Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 16 Ọgọọst
Kalenda Ọtọdọks · 3 Ọgọst (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 16 Ọgọọst 2027
Mọnde · Izu nke 9 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Venerable Isaac, Dalmatius and Faustus, Ascetics of the Dalmatian Monastery in Constantinople (4th-5th C)
Obubu ọnụ Ndaba ụra
Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
31Ọ bụrụ na anyị enyochaa onwe anyị nke ọma, anyị agaghị adaba nʼikpe. 32Ma otu ọ dị, mgbe Onyenwe anyị na-ama anyị ikpe nʼụzọ dị otu a, a na-ezi anyị otu e si ebi ezi ndụ nʼihi ka a ghara ịmakọ anyị na ndị ụwa ikpe. 33Ya mere, ụmụnna m, mgbe unu bịakọtara iri nri, cherenụ ibe unu. 34Ọ bụrụ na agụụ agụọ onye ọbụla ya rie nri nʼụlọ ya, ka ọ hapụ iwetara unu ikpe ọmụma. Aga m enye ntụziaka banyere ihe niile ndị ọzọ mgbe m bịara. 12:1Ugbu a ụmụnna m, achọrọ m ka unu mata ihe gbasara onyinye nke Mmụọ Nsọ na-enye. 2Unu matara na mgbe unu bụ ndị na-amaghị Chineke, e duru unu nʼotu ụzọ maọbụ nke ọzọ, duhie unu ụzọ iso arụsị ndị ahụ dara ogbi. 3Ya mere, achọrọ m ka unu ghọta nke ọma na ọ dịghị onye ọbụla na-ekwu okwu site nʼodudu Mmụọ nke Chineke, pụrụ ị sị, “Ka Jisọs bụrụ onye a bụrụ ọnụ.” Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ ikwu, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” ma ọ bụghị site na Mmụọ Nsọ. 4Onyinye amara dị iche iche dị, ma otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye ha niile. 5E nwekwara ụdị ije ozi dị iche iche, maọbụ otu Onyenwe anyị ahụ ka a na-ejere ozi. 6Ụdị ike dị iche iche nke eji arụ ọrụ dịkwa, ma otu Chineke ahụ na-etinye ike ndị a nʼime onye ọbụla iji jee ozi.
Oziọma
1Nʼoge ahụ kwa, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ajụjụ sị, “Olee onye dị ukwuu karịa ibe ya nʼalaeze eluigwe?” 2Ọ kpọrọ otu nwantakịrị, onye o mere ka o guzoro nʼetiti ha, 3ọ sịrị, “Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu agbanweghị ma dịrị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba nʼalaeze eluigwe. 4Onye ọbụla wedara onwe ya ala dị ka nwantakịrị a bụ onye dịkarịsịrị ukwuu nʼalaeze eluigwe. 5Onye ọbụla nabatara nwantakịrị dị otu a nʼihi m, bụ onye nabatara m. 6“Ma ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu emee ka otu nʼime ndị a dị nta, bụ ndị tụkwasịrị m obi, jehie nʼokwukwe ya, ọ kaara onye ahụ mma na e kedoro ya nkume igwe nri nʼolu, tụnye ya nʼoke osimiri ka mmiri rie ya. 7Ahụhụ ga-adịrị ụwa nʼihi ihe ndị na-eme ka mmadụ jehie. Ihe ndị na-eme ka mmadụ daba nʼọnwụnwa aghaghị ịbịa, ma ahụhụ ga-adịrị onye ahụ nke ọ ga-esite nʼaka ya bịa. 8Nʼihi nke a, ọ bụrụ na aka gị maọbụ ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufukwaa ya. Ọ kaara gị mma inwe ọrụsị maọbụ daa ngwụrọ baa na ndụ, karịa na ị ga-enwe aka abụọ maọbụ ụkwụ abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ebighị ebi. 9Ọzọ, ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa na ndụ, karịa inwe anya abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ. 10“Lezienụ anya ka unu ghara ileda otu nʼime ụmụntakịrị ndị a anya. Nʼihi na nʼeluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-anọ nʼihu Nna m mgbe niile. 11Nʼihi na Nwa nke mmadụ bịara ịzọpụta ndị furu efu.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 3 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 16 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike