Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 19 Septemba
Kalenda Ọtọdọks · 6 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 19 Septemba 2027
Sọnde · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 13 mgbe Pentikọọsụ gasịrị
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 2
1Mgbe ụbọchị izuike gafere, Meri Magdalin na Meri nne Jemis na Salomi zụtara ụda dị iche iche ha ga-eji tee ahụ ya mmanụ. 2Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu, mgbe anyanwụ wara, ha biliri gawa nʼili ahụ. 3Ha jụrịtara onwe ha na-asị, “Onye ga-enupuru anyị nkume ahụ dị nʼọnụ ụzọ ili ahụ?” 4Ma mgbe ha leliri anya, ha hụrụ na e nupụla nkume ukwu ahụ. 5Mgbe ha banyere nʼime ili ahụ, ha hụrụ otu nwokorobịa yi uwe ọcha ka ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ aka nri nke ili ahụ. Ha tụrụ oke egwu. 6Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Unu na-achọ Jisọs onye Nazaret a kpọgidere nʼobe. E meela ka o site nʼọnwụ bilie! Ọ nọkwaghị nʼebe a. Lee ebe e nibere ya. 7Ma gaanụ gwa ndị na-eso ụzọ ya nakwa Pita, ‘O burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya dị ka ọ gwararịị unu.’ ” 8Ha gbapụtara site nʼili ahụ, nʼọnọdụ mgbagwoju anya na ahụ ịma jijiji. Ha akọrọghị onye ọbụla ihe ọbụla, nʼihi na egwu jupụtara ha obi.
Akwụkwọ ozi
13Na-echenụ nche mgbe niile, guzosienụ ike nʼime okwukwe unu. Dịrịnụ ka ndị tozuru dimkpa, ndị dị ike. 14Werenụ ịhụnanya na-arụ ọrụ ọbụla unu na-arụ. 15Ugbu a, arịọ m unu ụmụnna m, unu maara na ezinaụlọ Stefanas bụ ndị mbụ kwere ekwe nʼala Akaịa. Ha nyekwara onwe ha maka ijere ndị nsọ ozi. 16Ana m arịọ unu ka unu na-asọpụrụ ndị dị otu a, nakwa onye ọbụla bụ onye otu anyị na onye ọrụ anyị. 17Obi tọrọ m ụtọ nʼọbịbịa nke Stefanas na Fọtunetus na Akaikọs. Ha emelara m ihe unu gaara emere m, ma a sị na unu nọ nʼebe a. 18Ha kwalitere mmụọ m dịka ha kwalitere nke unu. Nyenụ ndị dị otu a nsọpụrụ. 19Ụlọ chọọchị niile dị nʼokpuru Eshịa na-ezitere unu ozi ekele. Akwila na Prisila, na nzukọ dị nʼụlọ ha na-enye unu ekele obiọma nʼime Onyenwe anyị. 20Ụmụnna niile nọ nʼebe a na-ekele unu. Werenụ isurita ọnụ dị nsọ kelerịta onwe unu. 21Ọ bụ mụ onwe m bụ Pọl ji aka m na-ede ekele nke a. 22Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụghị Onyenwe anyị nʼanya, ka ọ bụrụ onye a bụrụ ọnụ. Onyenwe anyị bịa! 23Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu. 24Ka ịhụnanya m dịnyere unu niile site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. Amen.
Oziọma
33“Ugbu a geekwanụ ntị nʼilu ọzọ. Otu onye dị nke nwere ala ubi. Ọ kụrụ osisi vaịnị nʼubi a. Ọ gbakwara ubi ya ogige, gwuokwa ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼime ya. O wukwara ụlọ elu nʼime ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o weere ubi ahụ tinye nʼaka ndị ga-elekọtara ya ubi ahụ, pụọ gaa nʼala ọzọ. 34Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zipụrụ ndị odibo ya ka ha jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata mkpụrụ nke ruuru ya site nʼubi ahụ. 35“Ma ndị na-elekọta ubi ahụ jidere ndị odibo ya ahụ tie otu onye nʼime ha ihe, gbukwaa onye ọzọ nʼime ha. Ha tụkwara otu nʼime ha nkume. 36Emesịa, o zigakwara ọtụtụ ndị odibo karịrị ndị nke mbụ nʼọnụọgụgụ. Ma ndị na-elekọta ubi ahụ mekwara ndị a ihe ha mere ndị nke mbụ. 37Nʼikpeazụ o zigara ọkpara ya, sị, ‘Ha ga-asọpụrụ nwa m.’ 38“Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ọkpara ya, ha gbara izu nʼetiti onwe ha sị, ‘Lee! Onye a bụ onye nketa ihe niile. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ma nwetakwa ihe nketa ya.’ 39Ya mere, ha jidere ya nʼike, kpụrụ ya gafee nʼazụ ubi vaịnị ahụ, gbuo ya nʼebe ahụ. 40“Mgbe onye nwe ubi vaịnị ahụ lọtara, gịnị ka unu chere na ọ ga-eme ndị ahụ o tinyere ilekọtara ya ubi ya?” 41Ha zara ya sị, “Ọ ga-egbu ndị ajọ omume ahụ, laa ha nʼiyi nʼụzọ dị njọ. Ọ ga-ewerekwa ubi vaịnị ya tinye nʼaka ndị nlekọta ọzọ, ndị ga-enyekwa ya mkpụrụ ubi ruuru ya nʼoge ya.” 42Jisọs sịrị ha, “Ọ ga-abụ na unu agụtabeghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, abụrụla nkume isi ntọala ụlọ. Nke a bụ ọrụ nke Onyenwe anyị rụrụ, ọ bụkwa ọrụ ịtụnanya nʼanya anyị.’
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 6 Septemba na kalenda nzukọ bụ 19 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike