Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 13 Ọgọọst

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 13 Ọgọọst 2027

Fraịdee · Izu nke 19 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 19 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ndị nsọ Pọntian, Pope, na Hipọlitọs, Onye ụkọchukwu, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jos 24:1–13

1Joshua kpọkọtara ebo Izrel niile na Shekem. Ọ kpọrọ ndị okenye Izrel na ndịisi ha na ndị ikpe ha na ndị nlekọta ha. Ha niile bịara chee onwe ha nʼihu Chineke. 2Mgbe ahụ, Joshua gwara ndị Izrel niile sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel kwuru, ‘Nna nna unu ochie ha, nke bụ Tera, nna Ebraham, na Nahọ, bikwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ofe osimiri Yufretis, ebe ha nọ fee chi ndị ọzọ ofufe. 3Ma mụ onwe m kpọpụtara nna nna unu Ebraham site nʼala ahụ dị nʼofe osimiri dubata ya nʼala Kenan, nye ya ọtụtụ ụmụ ụmụ, site na nwa ya bụ Aịzik. 4Ụmụ m nyere Aịzik bụ Jekọb na Ịsọ. Ịsọ ka m nyere ala ugwu ugwu Sia, ka o nweta ma Jekọb na ezinaụlọ ya gara nʼala Ijipt. 5“ ‘Emesịa, ezigara m Mosis na Erọn, ma wetara ndị Ijipt ihe otiti ọjọọ niile dị iche iche site nʼihe m mere nʼebe ahụ. Nʼikpeazụ, akpọpụtara m ndị m site nʼala Ijipt. 6Ma mgbe unu rutere nʼOsimiri Uhie, ndị agha Ijipt gbapụtara chịrị ụgbọ agha ha na ndị agha na-agba ịnyịnya ha chụwa unu ọsọ. 7Mgbe ndị Izrel hụrụ ha, ha tiri mkpu kpọkuo Onyenwe anyị. O tinyere oke ọchịchịrị nʼetiti unu na ndị Ijipt. O mere ka oke osimiri kpuchie ha, mee ka ha mikpuo nʼosimiri ahụ. Unu niile hụkwara ihe m mere ndị Ijipt. Emesịa, unu bikwara nʼọzara ọtụtụ afọ. 8“ ‘Ma emesịa, emere m ka unu bata nʼime ala ndị Amọrait, ndị bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Ha lụsoro unu ọgụ, ma eweere m ha nyefee unu nʼaka. E bibiri m ha nʼihu unu, ma unu nwetara ala ha. 9Mgbe Balak nwa Zipoa, eze Moab, jikeere ibuso Izrel agha, o zigaara Belam, nwa Beoa ozi ka ọ bịa bụọ unu ọnụ. 10Ma egeghị m Belam ntị. Kama emere m ya ka ọ gọzie unu. Anapụtara m unu site nʼaka ya. 11“ ‘Emesịa, unu gafere osimiri Jọdan bịaruo Jeriko. Ndị ikom Jeriko busoro unu agha, otu a kwa ka ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Gigash, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Ma eweere m ha niile nyefee unu nʼaka. 12E zigara m ebu nʼihu unu nke chụpụrụ ha nʼihu unu, bụ eze abụọ ndị Amọrait. Ọ bụghị mma agha na ụta unu ka unu ji mee nke a. 13Ya mere enyere m unu ala ahụ, nke unu na-adọgbughị onwe unu nʼihi ya, nyekwa unu ọtụtụ obodo nke unu na-ewughị, bụ ala ndị a unu bi nʼime ya ugbu a. Enyere m unu ubi vaịnị na ubi oliv nke unu na-akụghị, nke unu na-eri mkpụrụ ha.’

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 136:1–3, 16–18, 21–22, 24

1Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 2Keleenụ Chineke kachasị chi niile elu. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 3Keleenụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 16Keleenụ onye duuru ndị ya gafee ọzara, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 17Onye ahụ tigburu ndị eze dị ukwuu, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 18O gbukwara ndị eze dị ike nke ukwuu, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 21Were ala ha nye dịka ihe nketa, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 22O nyere ohu ya Izrel ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 24Mee ka anyị nwere onwe anyị site nʼaka ndị iro anyị, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Oziọma

Mat 19:3–12

3Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya i nwalee ya, sị, “O ziri ezi nʼiwu na nwoke ga-agbara nwunye ya alụkwaghị m nʼihi ihe ọbụla?” 4Ọ zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtabeghị na akwụkwọ nsọ, na Onye kere ha na mbụ kere ha nwoke na nwanyị. 5Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ. 6Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.” 7Ha jụrụ ya sị, “Gịnị mekwaranụ Mosis ji nye iwu si na nwoke ọbụla nwere ohere ide akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya?” 8Ọ zara ha sị ha, “Ọ bụ nʼihi na unu bụ ndị mkpọchi obi, ya mere Mosis jiri hapụ unu ka unu gbaa nwunye unu alụkwaghị m; ma ọ dịghị otu a site na mbụ. 9Ma ana m asị unu, onye ọbụla ga-ahapụ nwunye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nʼihi na o jidere nwunye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ.” 10Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ ka mma na mmadụ alụghị nwunye ma ọlị.” 11Ma ọ zara sị ha, “Ọ bụghị mmadụ niile ga-anagide okwu a. Naanị ndị e nyere ike ime ya ga-anagide ya. 12Ma ụfọdụ ndị mmadụ ka a mụrụ ka ha bụrụ onozi, ndị ọzọ bụkwa ndị mmadụ ibe ha mere otu a. Ndị ọzọ dịkwa ndị jiri aka ha họrọ ibu onozi nʼihi alaeze eluigwe. Onye pụrụ ịnara nke a, ya nara ya.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike