ya, “Anyị ga-eje ịzụta ogbe achịcha nke narị denarị abụọ, iji nye ha ka ha rie?” 38Ma ọ jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere? Gaanụ chọpụta.” Mgbe ha chọpụtasịrị, ha sịrị, “Ogbe achịcha ise na azụ abụọ.” 39Mgbe ahụ o nyere ha iwu ka ha mee igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼotu nʼotu nʼelu ahịhịa ndụ. 40Ya mere, ha nọdụrụ ala, iri mmadụ ise nʼotu ebe, narị mmadụ nʼebe ọzọ. 41Ọ naara ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, welie anya ya elu, nye ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ. Otu aka ahụkwa ọ nyawakwara azụ abụọ ahụ nyekwa ha niile. 42Ha niile riri rijuo afọ. 43Ha tụtụkọtara iberibe achịcha na azụ tụtụjuo nkata iri na abụọ. 44Ọnụọgụgụ ndị nwoke riri ogbe achịcha ahụ dị puku mmadụ ise. 45Ngwangwa, o mere ka ndị na-eso ụzọ ya banye nʼụgbọ mmiri buru ya ụzọ gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri Betsaida, ebe ya onwe ya nọdụrụ izilaga igwe mmadụ ahụ.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 17 Septemba na kalenda nzukọ bụ 30 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike