Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 11 Ọgọọst
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 11 Ọgọọst 2027
Wenezdee · Izu nke 19 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 19 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Onye nsọ Klara, Nwaagbọghọ · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Mgbe ahụ, Mosis sitere na mbara ala Moab rigoruo nʼelu nʼugwu Nebo, ruo nʼelu Pisga, nke dị na ncherita ihu Jeriko. Nʼebe ahụ Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ala ahụ niile anya site na Gilead ruo Dan; 2ya na ala Naftalị niile nʼoke ala Ifrem, na nke Manase, na ala Juda niile ruo nʼosimiri Mediterenịa. 3Mosis hụkwara ala Negev, na akụkụ ala ahụ niile dị site na Ndagwurugwu Jeriko, obodo nkwụ, ruo Zoa. 4Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Nke a bụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee Ebraham, Aịzik na Jekọb nkwa mgbe m kwuru sị, ‘Aga m enye ya ụmụ ụmụ gị.’ Ugbu a emeela m ka i jiri anya gị hụ ya ma ị gaghị agabiga banye nʼime ya.” 5Ya mere, Mosis, onyeozi Onyenwe anyị nwụrụ nʼebe ahụ, nʼala Moab, dịka Onyenwe anyị kwuru. 6Onyenwe anyị liri ya na Moab, na ndagwurugwu chere ihu na Bet-Peoa, ma ruo taa, ọ dịghị onye ọbụla maara ebe ili ya dị. 7Mosis gbara narị afọ na iri afọ abụọ mgbe ọ nwụrụ, ma nʼoge ahụ ike ka dị ya nʼahụ, anya ya na-ahụkwa ụzọ nke ọma. 8Ụmụ Izrel ruru ụjụ nʼihi Mosis, iri ụbọchị atọ nʼobosara ala Moab, tutu ruo mgbe oge iru ụjụ na ịkwa akwa gasịrị. 9Joshua nwa Nun, jupụtara na mmụọ amamihe, nʼihi na Mosis ebikwasịla ya aka nʼisi. Ya mere, ụmụ Izrel ṅara Joshua ntị, gbasookwa iwu niile Onyenwe anyị nyere ha site nʼọnụ Mosis. 10Ọ dịbeghị onye amụma ọzọ pụtarala nʼala Izrel niile, nke dịka Mosis, onye ya na Onyenwe anyị kparịtara ụka ihu na ihu, 11onye mere ihe ịrịbama ndị a niile, rụọkwa ọrụ ebube niile nke Onyenwe anyị ziri ya ka o mee nʼIjipt, nʼihu Fero, na ndị ozi ya niile, nakwa nʼala ahụ niile. 12Nʼihi na o nwebekwaghị onye ọzọ gosirila ike dị oke egwu, maọbụ rụọ ọrụ dị oke egwu ụdị nke Mosis rụrụ nʼihu ndị Izrel niile.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ dịrị onyeisi abụ. Otu Abụ. Abụ Ọma. Ụwa niile, jirinụ ọṅụ tikuo Chineke! 2Bụọ abụ banyere ebube aha ya; meenụ ka otuto ya bụrụ ihe dị ebube! 3Gwa Chineke okwu sị ya, “Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu! Ike gị dị nnọọ ukwu, ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ. 5Bịa lee ihe Chineke mere, ụdị ọrụ oke egwu ọ na-arụ nʼihi mmadụ! 8Toonu Chineke anyị, unu mmadụ niile, kwere ka a nụ ụda otuto ya; 16Bịanụ nụrụ, unu niile na-atụ egwu Chineke; ka m kọọrọ unu ihe o meere m. 17Eji m ọnụ m kpọkuo ya; otuto ya dị m nʼire.
Oziọma
15“Ọ bụrụ na nwanna gị emehie megide gị, jekwuru ya ebe naanị gị na ya nọ, tụọ ya mmehie nʼanya. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, i ritela nwanna gị nʼuru. 16Ma ọ bụrụ na o geghị gị ntị, kpọrọ otu onye maọbụ mmadụ abụọ ọzọ laghachi azụ nʼebe ọ nọ, ‘ka okwu ọbụla ekwuru bụrụ nke mmadụ abụọ maọbụ atọ ga-agba akaebe banyere ya.’ 17Ọ bụrụ na o geghị ha ntị, gwa ndị chọọchị, ma ọ bụrụ na o geghịkwa ọ bụladị ndị chọọchị ntị, were ya dị ka onye mba ọzọ maọbụ onye ọna ụtụ. 18“Nʼezie, asị m unu, na ihe ọbụla unu kere agbụ nʼụwa a, e keela ya rịị agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla kwa unu tọpụrụ nʼụwa, a tọpụkwala ya rịị nʼeluigwe. 19“Ọzọ, ana m agwa unu nʼezie a sị, ọ bụrụ na mmadụ abụọ nʼetiti unu ekwekọrịta nʼụwa banyere ihe ọbụla unu na-arịọ nʼekpere Nna m bi nʼeluigwe ga-emezuru unu ihe ahụ. 20Nʼihi na ebe ọbụla mmadụ abụọ maọbụ atọ zukọtara nʼaha m, mụ onwe m nọ nʼetiti ha.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Klara, Nwaagbọghọ
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike