Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 15 Ọgọọst

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 15 Ọgọọst 2027

Sọnde · Izu nke 20 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Mbuli elu nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi nʼeluigwe

Mmemme ukwu · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Mkp 11:19–12:6, 10

19Mgbe ahụ kwa, e meghere ụlọnsọ Chineke nke dị nʼeluigwe. A hụkwara igbe ọgbụgba ndụ nʼime ya. Nʼotu oge ahụ kwa, egbe eluigwe malitere ịgba, amụma gbukwara. Oke ifufe bidokwara ife. Oke ala ọma jijiji na akụmmiri igwe mere mkpọtụ nke ukwuu. 12:1Oke ihe ịrịbama pụtara ihe nʼeluigwe, otu nwanyị e yikwasịrị anyanwụ dịka uwe. Ọnwa dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya abụọ. Okpueze nwee kpakpando iri na abụọ dịkwa ya nʼisi. 2Ọ dị ime, na-etikwa mkpu nʼihi ahụhụ na ihe ụfụ nke ọmụmụ nwa. 3Mgbe ahụ, ihe ama ọzọ pụtara ihe nʼeluigwe, agwọ ochie nke dị ukwuu na-acha uhie uhie a na-akpọ dragọn, nke nwere isi asaa na mpi iri. O kpukwasịkwara okpueze asaa nʼisi ya. 4O nwere ọdụdụ nke o ji dọkpụrụ otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke kpakpando niile dị nʼeluigwe, tụda ha nʼala. Ọ bịara guzo nʼihu nwanyị ahụ na-achọ ịmụpụta nwa ahụ ọ dị ime ya, nọọ na njikere iri nwantakịrị ahụ ma a mụpụta ya. 5Ọ mụpụtara nwantakịrị nwoke, “onye ga-ejikwa mkpara ọchịchị chịa mba niile ọchịchị.” Nʼotu oge ahụ kwa, e si nʼebe ahụ wepụ nwata ahụ were ya gaa nʼebe Chineke nọ nʼeluigwe nʼocheeze ya. 6Ma nwanyị ahụ si nʼebe ahụ gbapụ gbalaa nʼọzara ebe Chineke kwadebere na ọ ga-anọ. Ebe ahụ ka a ga-elekọta ya anya nke ọma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii (1,260). 10Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼeluigwe na-ada sị, “O mezuola nʼikpeazụ, bụ nzọpụta Chineke na ike na alaeze Chineke anyị, na ikike ịchị isi Kraịst ya, ha abụrụla ihe dị ire. Nʼihi na e sitela nʼeluigwe chụtuo onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo. Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nʼihu Chineke.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 45:9–11, 15

9Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ; nwunye eze, onye yikwasịrị ọlaedo nke Ọfịa na-eguzo nʼaka nri gị. 10Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu: “Chefuo ndị gị na ezinaụlọ nna gị. 11Nʼihi na ịma mma gị ga-eme ka eze chọsie gị ike. Sọpụrụ ya nʼihi na ọ bụ onyenwe gị.” 15E ji ọṅụ na obi ụtọ dubata ha; ha bara nʼime ụlọeze.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

1Kọ 15:20–26

20Ma e mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie nʼezie, onye mbụ nʼetiti ndị niile nwụrụ anwụ. 21Nʼihi na dịka ọnwụ si site nʼaka otu nwoke bịa, otu a kwa ka mbilite nʼọnwụ si site nʼaka otu nwoke bịa. 22Dịka mmadụ niile si anwụ site nʼaka Adam, otu a kwa ka mmadụ niile ga-esi dịkwa ndụ nʼime Kraịst. 23Onye ọbụla ga-ebili nʼusoro nke ya, Kraịst mkpụrụ mbụ si nʼọnwụ bilie. Mgbe ọ lọghachiri, ndị niile bụ ndị nke Kraịst ga-esote. 24Mgbe nke a gasịrị, ọgwụgwụ ihe niile ga-abịa, mgbe ọ ga-enyefe alaeze nʼaka Chineke bụ Nna, nʼihi na o meriela ịchị isi niile, na ikike niile na ike niile. 25Nʼihi na ọ ga-abụ eze tutu ruo mgbe ọ lụgburu ndị iro ya niile, doo ha nʼokpuru ụkwụ ya. 26Onye iro ikpeazụ a ga-emeri bụ ọnwụ.

Oziọma

Luk 1:39–56

39Nʼoge ahụ, Meri biliri gaa ọsịịsọ nʼotu obodo dị nʼugwu Juda. 40Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼụlọ Zekaraya, kelee Elizabet. 41Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya nʼafọ megharịrị ahụ. E mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ nsọ. 42O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nʼetiti ụmụ nwanyị niile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị bu nʼafọ bụkwa. 43Onye kwanụ ka m bụ na ihuọma dị otu a kpọrọ m na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m? 44Ngwangwa m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nʼafọ wuliri elu nʼọṅụ. 45Ngọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime.” 46Ma Meri sịrị, “Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu 47mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m, 48nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m, bụ odibo ya dị ala. Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi. 49Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ. 50Ebere ya na-erute ndị niile na-atụ egwu ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 51O gosila ike aka ya; ọ chụsasịala ndị dị mpako nʼime echiche obi ha. 52O sitela nʼocheeze ndị eze dị ike kwatuo ha, buliekwa ndị dị umeala nʼobi elu. 53O jirila ihe dị mma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ ma ndị ọgaranya ka o zipụrụ nʼaka efu. 54O nyerela odibo ya bụ Izrel aka, ọ na-echetakwa imere ya ebere. 55Dị ka ọ gwara nna nna anyị ha, nye Ebraham na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” 56Meri nọnyeere ya ihe dịka ọnwa atọ ma mesie laghachi nʼụlọ ya.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike