Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 24 Septemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 24 Septemba 2027

Fraịdee · Izu nke 25 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 25 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Heg 2:1–9

1nʼụbọchị nke iri abụọ na otu, nʼọnwa nke asaa, okwu Onyenwe anyị si nʼọnụ onye amụma Hegai bịakwa na-asị: 2“Gwa Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja, na ndị Izrel ahụ fọdụrụ nʼala ahụ sị: 3‘Onye nʼime unu nwere ike icheta otu ụlọnsọ ukwu nke mbụ si dị ebube? Ọ dị aṅaa nʼanya unu ugbu a? Ọ bụ na ọ dịghị unu ka ihe efu ugbu a. 4Ma ugbu a nwee obi ike Zerubabel,’ ka Onyenwe anyị kwuru. ‘Nwekwaa obi ike gị Joshua onyeisi nchụaja, nwa Jehozadak. Nwekwaanụ obi ike unu ndị niile bi nʼala a.’ Ka Onyenwe anyị kwuru. ‘Rụọnụ ọrụ nʼihi na anọnyeere m unu,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. 5‘Nke a bụ ihe merenụ mgbe mụ na unu gbara ndụ nʼoge ahụ unu si nʼIjipt pụta. Mmụọ m na-anọgidekwa nʼetiti unu. Unu atụla egwu.’ 6“Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Ọ fọdụrụ otu ugbo, nwa oge nta gasịa, aga m ayọgharị eluigwe na ụwa, na osimiri na ala akọrọ. 7Aga m ayọgharịkwa mba niile; ihe mba niile na-achọsi ike ga-abịa. Aga m eme ka ụlọ a jupụta nʼebube,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 8‘Ọlaọcha niile na ọlaedo niile, bụ nke m.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. 9‘Ebube nke ụlọ a ga-adị ukwuu karịa ebube nke mbụ,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Ọ bụkwa nʼebe a ka m ga-enye ọganihu na udo,’ otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 43:1–4

1O Chineke, kpepụta m, kpechitere m ikpe m nʼebe mba na-amaghị Chineke nọ; gbapụta m site nʼaka ndị ajọ omume na ndị aghụghọ. 2Ị bụ Chineke, ebe m e wusiri ike. Gịnị mere i ji jụ m? Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ, nʼihi mmegbu nke onye iro? 3Zipụ ìhè gị na eziokwu gị, ka ha duo m; ka ha kpọbata m nʼugwu nsọ gị, bụ ebe i bi. 4Mgbe ahụ, aga m aga nʼebe ịchụ aja Chineke, gakwuru Chineke, bụ ọṅụ m na obi ụtọ m. Aga m eji ụbọ akwara too gị, O Chineke, bụ Chineke m.

Oziọma

Luk 9:18–22

18Otu ụbọchị mgbe ọ nọ naanị ya na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Ọ jụrụ ha sị, “Onye ka igwe mmadụ na-asị na m bụ?” 19Ha zara sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọ sị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọkwa, sị na ị bụ otu nʼime ndị amụma ochie ahụ si nʼọnwụ bilie.” 20Ma ọ jụrụ ha, “Unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?” Pita zara sị, “Ị bụ Kraịst nke Chineke.” 21Ma ọ dọrọ ha aka na ntị, nyesiekwa ha iwu ike ka ha ghara ịgwa onye ọbụla nke a, 22na-asị, “Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche. Ndị okenye na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya. Aghaghị igbu ya, ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka o site nʼọnwụ bilie.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike