Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 4 Ọgọọst
Kalenda Ọtọdọks · 22 Julaị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 4 Ọgọọst 2027
Wenezdee · Izu nke 7 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Holy Myrrhbearer and Equal-to-the-Apostles Mary Magdalene (1st C)
Ụbọchị obubu ọnụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
12Ma ana m agwa mmadụ ndị ọzọ (nke a abụghị iwu nke Onyenwe anyị nyere). Ọ bụrụ na nwanna alụọ nwanyị nke na-ekweghị ekwe, ya achụpụla ya ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọọ ịnọgide dịka nwunye ya. 13Ọ bụrụkwa na nwanyị kwere ekwe alụọ di nke na-ekweghị ekwe, ya agbarala di ya alụkwaghị m, ma ọ bụrụ na di ya chọrọ ịnọgide dịka di ya. 14Nʼihi na edoola di ahụ na-ekweghị ekwe nsọ site na nwunye ya, otu a kwa a na-edokwa nwunye ahụ na-ekweghị ekwe nsọ site na di ya, bụ onye kwere ekwe. Ọ bụrụ na ọ dịghị otu a, ụmụ unu ga-abụ ndị na-adịghị ọcha. Ma otu ọ dị, ha dị nsọ. 15Ma ọ bụrụ na onye ahụ nke na-ekweghị ekwe ekewapụ onwe ya, ya dịrị otu ahụ, nke a emeghị ka nwanna anyị nwoke maọbụ nwanna anyị nwanyị bụrụ ohu nʼọnọdụ dị otu a, nʼihi na Chineke kpọrọ anyị ka anyị bie ndụ udo. 16Gị nwunye, ị mara maọbụ gị ga-azọpụta di gị? Ma, gị bụ di, si aṅa mara maọbụ gị ga-azọpụta nwunye gị? 17Ka onye ọbụla bie ndụ ya dịka amara Onyenwe anyị nyere ya si dị, nakwa nʼọnọdụ nke Chineke kpọrọ ya. Nke a bụ iwu m na-enye nʼụlọ chọọchị niile. 18Akpọrọ onye ọbụla mgbe e biri ya ugwu? Ya achọla iwepụ akara obibi ugwu ya. Ka onye a na-ebighị ugwu tupu ọkpụkpọ ya hapụ inye onwe ya nsogbu ịchọ ụzọ a ga-esi bie ya ugwu. 19Nʼihi na ọ dịghị mkpa ma e biri gị ugwu ma e bighị gị ugwu. Ihe kachasị mkpa bụ idebe iwu Chineke. 20Ka onye ọbụla nọgide dịka ọ dị mgbe a kpọrọ ya. 21Ị bụ ohu mgbe a kpọrọ gị? Echegbula onwe gị nʼihi ya. Kama ọ bụrụ na ọ dị ụzọ ị pụrụ isi nwere onwe gị, were ohere ahụ mee ihe ugbu a. 22Nʼihi na onye ọbụla Onyenwe anyị Chineke kpọrọ mgbe o bụ ohu, aghọọla onye nweere onwe ya nʼime Onyenwe anyị. Otu aka ahụ, onye nwerela onwe ya mgbe Onyenwe anyị kpọrọ ya aghọọla ohu nke Kraịst. 23Akwụọla ụgwọ isi unu, unu abụkwala ohu mmadụ ọzọ. 24Ụmụnna m, nʼọnọdụ ọbụla mmadụ nọ mgbe a kpọrọ ya, ya nọgidesie ike nʼime Chineke.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Meri Magdalin)
2Ọ bụrụ na m abụghị onyeozi nʼebe ndị ọzọ nọ, nʼebe unu nọ, abụ m onyeozi nʼeziokwu nʼihi na unu bụ akara nke ọrụ onyeozi m nʼime Onyenwe anyị. 3Ihe ngọpụ m nye ndị ahụ na-enyocha m bụ nke a. 4Ọ bụ na anyị enweghị ike iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ? 5Ọ bụ na anyị enweghị ike iduru nwunye onye bụ onye kwere ekwe gaa ebe ọbụla anyị na-aga dịka ndị ozi ọzọ na-eme, na dịka ụmụnne Onyenwe anyị na Sefas na-emekwa? 6Ọ ga-abụ naanị mụ na Banabas bụ ndị na-enweghị ike ịhapụ ịrụ ọrụ maka ihe anyị ga na-eri? 7Olee onye agha unu maara nke na-esi nʼakpa ya akwụ onwe ya ụgwọ ọnwa? Ka ọ dị onye ọrụ ubi vaịnị unu maara nke na-adịghị eri mkpụrụ e si nʼubi ahụ weta? Olee onye ọzụzụ atụrụ unu maara nke na-adịghị aṅụ mmiri ara e si nʼigwe atụrụ ọ na-azụ apịpụta? 8Anaghị m ekwu ihe a nʼihi na ha bụ ihe na-eme ụbọchị niile nʼetiti ndị mmadụ? Akwụkwọ iwu, o kwukwaghị otu ihe ahụ? 9Nʼihi na e dere ya nʼiwu nke Mosis, “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka.” Unu chere na ọ bụ naanị ehi ka Chineke bu nʼobi kwuo okwu a? 10E, nʼihi anyị ka eji dee ya nʼakwụkwọ. Nʼezie, e dere ihe ndị a nʼihi anyị, nʼihi na onye rụrụ ọrụ nʼubi na onye na-azọcha mkpụrụ dị nʼubi ahụ, na-eme nke a nʼolileanya na o kwesiri iketa oke site na mkpụrụ e si nʼubi ahụ weta. 11Mkpụrụ anyị kụrụ nʼime obi unu bụ mkpụrụ nke mmụọ. Ọ ga-abụ ihe ọjọọ ma anyị sị unu nyetụ anyị ụfọdụ nʼime akụnụba unu? 12Ọ bụrụ na ndị ọzọ kwesiri iketa uru dị otu a nʼahụ unu, ọ bụ na anyị ekwesighị iketa karịa? Ma ọ dịbeghị mgbe anyị rịọrọ unu ihe ọbụla, kama anyị na-agbalịsị ike ịhụ na ọ dịghị ihe ga-egbochi unu iji ezi obi na-ege ntị nʼoziọma Kraịst nke anyị wetara.
Oziọma
35Mgbe ndị obodo ahụ matara na ọ bụ ya, ha zisara ozi gburugburu obodo niile ahụ, ma dutere ya ndị niile ahụ na-adịghị ike. 36Ha rịọrọ ya ka o kwenye ka ha metụ ọ bụladị ọnụ uwe ya aka. Ndị niile metụrụ ya aka ka a gwọrọ. 15:1Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị Farisii na ndị ozizi iwu si Jerusalem bịakwute Jisọs jụrụ ya ajụjụ sị, 2“Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị erube isi nʼomenaala ndị okenye? Ha anaghị akwọ aka ha tupu ha erie nri.” 3Ọ zara ha sị, “Gịnị mere unu ji na-ada iwu Chineke nʼihi omenaala unu? 4Nʼihi na Chineke sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’ na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nna maọbụ nne ya ka e gbuo ya. ’ 5Ma unu na-asị, ọ bụrụ na onye ọbụla ga-asị nna maọbụ nne ya, ihe ọbụla bụ nke ị gara erite nʼaka m bụ ‘onyinye dịrị Chineke.’ 6Nʼihi ya, ha agaghị eji ya asọpụrụ nna ha maọbụ nne ha. Nʼụzọ dị otu a, unu na-eme ka okwu Chineke bụrụ ihe efu nʼihi omenaala unu. 7Ndị ihu abụọ! Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu bụ eziokwu. Mgbe o kwuru sị, 8“ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ. 9Ofufe ha na-efe m bụ ihe efu, ozizi ha bụkwa ihe mmadụ nyere nʼiwu.’ ” 10Mgbe ahụ, ọ kpọrọ igwe mmadụ ahụ, sị ha, “Geenụ ntị, ghọtakwanụ. 11Ọ bụghị ihe banyere mmadụ nʼọnụ na-emerụ ya, kama ọ bụ ihe sị nʼọnụ onye ahụ pụta na-emerụ ya.”
Oziọma (maka Onye nsọ Meri Magdalin)
1Mgbe ihe ndị a gasịrị, ọ gara nʼobodo ukwu niile na nʼobodo nta niile na-ekwusa ma na-ewetakwara ndị mmadụ oziọma nke alaeze Chineke. Ndị ozi iri na abụọ ahụ sokwa ya, 2na ụmụ nwanyị ụfọdụ ndị a chụpụrụ mmụọ ọjọọ site nʼime ha, gwọkwa ha nrịa nrịa: Meri Magdalin onye e sitere nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa, 3na Joana nwunye Chuza onye na-elekọta ụlọeze Herọd na akụ ya niile, na Suzana, na ọtụtụ ndị ọzọ ndị ji akụ ha na-enyere ha aka.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 22 Julaị na kalenda nzukọ bụ 4 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike