Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 20 Septemba

Kalenda Ọtọdọks · 7 Septemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 20 Septemba 2027

Mọnde · Izu nke 14 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Forefeast of the Nativity of the Theotokos

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

2Kọ 12:10–19

10Ọ bụ nʼihi Kraịst ka m na-anọgide nʼadịghị ike m niile, mkparị ndị mmadụ, ihe isi ike niile, mkpagbu niile na ihe ndakwasị dị iche iche. Nʼihi na mgbe m na-adịghị ike ka m na-enwe ike karịa. 11Emeela m onwe m onye nzuzu ma unu onwe unu rugidere m ime ya. O kwesiri ka unu bụrụ ndị mbụ ga-eto m. Ọ bụ ezie a na-abụghị m ihe ọbụla, ma o were m anya na ọ dịghị ụzọ ọbụla m si dị ala nʼebe ndị ahụ unu na-eche na ha kachasị elu nʼetiti ndị ozi. 12Ejiri m ndidi rụọ ọrụ nʼetiti unu, ihe iji gosi na abụ m nwaazụ nʼeziokwu. Egosiri m unu ihe ịrịbama, ọrụ ebube dị iche iche, na ọtụtụ oke ọrụ. 13Olee ụzọ unu si dị ala nʼebe chọọchị ndị ọzọ dị, ma ọ bụghị na m abụghị ibu arọ nye unu? Gbagharanụ m mmejọ a. 14Nke a bụ ugboro atọ m na-ejikere ịbịakwute unu. Agaghị m abụrụ unu ibu arọ, ihe dị m mkpa abụghị akụ unu nwere, kama unu onwe unu. Ọ bụghị ụmụntakịrị ka ọ dịrị ịkpadoro nne na nna ha ihe, kama ọ bụ ọrụ dịrị nne na nna ịkpadoro ụmụ ha ihe. 15Nʼezie, ọ na-atọ m ụtọ iwere onwe m na ihe niile m nwere nye unu, nʼihi na ahụrụ m unu nʼanya. Ma ọ bụrụ na m hụrụ unu nʼanya karịa, ọ ga-adị mma ma unu hụ m nʼanya nke nta? 16Nʼagbanyeghị na-abụrụ m unu ibu arọ, ụfọdụ nʼime unu na-ekwu, ọ bụ ezie na ọ dịghị anara anyị ihe ọbụla, maọbụ onye aghụghọ. Ma eleghị anya, o nwere ụzọ aghụghọ dị iche iche o si anara anyị ihe. 17Ọ dị onye ọbụla m ziteere unu, iji si nʼaka ya rigbuo unu? 18Arịọrọ m Taịtọs ka ọ bịakwute unu, ya na nwanna anyị nwoke ọzọ. Taịtọs o rigburu unu? O nwere ihe dị iche nʼuche na omume mụ na ya? 19Unu chere na ihe anyị na-eme oge niile ndị a bụ ịgọpụ onwe anyị nʼihu unu? Ọ bụ nʼihu Chineke ka anyị na-ekwu nke a nʼime Kraịst. Ndị m hụrụ nʼanya, ihe ndị a anyị na-ekwu bụ maka ọdịmma unu.

Akwụkwọ ozi (maka Tiuzdee)

2Kọ 12:20–13:2

20Nʼihi na ihe na-atụ m egwu bụ na mgbe m bịara nʼetiti unu, ihe m ga-ahụ agaghị atọ m ụtọ. Mgbe ahụ mmeso m ga-emeso unu agakwaghị atọ unu atọ. Nʼihi na ana m atụ egwu na mgbe m bịakwutere unu ọzọ, aga m ahụ ọtụtụ nʼime unu ka unu na-ese okwu, aga m ahụ ka unu na-ekwosa ibe unu ekworo, aga m ahụ unu ka unu na-akpasu ibe unu iwe. Aga m ahụ ọtụtụ ndị na-afụli onwe ha elu, ndị na-ekwu ọtụtụ ihe ọjọọ dị iche iche megide ndị ọzọ; aga m ahụ ọtụtụ ndị jupụtara nʼaghụghọ na ịkpa iche iche. 21Ana m atụ egwu na mgbe m ga-abịakwute unu ọzọ, Chineke m ga-eme ka m weda onwe m ala nʼihu unu, mee ka m kwa akwa nʼihi ụfọdụ nʼime unu ndị mehiere na mbụ, ma ha achọghị ichegharị site nʼihe ọjọọ ha mere, na nʼihi ọtụtụ nʼime unu na-adị ndụ rere ure, ndụ na-adịghị ọcha, ndụ ịkwa iko, na ndụ ọjọọ. 13:1Nke a ga-eme ya ugboro atọ m na-abịa ileta unu. Ọ bụ site nʼama mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara ka a ga-eme ka okwu niile guzoro. 2Mgbe m bịara leta unu nke ugboro abụọ, abaara m ndị niile dara iwu nʼoge gara aga na mmadụ ndị ọzọ mba, dọọkwa ha aka na ntị, ihu na ihu. Ugbu a m na-anọghị ya, ana m adọkwa ha aka na ntị ọzọ, ọ bụrụ na m bịa ọzọ hụ na ndị mehiere na mbụ echegharịghị, aga m emesi ha ike.

Oziọma

Mak 4:10–23

10Ma mgbe ọ nọ naanị ya, ndị ozi iri na abụọ ahụ na ndị ọzọ nọ ya gburugburu jụrụ ya ajụjụ banyere ilu ahụ. 11Ọ gwara ha sị, “Enyela unu ihe omimi nke alaeze Chineke. Ma ndị nọ nʼezi, a na-agwa ha ihe niile nʼilu, 12nke mere na, “ ‘Ha ga na-ele anya, hụkwa, ma ha agaghị ahụ ihe ọbụla, ha ga na-anụ, nụkwa, ma ha agaghị aghọta ihe ọbụla, ma ọ bụghị ya, ha nwere ike chigharịa bụrụ ndị a gbaghaara.’ ” 13Mgbe ahụ, ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ na unu aghọtaghị ilu a? Unu ga-esikwa aṅaa ghọta ilu ndị ọzọ? 14Ọgha mkpụrụ ahụ na-agha okwu Chineke. 15Mmadụ ụfọdụ dị ka mkpụrụ ndị ahụ dara nʼakụkụ ụzọ, ebe a kụrụ okwu ahụ. Ngwangwa ha nụrụ ya, ekwensu na-abịa napụ ha okwu ahụ nke a kụrụ nʼime ha. 16Ndị ọzọ dị ka mkpụrụ a kụrụ nʼala nkume. Ha nụrụ okwu ahụ, were ọṅụ nabata ya nʼotu mgbe ahụ. 17Ma ebe ha na-enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha, ha na-anọ nwa oge nta. Mgbe nsogbu maọbụ mkpagbu bịara nʼihi okwu ahụ, ngwangwa ha na-adachapụ. 18Ndị nke ọzọkwa, dị ka mkpụrụ dara nʼetiti ogwu, nụrụ okwu ahụ; 19ma nchekasị nke ndụ a, na nghọgbu nke akụnụba, na oke ọchịchọ, nakwa ihe ndị ọzọ na-abata, kpagbuo okwu ahụ, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ. 20Ndị ọzọ, dị ka mkpụrụ a kụrụ nʼezi ala, nụrụ okwu ahụ, nabata ya ma mịa mkpụrụ dị iri atọ, iri isii, maọbụ otu narị.” 21Ọ sịrị ha, “A na-ebute oriọna ka e jiri efere kpuchie ya maọbụ dọnye ya nʼokpuru akwa ndina? Ọ bụghị ka a dọba ya nʼelu ihe ịdọba iheọkụ? 22Nʼihi na ihe niile e zoro ezo ga-apụta ihe ma ihe niile e kpuchiri ekpuchi ka a ga-emesịa kpughee. 23Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”

Oziọma (maka Tiuzdee)

Mak 4:24–34

24Ọ sịrị ha, “Kpacharanụ anya ihe unu na-anụ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu, maọbụ karịa. 25Onye nwere ihe ka a ga-enye karịa; onye na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere ka a ga-anapụ ya.” 26Ọ sịkwara, “Alaeze Chineke yiri ihe dị otu a. Ọ dịka mgbe otu onye ghara mkpụrụ nʼala ubi. 27Ehihie na abalị, ma ọ nọ nʼụra ma o tetara, mkpụrụ ahụ na-epupụte na-etokwa, ma ọ maghị ka o si na-eme. 28Ala ahụ nʼonwe ya na-eme ka mkpụrụ ahụ puo. Ọ na-epupụte na mbụ, too oko, emesịa isi ọka, nʼikpeazụ ọ mịkwara mkpụrụ kara aka nʼoko ya. 29Mgbe ọka ahụ chara ịghọ ya, o na-eji mma iwe ihe ubi ya bịa gbutuo ọka ahụ, ghọrọkwa ogbe ọka laa, nʼihi na oge iwe ihe nʼubi eruola.” 30Ọzọkwa, ọ sịrị, “Gịnị ọzọ ka anyị pụrụ ịsị na alaeze Chineke yiri? Ụdị ilu dị aṅaa ka anyị ga-eji kọwaa ya? 31Ọ dị ka mkpụrụ mọstaadị, nke bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta nke a na-akụ nʼala. 32Ma mgbe a kụrụ ya, ọ na-eto bukarịa ihe niile a kụrụ nʼubi, ọ na-enwe alaka dị ukwuu nke bụ na ụmụ anụ ufe nke eluigwe na-ezukwa ike nʼokpuru ya.” 33O jiri ọtụtụ ilu yiri ndị a gwa ha okwu dị ka ha pụrụ ịghọta. 34O nweghị oge ọbụla ọ gwara ha okwu hapụ iji ilu. Ma ya na ndị na-eso ụzọ ya naanị nọdụ, ọ na-akọwara ha ihe niile.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 7 Septemba na kalenda nzukọ bụ 20 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike