Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 12 Ọgọọst
Kalenda Ọtọdọks · 30 Julaị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 12 Ọgọọst 2027
Tọọzdee · Izu nke 8 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6
Mmemme na ndị nsọ
Holy Apostles of the 70: Silas and Sylvanus, and those with them: Criscentus, Epenetus and Andronicus (1st C)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
28Ma ọ buru na e nwee onye gwara gị, “A chụrụ ihe a nʼaja.” Unu erila nri ahụ, maka onye ahụ mere ka unu mata, na nʼihi akọnuche. 29Akọnuche nke m na-ekwu maka ya abụghị nke gị, kama ọ bụ maka nke onye ahụ. Nʼihi gịnị ka mnwere onwe m ga-eji bụrụ ihe akọnuche onye ọzọ ga-ekpe ikpe? 30Ọ bụrụ na m nwere ike inye ekele, were nri m rie, olee otu e si ekwutọ m nʼihi ihe ahụ m nyere Chineke ekele banyere ya? 31Ihe ọbụla ị na-eme, ma unu na-eri ihe maọbụ na-aṅụ ihe, na-emenụ ha niile maka otuto nke Chineke. 32Unu emejọla ndị Juu maọbụ ndị Griik, ma ọ bụkwanụ nzukọ Chineke. 33Na-agbalịsinụ ike ime dịka m si eme. Nʼihe ọbụla m na-eme, ana m ejisi ike ime ihe ga-atọ onye ọbụla ụtọ. Anaghị m achọ ọdịmma nke m naanị, kama ọ bụ ọdịmma nke mmadụ ibe m, ime ka a zọpụta ha. 11:1Unu bụrụ ndị na-eṅomi m, dịka m si eṅomi Kraịst. 2Ana m aja unu nʼihi na unu na-echeta m nʼihi niile, nakwa nʼihi na unu na-ejisikwa ozizi ahụ enyere unu nʼaka ike, dịka m nyere ha nʼaka unu idebe. 3Ma achọrọ m ka unu mata na dịka Kraịst bụ isi nwoke ọbụla, otu a ka nwoke ọbụla si bụrụ isi nwunye ya. Chineke bụkwa isi Kraịst. 4Nwoke ọbụla kpuchiri isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere maọbụ na-ebu amụma na-emenye isi ya ihere. 5Ma nwanyị ọbụla na-ekpe ekpere maọbụ na-ebu amụma, ma o kpuchighị isi ya, na-emenye isi ya ihe ihere, nʼihi na ọ dịka nwanyị kpụchara isi ya. 6Ọ bụrụ na nwanyị ọbụla achọghị ikechi isi ya, ya kpụchaa ya. A sịkwa na ọ bụkwanụ ihe ihere na nwanyị kpụchara isi ya, ka nwanyị kechie isi ya. 7Ma nwoke ekwesighị ikpuchi isi ya, nʼihi na nwoke bụ onyinyo na otuto nke Chineke, ebe nwanyị bụ otuto nke nwoke.
Oziọma
24Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ ịbụ onye na-eso ụzọ m, ya buru ụzọ jụ onwe ya, buru obe ya, soro m nʼazụ. 25Nʼihi na onye ọbụla na-eche ndụ ya nche ka ọ hapụ ifunarị ya ga-atụfu ya. Ma onye ọbụla tufuru ndụ ya nʼihi m, ga-achọtakwa ya. 26Nʼihi na uru gịnị ka mmadụ nwetara ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya? Maọbụ gịnị bụ ihe ahụ dị nʼụwa nke mmadụ ga-eji gbanwee ndụ ya? 27Nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya. Mgbe ahụ ka ọ ga-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị. 28“Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe, agaghị edetụ ọnwụ ire, tụpụ ha ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼalaeze ya.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 30 Julaị na kalenda nzukọ bụ 12 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike