Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 24 Septemba

Kalenda Ọtọdọks · 11 Septemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 24 Septemba 2027

Fraịdee · Izu nke 14 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Afterfeast of the Nativity of the Theotokos

Ụbọchị obubu ọnụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Gal 2:6–10

6Banyere ndị a na-ewe ka ndị dị ndu dị mkpa, ihe ọbụla ọnọdụ ha bụ ewetaghị mgbanwe ọbụla nʼebe m nọ, nʼihi na Chineke adịghị ele mmadụ anya nʼihu. Ndị ahụ atụkwasịghị ihe ọbụla nʼoziọma m na-ezisa. 7Ma nʼaka nke ọzọ, mgbe ha hụrụ na e nyere m ọrụ izisa oziọma nʼetiti ndị e bighị ugwu, dịka e nyere Pita izisa oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu. 8Nʼihi na Chineke onye si nʼaka Pita na-arụ ọrụ onyeozi oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu, sikwa nʼime m na-arụ ọrụ onyeozi izisara ndị mba ọzọ oziọma. 9Mgbe Jemis, Sefas na Jọn ndị a maara dị ka ide ji ụlọ nʼetiti ndị ndu ahụ niile nara m na Banabas aka nnwekọ, nabatakwa amara e nyere m. Ha gbara anyị ume, sị anyị gaa nʼihu nʼọrụ anyị, ikwusa oziọma nʼetiti ndị mba ọzọ, ka ha onwe ha kwa gaa nʼihu ịrụ ọrụ nke ha nʼetiti ndị e biri ugwu. 10Ọ bụ naanị otu ihe ka ha rịọrọ anyị, nke bụ ka anyị cheta ndị ogbenye. Nke a bụkwa ihe m na-achọsi ike ime.

Oziọma

Mak 5:22–24, 35–6:1

22Ma otu nʼime ndịisi ụlọ ekpere nke aha ya bụ Jairọs bịara, mgbe ọ hụrụ ya, ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, 23rịọsie ya arịrịọ ike sị, “Ada m nwanyị nke nta nọ nʼọnụ ọnwụ ugbu a. Biko, bịa ka ị bikwasị ya aka gị ka agwọ ya, ka ọ dịkwa ndụ.” 24Ya mere, Jisọs soro ya gawa. Oke igwe mmadụ sokwa ya na-akpagbu ya. 35Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, ụfọdụ ndị mmadụ sitere nʼụlọ onyeisi ụlọ ekpere bịara sị, “Ada gị nwanyị anwụọla, olee ihe mere i ji esogbu onye ozizi a ọzọ?” 36Ma ka ọ nụrụ ihe ha kwuru, Jisọs gwara onyeisi ụlọ ekpere ahụ sị ya, “Atụla egwu, naanị kwere.” 37O kweghị ka onye ọbụla ọzọ soro ya ma ọ bụghị Pita, na Jemis na Jọn nwanne Jemis. 38Mgbe ha bịarutere nʼụlọ onyendu ụlọ ekpere ahụ, ọ nụrụ ụzụ hụkwa ọtụtụ mmadụ ka ha nọ na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa. 39Mgbe ọ batara, ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa? Nwatakịrị a anwụghị anwụ, ọ na-arahụ ụra!” 40Ma ha chịrị ya ọchị. Mgbe ọ chụpụsịrị ha niile nʼezi, ọ kpọọrọ nne na nna nwantakịrị ahụ, na ndị ya na ha so, banye nʼime ụlọ ebe nwantakịrị ahụ dina. 41O jidere ya nʼaka sị ya, “Talita koum!” (nke pụtara, “Nwa agbọghọ nta, asị m gị bilie!”). 42Otu mgbe ahụ nwaagbọghọ nta ahụ biliri ọtọ bido ijegharị (ọ gbara afọ iri na abụọ). Nke a jụrụ ha niile anya nke ukwuu. 43Ma ọ dọsiri ha aka na ntị ike, ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe mere. Ọ sịrị ha, “Nyenụ ya nri ka o rie.” 6:1Ọ sitere nʼebe ahụ pụọ laghachi nʼobodo nke a mụrụ ya. Ndị na-eso ụzọ ya sooro ya gaa.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 11 Septemba na kalenda nzukọ bụ 24 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike