Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 23 Septemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 23 Septemba 2027
Tọọzdee · Izu nke 25 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 25 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Onye nsọ Pio nke Pietrelcina (Padre Pio), Onye ụkọchukwu · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Ozi Onyenwe anyị, nke rutere Hegai onye amụma, nke o ziri Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja. Ozi a rutere ya nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, nʼụbọchị nke mbụ nʼọnwa nke isii. 2Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Ndị a na-asị, ‘Nʼoge ahụ erubeghị mgbe anyị ga-ewu ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.’ ” 3Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịara site nʼọnụ Hegai, onye amụma na-asị, 4“Nke a ọ bụ oge unu onwe unu ji ebi nʼụlọ unu e ji osisi machie, mgbe ụlọnsọ ukwu a nọgidere na-adakpọsị?” 5Ugbu a, ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Lezienụ ụzọ unu anya. 6Unu na-agha mkpụrụ, ma na-enweta naanị ihe ntakịrị. Unu na-eri nri, ma ihe unu na-eri adịghị ezuru unu. Unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma unu adịghị aṅụju afọ ka o si mmasị unu. Unu na-eyikwasị onwe unu uwe, ma ọ dịghị achụ unu oyi. Unu na-anata ụgwọ ọrụ, maọbụ nʼakpa puru epu ka unu na-etinye ya.” 7Ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Chezienụ echiche banyere ndụ unu. 8Jeenụ nʼelu ugwu, wedata osisi, jiri ya wuo ụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe ahụ, obi ga-atọ m ụtọ na ya, a ga-asọpụkwara m nʼebe ahụ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru.
Abụ Ọma nzaghachi
1Toonu Onyenwe anyị! Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ. Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya. 2Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha; ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze ha. 3Ka ha jiri ite egwu too aha ya ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu. 4Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ Onyenwe anyị ụtọ. Ọ na-eji nzọpụta kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze. 5Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a, bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha. 6Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha, ka mma agha ihu abụọ dịrịkwa nʼaka ha, 9imezu ihe ahụ e kpebiri, depụtakwa megide ha. Nke a bụ nsọpụrụ dịrị ndị nsọ ya. Toonu Onyenwe anyị.
Oziọma
7Mgbe Herọd onye ọchịchị nụrụ akụkọ banyere ihe niile merenụ, ọ gbagwojuru ya anya nʼihi na ụfọdụ mmadụ na-asị, na Jọn omee baptizim esitela na ndị nwụrụ anwụ bilie. 8Ndị ọzọ na-asị na Ịlaịja apụtala, ebe ndị ọzọ na-asị na otu nʼime ndị amụma ochie apụtakwala ndụ ọzọ. 9Ma Herọd sịrị, “Mụ onwe bipụrụ isi Jọn. Onye bụkwa onye a nke m na-anụ ihe banyere ya?” Ọ gụrụ ya agụụ ịhụ ya.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Pio nke Pietrelcina (Padre Pio), Onye ụkọchukwu
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike