Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 3 Ọgọọst

Kalenda Ọtọdọks · 21 Julaị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 3 Ọgọọst 2027

Tiuzdee · Izu nke 7 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5

Mmemme na ndị nsọ

Prophet Ezekiel (6th C BC)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Kọ 6:20–7:12

20E jiri oke ọnụahịa zọpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto. 7:1Ugbu a, okwu banyere ihe unu dere nʼakwụkwọ: “Ọ dị mma ka nwoke ghara ịmetụ nwanyị aka.” 2Ma nʼihi ọtụtụ ihe omume banyere ịkwa iko, ka nwoke ọbụla nwee nwunye nke aka ya, nwanyị ọbụla di nke aka ya. 3Ka nwoke ọbụla jisie ike na-akwụ nwunye ya ụgwọ mmekọ o ji ya. Nwanyị ọbụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ. 4Nʼihi na nwanyị ọbụla lụrụ di adịghịkwa achị ahụ ya, kama ọ bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ nwunye ya na-achị ya. 5Ka di na nwunye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa maọbụ na mkpebi ha nwere nʼetiti onwe ha ịnọrọ iche nwa oge nta nʼihi inyefe onwe ha ikpe ekpere. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nʼihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nʼihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka. 6Anaghị m enye nke a dị ka iwu, kama ọ bụ alo ka m na-atụnyere unu. 7Asị m kwuo, aga m asị na ọ ga-aka mma ka mmadụ niile nọrọ dị ka m. Ma onye ọbụla nwere onyinye nke Chineke nyere ya. O nyere otu onye nke a, onye ọzọ nke ọzọ. 8Ma ana m agwa ndị na-anọghị nʼọnọdụ di na nwunye na ndị di ha nwụrụ anwụ, na ọ ka mma ka ha nọdụ na-alụghị di maọbụ nwunye, dịka m onwe m nọ. 9Ma ọ bụrụ na ha apụghị ijide onwe ha, ha gaa chọrọ di maọbụ nwunye lụọ. Ọ ka mma ịlụ di maọbụ nwunye, karịa mmadụ ịgba ara site nʼagụụ nke anụ ahụ. 10Ugbu a, unu ndị nwere di na ndị nwere nwunye niile, enwere m iwu m na-enye unu. (O sighị nʼaka m, kama o si nʼaka Onyenwe anyị): O kwesighị ka nwanyị ọbụla hapụ di ya. 11A sịkwa na ọ hapụ di ya, ya nọọrọ onwe ya, maọbụ ya laghachikwuru di ya. Ka nwoke ọbụla gharakwa ịgba nwunye ya alụkwaghị m. 12Ma ana m agwa mmadụ ndị ọzọ (nke a abụghị iwu nke Onyenwe anyị nyere). Ọ bụrụ na nwanna alụọ nwanyị nke na-ekweghị ekwe, ya achụpụla ya ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọọ ịnọgide dịka nwunye ya.

Oziọma

Mat 14:1–13

1Nʼoge a Herọd eze na-achị Galili nụrụ ihe banyere Jisọs. 2Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi okwu sị ha, “Onye a bụkwanụ Jọn omee baptizim. O sitela na ndị nwụrụ anwụ bilie dịkwa ndụ ọzọ. Ọ bụ ya mere ike ịrụ ọrụ ebube ndị a ji dị nʼime ya.” 3Nʼihi na, Herọd jidere Jọn kee ya agbụ tinye ya nʼụlọ mkpọrọ, nʼihi Herodịas nwunye Filip nwanne ya nwoke. 4Nʼihi na Jọn gwara ya, “Ọ bụghị ihe ziri ezi nʼiwu ka ị kpọrọ ya.” 5Herọd chọrọrị igbu ya, ma ọ tụrụ egwu ndị mmadụ, nʼihi na ha weere Jọn dị ka onye amụma. 6Ma mgbe a na-eme mmemme icheta ọmụmụ Herọd, ada Herodịas tere egwu nʼihu Herọd, na nʼihu ndị ọbịa bịara nʼụbọchị ahụ. Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu. 7Nke a mere o ji ṅụọ iyi kwee nkwa inye ya ihe ọbụla ọ rịọrọ. 8Ma dị ka nne ya si haziere ya, ọ rịọrọ eze Herọd sị, “Nye m isi Jọn omee baptizim nʼefere ugbu a.” 9Arịrịọ a wutere eze Herọd, ma nʼihi iyi ọ ṅụrụ na nʼihi ndị ọbịa ya niile, ọ chọghị ịla azụ nʼokwu ya. O nyere iwu ka e meere ya ihe ọ chọrọ. 10O ziri ozi ka e bipụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọ. 11E tinyere isi ya nʼefere bunye nwaagbọghọ ahụ. Ọ naara ya bulaara nne ya. 12Ndị na-eso ụzọ ya bịara buru ozu ya gaa lie. Ha gara kọọrọ Jisọs ihe mere. 13Mgbe Jisọs nụrụ akụkọ a, ọ banyere nʼụgbọ mmiri gaa nʼọzara, ebe ọ ga-anọdụrụ onwe ya. Ma mgbe igwe mmadụ nụrụ ya, ha si obodo dị iche iche sooro ya nʼukwu ala.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 21 Julaị na kalenda nzukọ bụ 3 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike