Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 17 Ọgọọst

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 17 Ọgọọst 2027

Tiuzdee · Izu nke 20 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 20 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Nkp 6:11–24

11Mmụọ ozi Onyenwe anyị bịara nọdụ ọdụ nʼokpuru osisi ukwu ook dị nʼOfra, nʼala ubi Joash, onye obodo Abieza, ebe nwa ya a na-akpọ Gidiọn nọ na-azọcha mkpụrụ ọka wiiti nʼime ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼihi na ọ na-ezo onwe ya ka ndị Midia hapụ ịhụ ya anya. 12Mmụọ ozi Onyenwe anyị pụtara ihe nʼebe ahụ gwa ya okwu sị, “Gị dike na dimkpa nʼagha, Onyenwe anyị nọnyeere gị.” 13Gidiọn zara sị, “Biko onyenwe m, ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị nọnyeere anyị, gịnị mere ihe ndị a niile ji na-adakwasị anyị? Ebeekwanụ ka ihe ịrịbama ahụ niile dị nke nna anyị ha gwara anyị sị, ‘Ọ bụghị site nʼIjipt ka Onyenwe anyị siri gbapụta anyị?’ Ma ugbu a, Onyenwe anyị ajụla anyị, hapụ anyị nʼaka ndị Midia ka ha laa anyị nʼiyi.” 14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere ya iwu sị ya, “Ngwa, jiri ike gị dị ukwuu pụọ, gaa ka ị gbapụta ụmụ Izrel site nʼaka ndị Midia. Mụ onwe m na-ezigakwa gị.” 15Ma Gidiọn sịrị ya, “Biko, Onyenwe m, olee otu m ga-esi zọpụta Izrel? Lee, esi m nʼikwu dịkarịsịrị nta nʼime Manase pụta. Mụ onwe m bụkwa onye dịkarịsịrị ala nʼezinaụlọ m.” 16Ma Onyenwe anyị zara sị ya, “Mụ onwe m ga-anọnyere gị. Ị ga-ebibikwa ndị Midia niile.” 17Gidiọn zaghachiri sị, “Ọ bụrụ na m achọtala ihuọma nʼanya gị, nye m ihe ịrịbama nke ga-egosi na ọ bụ gị nʼezie na-agwa m okwu. 18Biko esikwala ebe a pụọ ruo mgbe m lọghachiri weta onyinye m ga-eche nʼihu gị.” Onyenwe anyị zara sị ya, “Aga m eche ruo mgbe ị lọghachiri.” 19Gidiọn mere ngwangwa laa nʼụlọ ya, gbuo otu nwa ewu, sie ya. O jikwa ụtụ ọka mee achịcha, nke ihe na-eko achịcha na-adịghị nʼime ya. Emesịa, o tinyere anụ ahụ nʼime nkata, wụnyekwa ofe nʼime ite, buru ha jekwuru Mmụọ ozi ahụ, ebe ọ nọ na-eche ya nʼokpuru osisi ook ahụ. 20Mmụọ ozi nke Chineke sịrị ya, “Were anụ a na ogbe achịcha ahụ na-ekoghị eko, tụkwasị ha nʼelu nkume a, wụpụkwa ofe ahụ.” Gidiọn mere otu a. 21Mgbe Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ metụrụ ọnụ mkpanaka ahụ nke dị nʼaka ya nʼelu anụ na achịcha ahụ na-ekoghị eko. Ọkụ sitere nʼoke nkume ahụ nwuru, rechapụ anụ ahụ na achịcha nʼekoghị eko ahụ. Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị ahụ gbara barịị site nʼihu ya. 22Mgbe Gidiọn ghọtara na ọ bụ Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị, o tiri mkpu akwa sị, “Ewoo! Onyenwe m Onyenwe anyị! Ahụla m Mmụọ ozi Onyenwe anyị ihu na ihu!” 23Ma Onyenwe anyị sịrị ya, “Udo dịrị gị, atụla egwu! Ị gaghị anwụ.” 24Ya mere, Gidiọn wuuru Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, kpọọ ya, Onyenwe anyị bụ Onye Udo. Ụlọ nchụaja ahụ dịkwa nʼime obodo Ofra nʼala ndị Abieza ruo taa.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 85:8, 10–13

8Aga m ege ntị mara ihe Chineke, onye bụ Onyenwe anyị ga-ekwu; ọ na-ekwe ndị ya, ndị nsọ ya nkwa udo, ma ka ha ghara ịlọghachi na nzuzu. 10Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala; ezi omume na udo esutula ọnụ. 11Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta, ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya. 12Nʼezie, Onyenwe anyị ga-enye ihe dị mma, ala anyị ga-amịkwa mkpụrụ ubi ya. 13Ezi omume ga-aga nʼihu ya, idoziri ya ụzọ ọ ga-esi gaa.

Oziọma

Mat 19:23–30

23Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nʼezie agwa m unu, ọ bụ nnọọ ihe siri ike na onye ọgaranya ga-abanye nʼalaeze eluigwe. 24Ọzọkwa, asị m unu, ọ dịịrị ịnyịnya kamel mfe ịgafe nʼanya agịga, karịa ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.” 25Okwu a o kwuru tụrụ ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Ha sịrị, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, onye kwanụ ka a ga-azọpụta?” 26Jisọs legidere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ nke a bụ ihe a na-apụghị ime, ma ọ dịghị ihe rara ahụ ime nʼebe Chineke nọ.” 27Mgbe ahụ Pita jụrụ ya sị, “Lee, anyị ahapụla ihe niile soro gị, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ anyị?” 28Jisọs zara sị ya, “Nʼezie agwa m unu, mgbe a ga-agbanwe ihe niile, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-anọkwasị nʼelu ocheeze ebube ya, nʼalaeze ahụ, nʼezie, unu bụ ndị na-eso ụzọ m ga-anọkwasị nʼocheeze iri na abụọ ahụ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe. 29Onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, na ụmụnne ya nwoke, na ụmụnne ya nwanyị, na nne ya na nna ya, na ụmụntakịrị ya, maọbụ ala o nwere, soro m, ga-anata dị ka ụgwọ ọrụ okpukpu narị ihe ọ hapụrụ, natakwa alaeze. Ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi. 30Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ma ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị bu ụzọ.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike