Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 2 Ọgọọst

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 2 Ọgọọst 2027

Mọnde · Izu nke 18 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Mọnde nke izu nke 18 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Eusebiọs nke Vercelli, Bishọp · Ncheta a na-ahọrọ

Onye nsọ Pita Julian Eymard, Onye ụkọchukwu · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọnụ 11:4–15

4Ndị amakekwu so ụmụ Izrel nʼije a malitere itamu ntamu banyere nri ndị ọzọ na-agụ ha agụụ. Nke a mere ka ụmụ Izrel malite ịkwa akwa, na-asị, “A sịkwarị na anyị nwere anụ anyị ga-ata. 5Anyị chetara azụ anyị tara nʼIjipt, nke na-adịghị efu anyị ego, ya na kukumba, na melọn, na liik, na ayo na galiik. 6Ma ugbu a, anyị enweghịkwa agụụ iri nri, nʼihi na site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ọ bụ naanị mánà bụ ihe oriri anyị nwere.” 7Mánà dịka mkpụrụ kọrianda, na-acha ka eso osisi kpọrọ nkụ. 8Ndị Izrel na-ejegharị na-achịkọta ha. Emesịa, ha na-eji nkume e ji akwọ nri na-akwọri ha. Oge ụfọdụ, ha na-eji ikwe nri sụọ ya. Emesịa, ha na-esi ya esi, maọbụ ghee ya eghe. Ọ na-atọ dịka ihe e ji mmanụ oliv ghee. 9Mánà ndị a na-ada mgbe igirigi dara nʼọmụma ụlọ ikwu nʼabalị. 10Mosis nụrụ mkpu akwa ụmụ Izrel niile, nke na-ada nʼezinaụlọ ọbụla nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha. Iwe were Onyenwe anyị nke ukwuu. Otu a kwa, obi jọrọ Mosis njọ nke ukwuu. 11Mosis jụrụ Onyenwe anyị sị, “Gịnị mere i ji bokwasị ohu gị nsogbu dị otu a nʼisi? Gịnị ka m mere na m ahụtakwaghị amara nʼebe ị nọ, nke mere i ji bukwasị m ibu arọ nke ilekọta ndị a? 12Ọ bụ m tụrụ ime ndị a niile? Ọ bụ m mụrụ ha? Gịnị mere i ji si m kuru ha nʼaka m gawa nʼala ahụ ị ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha, dịka m bụ nne nwa na-ekugharị nwantakịrị? 13Ebee ka m ga-achọta anụ ga-ezuru igwe mmadụ ndị a? Lee na ha na-akwasa m akwa na-asị m, ‘Nye anyị anụ!’ 14Agaghị m ebulite ibu ịchịkọta ndị a niile nʼonwe m! Ibu a dị m arọ nke ukwuu. 15Ọ bụrụ na ị ga-esi otu a meso m mmeso, biko napụ m ndụ m ugbu a, nʼihi na ọnwụ m ga-egosi na m natara amara nʼebe ị nọ. Site nʼọnọdụ a ga-ewetara m mbibi wezuga m.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 81:11–16

11“Ma ndị m ekweghị ige m ntị. Izrel emekwaghị dịka m gwara ha. 12Ya mere, ahapụrụ m ha na ndụ isiike ha, ka ha soro nchepụta nke echiche ha. 13“Ewoo, a sị na ndị m gaara ege m ntị, a sịkwa na Izrel ga-eso ụzọ m niile. 14Ọ gaghị adị anya mgbe m ga-eji ike m, wezuga ndị iro ya site nʼọnọdụ ha. Aga m eweli aka m, megide ndị iro ya niile. 15Ndị niile kpọrọ Onyenwe anyị asị, ga-ada nʼihu ya nʼụjọ. Ịta ahụhụ ha ga-adịgidekwa, ruo ebighị ebi. 16Ma a ga-eji ụtụ ọka wiiti kachasị mma, nyejuo unu afọ; aga m ejikwa mmanụ aṅụ nke sitere nʼoke nkume, nyejuo unu afọ.”

Oziọma

Mat 14:13–21

13Mgbe Jisọs nụrụ akụkọ a, ọ banyere nʼụgbọ mmiri gaa nʼọzara, ebe ọ ga-anọdụrụ onwe ya. Ma mgbe igwe mmadụ nụrụ ya, ha si obodo dị iche iche sooro ya nʼukwu ala. 14Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri ahụ rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, gwọọ ndị ọrịa nʼetiti ha. 15Nʼoge anyasị ụbọchị ahụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Chi na-achọ iji. Ebe a abụkwaghị ebe ndị mmadụ bi. O nweghị nri a ga-azụta nʼọzara a. Zilaga igwe mmadụ ndị a ka ha gaa nʼime obodo zụọra onwe ha nri.” 16Ma Jisọs gwara ha sị, “Ọ dịghị mkpa na ha ga-ala. Nyenụ ha nri ka ha rie.” 17Ha zara ya sị, “Ọ bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ ka anyị nwere.” 18Ọ sịrị ha, “Wetaranụ m ha nʼebe a.” 19Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼahịhịa. O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ahụ welie anya ya elu nye Chineke ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ, nye ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya nyere ha igwe mmadụ ahụ. 20Onye ọbụla riri rijuo afọ. Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara iberibe achịcha dara nʼala tụtụjuo ha nkata iri na abụọ. 21Ma ndị riri nri ahụ dị puku ụmụ nwoke ise, nʼagụnyeghị ụmụ nwanyị, na ụmụntakịrị.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike