Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 16 Ọgọọst

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 16 Ọgọọst 2027

Mọnde · Izu nke 20 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Mọnde nke izu nke 20 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Stivin nke Họngari · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Nkp 2:11–19

11Mgbe ahụ, ndị Izrel mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị site nʼife Baal ofufe. 12Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, bụ Chineke ahụ, nna ha fere ofufe, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt. Ma ha malitere ife na ịsọpụrụ, na ịkpọ isiala nye ọtụtụ chi dị iche iche, bụ chi nke ndị bi ha gburugburu. Ha si otu a kpasuo Onyenwe anyị iwe. 13Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, fee chi Baal na Ashtọret ofufe. 14Ya mere, Onyenwe anyị were iwe megide Izrel, rara ha nye nʼaka ndị ji aka ike pụnara ha ihe ha nwere. O weere ha resi ndị iro ha gbara ha gburugburu, bụ ndị ha enwekwaghị ike iguzogide. 15Dịka ọ ṅụrụ ya nʼiyi nye ha, mgbe ọbụla ụmụ Izrel pụrụ ibu agha, aka Onyenwe anyị megidere ha ime ka ha bụrụ ndị e meriri emeri. Ọnọdụ ha jọrọ njọ nke ukwuu. 16Nʼihi ọnọdụ ọjọọ a, Onyenwe anyị mere ka ndị ikpe sị nʼetiti ha pụta, ịnapụta ha site nʼaka ndị a ji ike na-apụnara ha ihe ha nwere. 17Ma ụmụ Izrel egeghị ndị ikpe ahụ ntị, kama ha nọgidere na-akpọ isiala nye ma na-agbasokwa chi ndị ọzọ. Dịka nna nna ha na-emeghị, ha mere ngwangwa wezuga onwe ha site nʼụzọ Onyenwe anyị, bụrụ ndị na-enupu isi nʼebe iwu Onyenwe anyị dị. 18Ma mgbe ọbụla Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel onye ikpe, ọ na-anọnyere onye ikpe ahụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya. Ọ na-esitekwa nʼaka onye ikpe a napụta ụmụ Izrel nʼaka ndị iro ha nʼihi na Onyenwe anyị nwere obi ebere nʼahụ ụmụ Izrel, mgbe ha na-asụ ude, nʼihi mmegbu na mkpagbu niile ndị iro ha na-emegbu ha, ma na-akpagbukwa ha. 19Ma mgbe ọbụla onye ikpe a nwụrụ, ụmụ Izrel na-alaghachi azụ biwe ndụ ọjọọ karịa nke nna nna ha ochie. Ha na-agbaso chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala nye ha, na ife ha ofufe. Ha jụrụ iwezuga agwa ọjọọ ha ndị a ma ọ bụkwa ụzụ isiike ha.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 106:34–37, 39–40, 43–44

34Ha egbuchapụghị mba niile bi nʼala ahụ dịka Onyenwe anyị dọrọ ha aka na ntị ka ha mee. 35Kama ha gwakọtara onwe ha na mba niile nke ala ahụ, site otu a, mụta ime ka ha na-eme. 36Ha fere arụsị ha ofufe, nke ghọrọ ihe ịma nʼọnya nye ha. 37Ha gara nʼihu were ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom chụọrọ chi na-abụghị chi aja. 39Ha sitere nʼihe ha na-eme merụọ onwe ha; site nʼaka ọrụ ha, maka uru ha nyefere onwe ha nʼaka ndị na-emerụ ha. 40Nʼihi nke a, iwe were Onyenwe anyị megide ndị ya; ọ gụkwara ihe nketa ya dịka ihe rụrụ arụ. 43Ọtụtụ oge, ọ napụtara ha, ma ha nọgidesịrị ike nʼinupu isi site na ndụmọdụ ya, bụrụ ndị lara nʼiyi nʼime mmehie ha. 44Ma mgbe ọ nụrụ mkpu akwa ha, ọnọdụ mkpagbu ha metụtara ya;

Oziọma

Mat 19:16–22

16Otu onye bịakwutere ya, jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, olee ezi ihe m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?” 17Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji ajụ m ajụjụ banyere ihe bụ ezi ihe? Ọ dị naanị otu onye nke bụ ezi mmadụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịba nʼime ndụ ahụ, debe iwu niile e nyere.” 18Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee iwu ndị m ga-edebe?” Jisọs zara ya, “ ‘Egbula mmadụ, akwala iko, ezula ohi, ekwula okwu ụgha. 19Sọpụrụ nne gị na nna gị. Ọzọ, hụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’ ” 20Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Edebezuchaala m iwu ndị a siterịị na mgbe m dị na nwata. Gịnị ọzọ fọdụụrụ m ime?” 21Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye zuruoke nʼezie, laa nʼụlọ gị ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, mgbe ahụ, bịakwa soro m.” 22Mgbe nwokorobịa ahụ nụrụ okwu a, ọ lara na mwute, nʼihi na ọ bụ ọgaranya.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike