Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 1 Ọgọọst
Kalenda Ọtọdọks · 19 Julaị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 1 Ọgọọst 2027
Sọnde · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 6 mgbe Pentikọọsụ gasịrị
Ndị nna nke Kansụl Ụwa isii mbụ
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka ndị nna)
14Mgbe Ebram nụrụ na adọrọla Lọt nwa nwanne ya nʼagha, ọ kpọkọtara ndị ikom a zụrụ azụ na-ejere ya ozi, ndị a mụrụ nʼụlọ ya. Ọnụọgụgụ ha dị narị ndị ikom atọ na iri na asatọ, ha chụrụ ndị agha ahụ ọsọ tutu ha erute Dan. 15Nʼabalị, Ebram kere ndị agha ya ibuso ndị ahụ agha. O meriri ha, chụọ ha ọsọ, chụruo ha Hoba, nke dị nʼakụkụ ugwu Damaskọs. 16Ebram nwetaghachiri ihe niile ahụ ha dọtara nʼagha, dulata nwanne ya Lọt, na ihe onwunwe ya niile, tinyere ndị inyom, na ndị ọzọ niile a dọtara nʼagha. 17Mgbe Ebram si na mmeri ahụ o meriri Kedoloma na eze ndị ọzọ ahụ na-alọta, eze Sọdọm bịara zute ya na Ndagwurugwu Shave (nke a na-akpọ Ndagwurugwu Eze). 18Melkizedek, eze Salem, onye nchụaja Chineke nke kachasị ihe niile elu, wepụtara achịcha na mmanya, 19ọ gọziri Ebram sị ya, “Ngọzị dịrị Ebram site nʼaka Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa. 20Ngọzị dịkwara Chineke nke kachasị ihe niile elu, onye weere ndị iro gị nyefee gị nʼaka.” Mgbe ahụ, Ebram nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka ndị nna)
8Lee, enyela m unu ala ahụ niile! Baanụ nʼime ya, bichiekwanụ ala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ iyi na ọ ga-enye nna nna unu bụ Ebraham, Aịzik, Jekọb na ụmụ ụmụ ha niile ndị ga-esote ha.” 9Nʼoge ahụ, agwara m unu ụmụ Izrel okwu sị, “Unu bụụrụ m oke ibu arọ, apụghịkwa m ibu unu naanị m. 10Onyenwe anyị Chineke unu emeela ka unu mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe. 11Ka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha meekwa ka unu mụbaa nʼọnụọgụgụ, puku kwụrụ puku, ya gọziekwa unu dịka o kwere na nkwa. 15Ya mere, a kpọọrọ m ndịisi nʼebo dị iche iche, ndị ikom maara ihe, na ndị a na-asọpụrụ, mee ka ha bụrụ ndịisi ọchịchị unu, ụfọdụ ha na-elekọta puku mmadụ, ụfọdụ narị mmadụ, ndị ọzọ na-elekọta iri mmadụ ise, ndị ọzọ mmadụ iri, ka ha bụrụ ndị ndu ebo dị iche iche. 16Adọrọ m ndị ikpe unu a aka na ntị nʼoge ahụ sị ha, “Nụrụnụ ikpe niile metụtara esemokwu dị nʼetiti ụmụnna unu, ma kpeenụ ikpe ọbụla na-eleghị mmadụ anya nʼihu ma ikpe ahụ ọ dị nʼetiti ụmụnna unu ndị Izrel, maọbụ nʼetiti ndị Izrel na ndị ọbịa. 17Kpeenụ ikpe ziri ezi nye onye ukwu na onye nta. Elekwala ndị unu na-ekpe ikpe anya nʼihu, nʼihi na unu na-ekpe ikpe unu nʼọnọdụ Chineke.” Enyekwara m ha iwu sị ha wetaranụ m ikpe niile siri unu ike ka m leba ha anya.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka ndị nna)
14Ụwa na eluigwe na ebe niile kachasị elu nke eluigwe, na ihe niile dị nʼime ha, bụ nke Onyenwe anyị Chineke gị. 15Ma Onyenwe anyị nwere mmasị nʼahụ nna nna unu ha, hụkwa ha nʼanya, ọ họrọ unu, na naanị ụmụ ha niile, site nʼetiti mba niile dịka ọ dị taa. 16Nʼihi nke a, biekwanụ obi unu ugwu, kwụsịkwanụ ibi ndụ nke isiike. 17Nʼihi na Onyenwe anyị, bụ Chineke unu bụ Chineke kachasị chi niile, bụrụkwa Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile. Chineke ukwu ahụ, onye dị ike dịkwa egwu, onye na-adịghị ele mmadụ anya nʼihu, ọ nakwaghị eri ngarị. 18Ọ na-alụrụ ndị na-enweghị nna, na ụmụ nwanyị na-enweghị di ọgụ. Ọ na-ahụ ndị ọbịa nʼanya, na-enyekwa ha nri na uwe. 19Ya mere, unu onwe unu kwa, hụnụ ndị ọbịa nʼanya, nʼihi na unu onwe unu bụrụrị ndị ọbịa nʼala Ijipt. 20Tụọ Onyenwe anyị Chineke gị egwu, feekwa ya ofufe. Ya ka ị ga-arapara nʼahụ, ọ bụkwa naanị nʼaha ya ka ị ga-aṅụ iyi. 21Ọ bụ ya bụ onye ị ga-eto otuto, ọ bụ ya bụ Chineke gị, onye rụrụ gị ọrụ ndị ahụ dị oke egwu na ebube, nke gị onwe gị ji anya gị hụ.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 6
36Mgbe ha ka na-ekwu banyere nke a, ya onwe ya guzooro nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.” 37Oke egwu tụrụ ha, obi lọkwara ha mmiri nʼihi na ha chere na ha ahụla mmụọ. 38Ma ọ sịrị ha, “Gịnị mere ụjọ ji atụ unu, gịnị mere unu ji nwee obi abụọ? 39Leenụ m anya nʼaka na nʼụkwụ. Ọ bụ mụ onwe m! Metụnụ m aka ka unu hụrụ, nʼihi na mmụọ adịghị enwe anụ ahụ na ọkpụkpụ dị ka unu hụrụ m nwere.” 40Mgbe o kwuchara nke a, o gosiri ha aka ya na ụkwụ ya. 41Ma dị ka o siiri ha ike ikwere nʼihi ọṅụ na oke mgbagwoju anya, ọ sịrị ha, “Ọ dị ihe oriri unu nwere ebe a?” 42Ha nyere ya otu ntakịrị azụ a mịkpọrọ amịkpọ. 43Ma ọ naara ya rie ya nʼihu ha. 44Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Okwu ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu nọ, na ihe niile e dere nʼiwu Mosis na ndị Amụma na nʼAbụ Ọma banyere m ga-emezucha.” 45Mgbe ahụ, o meghere akọnuche ha ka ha ghọta akwụkwọ nsọ. 46Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ihe e dere na, Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ. 47Na a ga-ekwusa nchegharị na mgbaghara mmehie site nʼaha ya nye mba niile, malite na Jerusalem. 48Unu bụ ndị akaebe nke ihe ndị a. 49Ma lee, agaje m izitere unu ihe ahụ Nna m kwere na nkwa. Ya mere, nọrọnụ nʼime obodo ruo mgbe a ga-eyikwasị unu ike nke si nʼelu.” 50O duuru ha garuo na Betani, chilie aka ya abụọ elu gọzie ha. 51Dị ka ọ na-agọzi ha, ọ sitere nʼebe ha nọ pụọ, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe. 52Mgbe ahụ, ha fere ya ofufe jiri oke ọṅụ laghachi na Jerusalem. 53Ha nọgidere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-eto Chineke oge niile.
Akwụkwọ ozi
6Anyị nwere onyinye dị iche iche nke e sitere nʼamara nye anyị, ọ bụrụ na onye ọbụla nwere onyinye ibu amụma, ya buo ya dịka okwukwe o nwere ha. 7Ọ bụrụ ije ozi, ya jee ozi, ya bụrụkwanụ izi ihe, ya zie ihe. 8Ka onye nwere onyinye ịgbaume, gbaa ndị ọzọ ume, ya bụrụkwanụ inyeaka, ka onye nwere onyinye a site nʼafọ ofufu mee ya, ọ bụrụ ịbụ onyendu, ka onye ahụ duo site nʼikpachapụ anya, ya bụrụkwanụ ime ebere, ka onye ahụ jiri obi ụtọ na-eme ya. 9Ka ịhụnanya bụrụ nke ihu abụọ nʼadịghị na ya, kpọọ ihe ọjọọ asị, jidesie ihe dị mma ike. 10Hụrịtanụ onwe unu nʼanya, dịka ụmụ nke otu nna. Ka ihe ibe unu na-eme na-atọ unu ụtọ. Na-asọpụkwaranụ ibe unu karịa otu ha si asọpụrụ unu. 11Unu abụla ndị umengwụ nʼọrụ unu. Kama werenụ mmụọ na obi na-anụ ọkụ na-ejere Onyenwe anyị ozi mgbe niile. 12Nweenụ obi aṅụrị nʼime olileanya, nweenụ ntachiobi nʼime nsogbu, na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile. 13Na enyetụnụ ụfọdụ ndị nsọ ihe site nʼihe unu nwere iji gboo mkpa dịrị ha. Na-elekọtakwanụ ndị ọbịa anya nke ọma. 14Gọzienụ ndị na-akpagbu unu, gọzienụ ha, unu abụkwala ha ọnụ.
Akwụkwọ ozi (maka ndị nna)
7Chetanụ ndịisi unu, ndị gwara unu okwu Chineke. Tuleenụ otu ndụ siri dị, na-eṅomikwanụ okwukwe ha. 8Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. 9Unu ekwela ka e jiri ozizi ọhụrụ nke dịkwa iche duhie unu. Nʼihi na ọ bụ ihe dị mma ka e were amara mee ka obi sie ike, ọ bụghị site nʼidebe iwu banyere nri nke na-enweghị uru ọ bara ndị na-edebe ya. 10Anyị nwere ebe ịchụ aja, ebe ndị niile na-eje ozi ha nʼụlọ ikwu a enweghị ike iri aja a chụrụ nʼelu ya. 11Onyeisi nchụaja na-ewebata ọbara ụmụ anụ ndị ahụ nʼEbe Kachasị Nsọ dịka aja maka mmehie, ma a na-erepịa anụ ahụ ha ọkụ na mpụga ụlọ ikwu. 12Nʼotu aka ahụ, Jisọs nʼonwe ya tara ahụhụ na mpụga ọnụ ụzọ ama obodo ka o jiri ọbara ya mee ka ndị nke ya dị nsọ. 13Ya mere, ka anyị gakwuru ya nʼazụ ụlọ ikwu soro ya die mkparị o diri. 14Nʼihi na ụwa abụghị ụlọ anyị, ma anyị na-ele anya obodo nke gaje ịbịa. 15Site na ya, ka anyị na-achụrụ Chineke aja otuto mgbe niile, nke bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta aha ya. 16Unu echefula ime ihe ọma, meekwanụ ka ndị ọzọ soro unu kekọọ ihe unu nwere. Nke a bụ ụdị aja na-atọ Chineke ụtọ.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Serafim)
22Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi, 23ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a. 24Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe. 25Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ mmụọ, ka nzọ ụkwụ anyị bụrụ nke mmụọ na-eduzi. 26Ka anyị ghara ịbụ ndị mpako si otu a na-akpali iwe na ekworo nʼetiti anyị. 6:1Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu. 2Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.
Oziọma
1Jisọs banyekwara nʼụgbọ mmiri nke kwọọrọ ya bịaruo nʼobodo nke ya. 2Ndị ikom ụfọdụ butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, bụ onye dina nʼute. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ndị ahụ, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nwa m nwoke nʼihi na a gbagharala gị mmehie gị niile.” 3Nʼoge a, ụfọdụ ndị ozizi iwu nke ndị Juu nọ nʼebe ahụ sịrịtara onwe ha, “Nwoke a na-ekwulu Chineke.” 4Ma ebe Jisọs matara ihe ha na-eche nʼobi ha, ọ sịrị, “Gịnị mere unu ji na-eche ajọ echiche nʼobi unu? 5Olee nke ka mfe ikwu? Ọ bụ ị sị, ‘A gbagharala gị mmehie gị niile,’ ka ọ bụ ị sị, ‘Bilie jee ije’? 6Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Bilie, chịrị ute gị laa!” 7Nwoke ahụ biliri, chịrị ute ya laa nʼụlọ ya. 8Mgbe igwe mmadụ a hụrụ ihe ahụ mere, akpata oyi jụrụ ha nʼahụ nʼihi egwu. Ha tokwara Chineke onye na-enye ụmụ mmadụ ikike dị otu a.
Oziọma (maka ndị nna)
1Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o leliri anya nʼeluigwe sị, “Nna, oge ahụ a kara aka eruola, nye Ọkpara gị otuto, ka Ọkpara gị nyekwa gị otuto. 2I nyela ya ikike nʼebe mmadụ niile nọ, na ike inye ndị niile i nyere ya ndụ ebighị ebi. 3Nke a bụkwa ndụ ebighị ebi ahụ. Ka ha mata na naanị gị bụ Chineke nʼezie, matakwa Jisọs Kraịst onye ahụ i zitere nʼụwa. 4Enyere m gị otuto nʼụwa site nʼịrụzu ọrụ niile ị nyere m ka m rụọ. 5Ma ugbu a, Nna, nye m otuto nʼihu gị, ụdị otuto ahụ m nwere nʼihu gị tupu e kee ụwa. 6“Emere m ka ndị ahụ i siri nʼụwa kponye m mara aha gị. Ha bụ ndị nke gị, i nyere m ha, ha debekwara okwu gị. 7Ugbu a, ha amarala na ihe niile i nyere m si nʼaka gị bịa. 8Ma ugbu a, enyela m ha okwu ahụ i nyere m, ha nabatakwara ya, marakwa nʼeziokwu na-esi m nʼebe ị nọ bịa. Ha kwenyekwara na ọ bụ gị zitere m. 9Ana m ekpere ha ekpere, ọ bụghị nʼihi ụwa ka m na-ekpe ekpere. Kama ana m ekpe ekpere banyere ndị ahụ i nyere m, nʼihi na ha bụkwa ndị nke gị. 10Ihe niile m nwere bụ nke gị, ihe niile i nwere bụkwa nke m. E sitere na ha mee ka otuto m pụta ìhè. 11Ugbu a, anọghịkwa nʼime ụwa, ma ha ka nọ nʼime ụwa, ana m alaghachikwute gị. Ya mere, Nna dị nsọ, chebe ha nke ọma site nʼike nke aha gị, bụ aha nke ahụ i nyere m, ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị si bụrụ otu. 12Mgbe mụ na ha nọ nʼụwa, echebere m ha site nʼaha gị nke i nyere m. Echebekwara m ha, o nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha lara nʼiyi, karịakwa onye ahụ bụ nwa nke ịla nʼiyi, ka e mezuo ihe akwụkwọ nsọ kwuru. 13“Ma ugbu a, ana m alọghachikwute gị, ma ana m ekwu ihe ndị a nʼụwa ugbu a ka ha nwee nʼọṅụ m, nʼebe o zuruoke nʼime ha.
Oziọma (maka Onye nsọ Serafim)
17Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn. 18Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu. 19Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile. 20O weliri anya lee ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Ngọzị na-adịrị unu bụ ndị ogbenye, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke unu. 21Ngọzị na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a, nʼihi na afọ ga-eju unu. Ngọzị na-adịrị unu ndị na-ebe akwa ugbu a, nʼihi na unu ga-achị ọchị. 22Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, mgbe ha na-achụpụ unu, na-akparị unu, na-ajụ aha unu, nʼihi Nwa nke Mmadụ. 23“Ṅụrịanụ ọṅụ ma wuliekwanụ elu nʼihi ọṅụ nʼụbọchị ahụ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na otu a ka ndị nna nna ha mesoro ndị amụma.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 19 Julaị na kalenda nzukọ bụ 1 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike