Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 3 Ọgọọst

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 3 Ọgọọst 2027

Tiuzdee · Izu nke 18 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 18 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọnụ 12:1–13

1Miriam na Erọn malitere ikwu okwu megide Mosis, nʼihi na ọ lụrụ nwunye onye Kush. 2Ha kwuru sị, “Ọ bụ naanị site nʼọnụ Mosis ka Onyenwe anyị si agwa ndị ya okwu? Ọ naghị esitekwa nʼọnụ anyị kwuo okwu?” Onyenwe anyị nụrụ ihe ndị a ha kwuru. 3(Ma nwoke ahụ bụ Mosis dị umeala nʼobi nke ukwuu karịa onye ọbụla nọ nʼelu ala.) 4Na mberede, Onyenwe anyị sịrị Mosis, na Erọn, na Miriam, “Pụtanụ, bịa nʼụlọ nzute, unu mmadụ atọ” Ya mere ha atọ pụtara. 5Mgbe ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime igwe ojii, guzoro na mbata ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, kpọpụta Erọn na Miriam. Mgbe ha abụọ bịara nso. 6Onyenwe anyị gwara ha sị, “Geenụ ntị nʼokwu m ndị a: “Mgbe onye amụma nọ nʼetiti unu, Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-egosi ya onwe m site nʼọhụ. Ana m agwa ya okwu site na nrọ. 7Ma nʼebe ohu m Mosis nọ, o sighị otu a dịrị, ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼụlọ m niile. 8Nʼebe ọ nọ, ana m agwa ya okwu ihu na ihu nʼụzọ doro anya, ọ bụghị site nʼilu, ọ na-ahụkwa ụdịdị Onyenwe anyị. Gịnị mere ụjọ atụghị unu ikwu okwu megide ohu m Mosis?” 9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha. O si nʼebe ha nọ pụọ. 10Ma mgbe igwe ojii ahụ hapụrụ ụlọ nzute ahụ, lee Miriam ebe o guzo, ekpenta tiwapụtara ya nʼahụ dịka nzu ọcha. Mgbe Erọn tụgharịrị ebe ọ nọ hụ na ọ ghọọla onye ekpenta, 11ọ gwara Mosis okwu sị, “Biko, onyenwe m, atala anyị ahụhụ nʼihi mmehie anyị sitere na nzuzu mee. 12Ekwela ka Miriam dịrị ka nwa ọhụrụ nwụrụ anwụ nke akpụkpọ ahụ ya rere ure nʼoge o si nʼakpanwa nne ya na-apụta.” 13Ya mere Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị ya, “Chineke, biko, gwọọ ya!”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 51:1–4, 10–11

1Abụ dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Mgbe Netan bụ onye amụma bịakwutere Devid nʼoge ya na Batsheba kwara iko. O Chineke, meere m ebere, nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; nʼihi oke ọmịiko gị, hichapụ njehie m niile. 2Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha. 3Nʼihi na amaara m njehie m niile, mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile. 4Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide, mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị, nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu, na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe. 10Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke, nwogharịa ezi mmụọ nʼime m. 11Achụpụla m nʼihu gị, anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị.

Oziọma

Mat 14:22–36

22Mgbe nke a gasịrị, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye nʼụgbọ malite ịgafe ofe ọzọ nke osimiri ahụ. Ma ya onwe ya nọdụrụ maka izilaga ndị mmadụ ahụ. 23Mgbe ọ zilagasịrị igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu ikpe ekpere, naanị ya. Mgbe oge anyasị ruru, naanị ya nọkwa na-ebe ahụ. 24Ma nʼoge a ụgbọ mmiri ahụ esitela nʼebe ala dị nso gamie nʼelu osimiri, ebili mmiri na-ebugharịkwa ya, nʼihi na ifufe ahụ na-emegide ya. 25Ma ihe dị ka site nʼelekere atọ ruo elekere isii nke ụtụtụ, Jisọs bịakwutere ha, na-aga ije nʼelu osimiri. 26Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-aga ije nʼelu osimiri ahụ, obi lọrọ ha mmiri, ha sị, “Ọ bụkwanụ mmụọ o!” Ha tiri mkpu nʼihi egwu. 27Ma ngwangwa Jisọs sịrị ha, “Nweenụ obi ike! O bụ m; unu atụla egwu.” 28Pita zara ya, “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ bụ gị, sị m bịakwute gị nʼelu mmiri.” 29Ọ sịrị ya, “Bịa!” Pita sitere nʼụgbọ ahụ pụta, bido ịga ije nʼelu mmiri ijekwuru Jisọs. 30Ma mgbe ọ hụrụ oke ebili mmiri ahụ ka ọ na-amagharị; egwu tụrụ ya. Ma mgbe ọ malitere imikpu nʼime mmiri ahụ, o tiri mkpu sị, “Onyenwe m! Zọpụta m!” 31Na-atụfughị oge, Jisọs setịpụrụ aka ya dọpụta Pita. Ọ sịrị ya, “Gị onye okwukwe nta, nʼihi gịnị ka i ji nwee obi abụọ!” 32Ma mgbe ha rịbanyere nʼime ụgbọ ahụ ifufe ahụ kwụsịkwara. 33Ndị ahụ nọ nʼụgbọ ahụ kpọrọ isiala nye ya sị, “Nʼezie, ị bụ Ọkpara Chineke.” 34Mgbe ha gafere nʼofe nke ọzọ, ha bịarutere nʼala Genesaret. 35Mgbe ndị obodo ahụ matara na ọ bụ ya, ha zisara ozi gburugburu obodo niile ahụ, ma dutere ya ndị niile ahụ na-adịghị ike. 36Ha rịọrọ ya ka o kwenye ka ha metụ ọ bụladị ọnụ uwe ya aka. Ndị niile metụrụ ya aka ka a gwọrọ.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike