Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 25 Septemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 25 Septemba 2027

Satọdee · Izu nke 25 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 25 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Zek 2:1–5, 10–11

1Mgbe m weliri anya m, ahụrụ m otu nwoke ji eriri ihe ọtụtụ nʼaka ya. 2Ajụrụ m, “Ebee ka ị na-aga?” Ọ sịrị m, “Ana m aga ịtụ Jerusalem, ịchọta ịdị ogologo ya, na ịdị obosara ya.” 3Mgbe mmụọ ozi na-ekwuru m okwu na-apụ, mmụọ ozi ọzọ bịara izute ya, 4ọ sịrị ya, “Gbaa ọsọ, gwa nwa okorobịa ahụ, sị, ‘Obodo na-enweghị mgbidi ka Jerusalem ga-abụ, nʼihi ọtụtụ igwe mmadụ na anụmanụ ga-ejupụta nʼime ya. 5Ma mụ onwe m ga-abụrụ ya mgbidi ọkụ nke ga-agba ya gburugburu.’ Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘Aga m aghọ ebube nʼetiti ya.’ 10“Tie mkpu ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị Ada Zayọn. Nʼihi na ana m abịa ibi nʼetiti gị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 11“Nʼụbọchị ahụ, ọtụtụ mba dị iche iche ga-adịnyere Onyenwe anyị, bụrụkwa ndị nke m. Aga m ebi nʼetiti gị, ị ga-amatakwa na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ka m bịakwute gị.

Abụ Ọma nzaghachi

Jer 31:10–13

10“Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu mba niile; kwusaanụ ya nʼebe dị anya nke ala ahụ dị nʼakụkụ osimiri niile. Onye ahụ chụsara Izrel ga-achịkọtakwa ha. Ọ ga-elekọtakwa igwe ewu na atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. 11Nʼihi na Onyenwe anyị ga-agbapụta Jekọb, ọ ga-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ka ha ike. 12Ha ga-abịa nọọ nʼugwu Zayọn tie mkpu ọṅụ, ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị ukwu nke ezi ihe Onyenwe anyị nyere ha, dịka ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ, na ụmụ igwe ewu na atụrụ, na ọtụtụ ehi. Ha ga-adị ka ubi a na-agba mmiri mgbe niile; ha agaghị erukwa ụjụ ọzọ. 13Mgbe ahụ, obi ga-atọ ụmụ agbọghọ ụtọ, ha ga-etekwa egwu ọṅụ, ụmụ okorobịa na ndị agadi ga-aṅụrịkwa ọṅụ. Aga m eme ka iru ụjụ ha ghọọrọ ha obi ụtọ, aga m enyekwa ha nkasiobi na ọṅụ nʼọnọdụ mwute.

Oziọma

Luk 9:43–45

43Ebube ukwu nke Chineke tụrụ ha nʼanya. Ma mgbe onye ọbụla nọ na mgbagwoju anya nʼihi ọrụ ọ rụrụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, 44“Geenụ ntị nke ọma banyere ihe m chọrọ ịgwa unu. A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ụmụ mmadụ.” 45Ma ha aghọtaghị okwu a. E zonarịrị ya nʼebe ha nọ ka ha ghara ịghọta ya. Egwu tụkwara ha ịjụ ya ihe ọ pụtara.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike