Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 20 Septemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 20 Septemba 2027

Mọnde · Izu nke 25 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Mọnde nke izu nke 25 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: uhie

Ndị nsọ Andru Kim Tae-gon, Onye ụkọchukwu, na Pọl Chong Ha-sang, na ndị otu ha, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ezr 1:1–6

1Nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs, eze Peshịa, ime ka okwu Onyenwe anyị nke sitere nʼọnụ Jeremaya mezuo, Onyenwe anyị kpaliri mmụọ Sairọs, eze Peshịa ka o mee mkpọsa nʼalaeze ya niile, ma denyekwa ya nʼakwụkwọ iwu, sị, 2“Otu a ka Sairọs, eze Peshịa kwuru, “ ‘Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe, e nyela m alaeze niile nke dị nʼụwa, o nyekwala m ọrụ iwuru ya ụlọnsọ na Jerusalem, nke dị na Juda. 3Ya mere, onye ya ọbụla nʼetiti ndị ya nwere ike ịga Jerusalem nke dị na Juda, gaa wuo ụlọnsọ Onyenwe anyị, Chineke Izrel, bụ Chineke nọ na Jerusalem. Ka Chineke ha nọnyekwara ha. 4Ma nʼobodo ọbụla ebe ndị fọdụrụ ndụ bi, ka ndị nọ nʼebe ahụ nye ha onyinye ọlaọcha na ọlaedo, na akụ na anụ ụlọ nʼụzọ enyemaka, tinyere onyinye afọ ofufu maka ụlọnsọ ukwu Chineke nke dị na Jerusalem.’ ” 5Mgbe ahụ, Chineke tinyere ọchịchọ ịlaghachi Jerusalem nʼobi ndịisi ezinaụlọ Juda na Benjamin na ndị nchụaja, na ndị Livayị. Ha kwadokwara ịlaghachi maka ịrụ ọrụ ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ na-atụfughị oge. 6Ndị Juu bi na gburugburu Peshịa nyere ndị nke na-alaghachi Jerusalem onyinye ihe ọlaọcha na ọlaedo, na anụ ụlọ na ihe ndị ọzọ, na onyinye dị oke ọnụahịa dị iche iche, tinyere onyinye afọ ofufu ha.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 126:1–6

1Abụ nrigo. Mgbe Onyenwe anyị kpọghachitere ndị e mere ka ha lọta na Zayọn, anyị dị ka ndị na-arọ nrọ. 2Ọchị juru anyị ọnụ, abụ ọṅụ jukwara anyị ire. Mgbe ahụ, e kwukwara ya na mba niile sị, “ Onyenwe anyị emeerela ha ọtụtụ ihe dị ukwuu.” 3Onyenwe anyị emeerala anyị ọtụtụ ihe dị ukwuu, obi anyị jupụtakwara nʼọṅụ. 4Nyeghachi anyị akụnụba anyị, o Onyenwe anyị, dịka mmiri iyi na-asọ nʼala Negev. 5Ndị niile na-eji anya mmiri na-arụ ọrụ ịkụ mkpụrụ ga-emesịa jiri abụ ọṅụ wee ihe ubi ahụ. 6Onye ji ịkwa akwa buru mkpụrụ ubi ọ ga-agha na-aga, ga-emesịa jiri abụ ọṅụ na-alọghachi azụ, mgbe ha bu ukwu ọka ha.

Oziọma

Luk 8:16–18

16“Ọ dịghị onye ọbụla, nke na-amụnye oriọna zoo ya nʼime igbe maọbụ dọnye ya nʼokpuru ihe ndina. Kama, ọ na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba ọkụ ka ndị ọbụla na-abata nʼụlọ ahụ jiri ya hụ ụzọ. 17Ọ dịghị ihe ọbụla zoro ezo nke na-agaghị emesịa pụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe ọbụla dị nzuzo nke a na-aghaghị eme ka ọ pụta ìhè. 18Ya mere, kpacharanụ anya otu unu si ege ntị. Nʼihi na ọ bụ onye ahụ nwere ihe ka a ga-enye karịa, ma onye ahụ na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere, ka a ga-anapụ ya.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike