Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 12 Ọgọọst

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 12 Ọgọọst 2027

Tọọzdee · Izu nke 19 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 19 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Jane Frances de Chantal, Onye okpukpe · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jos 3:7–11, 13–17

7Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua sị, “Taa, ka m ga-amalite ime ka ị dị ukwuu nʼanya ụmụ Izrel niile, ka ha niile mata na dịka m si nọnyere Mosis, otu a ka m ga-esi nọnyere gị. 8Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ iwu si, ‘Mgbe unu ruru nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan, banyekwanụ gaa guzo nʼime osimiri ahụ.’ ” 9Mgbe ahụ, Joshua gwara ụmụ Izrel niile sị, “Bịanụ nso, bịanụ nụrụ okwu niile nke Onyenwe anyị Chineke unu. 10Otu a ka unu ga-esi mata nʼezie na Chineke dị ndụ nọ nʼetiti unu, unu ga-amatakwa na ọ ghaghị ịnapụ ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Hiv, na ndị Periz, na ndị Gigash, na ndị Amọrait, na ndị Jebus ala ha nʼihu unu. 11Lee, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onyenwe ụwa niile ga-agabiga nʼihu unu banye nʼime Jọdan. 13Ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onyenwe ụwa niile zọnyere ụkwụ na Jọdan, mmiri Jọdan nke si nʼebe elu ya na-arịdata ga-akwụsị ịsọ, guzoro dịka mgbidi.” 14Ya mere, mgbe ndị Izrel sitere nʼụlọ ikwu ha bilie njem ịgabiga osimiri Jọdan, ndị nchụaja bụ igbe ọgbụgba ndụ buuru ha ụzọ na-aga ha nʼihu. 15Nʼoge owuwe ihe ubi ọbụla, osimiri Jọdan na-etoju etoju, sọjukwaa akụkụ ya niile. Ma ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ a bịaruru nso zọnye ụkwụ ha nʼọnụ mmiri Jọdan, 16mmiri si nʼelu elu osimiri ahụ kwụsịrị ịsọ, ọ gara elu tụkọta onwe ya dịka mgbidi nʼebe dị anya, nʼobodo a na-akpọ Adam, nke dị nso obodo Zaretan. Ebe mmiri nke na-eruda na-asọbanye osimiri Araba, ya bụ, osimiri Nnu kwụsịrị ịsọ kpamkpam. Ya mere, ndị Izrel gabigara na ncherita ihu Jeriko. 17Ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị guzoro nʼala akọrọ nʼetiti Jọdan, Izrel niile gabigakwara tutu ruo mgbe mba ahụ niile gafesịrị nʼala akọrọ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 114:1–6

1Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, mgbe ezinaụlọ Jekọb sitekwara nʼebe ndị asụsụ ha dị iche pụta, 2Juda ghọrọ ebe nsọ Chineke, Izrel ghọrọ ala ọ na-achị. 3Osimiri hụrụ ya, gbaa ọsọ, osimiri Jọdan hụkwara ya chigharịa laa azụ; 4Ugwu ukwu niile wụliri elu dịka ebule; ugwu nta niile wụlikwara elu dịka ụmụ atụrụ. 5Gịnị mere gị oke osimiri, i ji na-agba ọsọ? Osimiri Jọdan, gịnị na-eme gị i ji chigharịa laa azụ? 6Gịnị na-eme unu, ugwu ukwu niile unu ji na-awụli elu dịka ụmụ ebule? Gịnị na-emekwa unu, ugwu nta niile, unu ji na-awụli elu dịka ụmụ atụrụ?

Oziọma

Mat 18:21–19:1

21Mgbe ahụ Pita bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ ugboro ole ka m ga-agbaghara nwanne m nke mehiere megide m? Ọ bụ ugboro asaa?” 22Jisọs zara sị ya, “Ọ bụghị ugboro asaa. Kama ị ga-agbaghara ya ruo iri ugboro asaa ụzọ asaa. 23“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere eze ahụ kpebiri ka ya na ndị ọrụ ya gụzie ego ya ha ji. 24Mgbe ha malitere na-apịazi, a kpọtaara eze ahụ otu onye nke ji ya ụgwọ ruru puku talenti iri. 25Nwoke ahụ enweghị ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ o ji. Nna ya ukwu nyere iwu ka e refuo ya na nwunye ya na ụmụ ya, na ihe niile o nwere, ka akwụghachi ụgwọ o ji. 26“Ma ohu ahụ dara nʼala, gbukwaa ikpere ya nʼala, rịọ ya arịrịọ sị, ‘Onyenwe m, biko, nwee ntachiobi nʼebe m nọ. Aga m akwụghachikwa gị ụgwọ niile m ji gị.’ 27Nna ukwu onye ọrụ ahụ nwere ọmịiko nʼebe ọ nọ, meere ya ebere. Ọ sịrị ya akwụghachila ụgwọ o ji ọzọ. 28“Ma mgbe ohu ahụ sitere nʼebe ahụ pụọ, ọ hụrụ otu ohu ibe ya ji ya ụgwọ otu narị denarị. O jidere ya nʼaka ike, machie ya aka nʼakpịrị, sị ya, ‘Kwụghachi m ụgwọ i ji m ugbu a.’ 29“Ya mere, ohu ibe ya ahụ dara nʼala nʼihu ya rịọọ ya ka o nye ya nwantịntị oge. Ọ rịọkwara ya sị, ‘Enyi m, biko nwee ntachiobi, aga m akwụghachi gị ụgwọ m ji gị.’ 30“Ma o kwenyeghị, kama ọ gara tụba ya nʼụlọ mkpọrọ, ebe ọ ga-anọ ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ niile o ji ya. 31Mgbe ndị ohu ibe ya hụrụ ihe mere, o wutere ha nke ukwuu. Ha jekwuru Nna ha ukwu kọọrọ ya ihe niile ndị a. 32“Nʼihi nke a Nna ya ukwu kpọrọ ohu ahụ sị ya, ‘Ohu obi ọjọọ! Agbaghara m gị ụgwọ ahụ niile i ji, nʼihi na ị rịọrọ m arịrịọ. 33Ọ bụ na ị kwesighị inwe obi ebere nʼebe ohu ibe gị nọ, dị ka m si mere gị ebere?’ 34Nʼihi iwe, Nna ya ukwuu nyefere ya nʼaka ndị nche na-eche ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ ka ha taa ya ahụhụ, ruo mgbe ọ kwụchara ụgwọ niile o ji. 35“Otu a ka Nna m bi nʼeluigwe ga-emekwa unu, ma ọ bụrụ na unu ejighị obi unu niile gbaghara ụmụnna unu.” 19:1Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o hapụrụ Galili gaa na mpaghara Judịa, nke dị nʼofe osimiri Jọdan.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike