Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 1 Ọgọọst

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 1 Ọgọọst 2027

Sọnde · Izu nke 18 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 18 nke Oge Nkịtị

Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọpụ 16:2–4, 12–15

2Nʼọzara ahụ, nzukọ ahụ niile tamuru ntamu megide Mosis na Erọn. 3Ụmụ Izrel gwara ha sị, “Ọ gaara adị anyị mma ma a sị na Onyenwe anyị gburu anyị nʼala Ijipt. Nʼebe ahụ ite anụ dị iche iche na-adọ nʼihu anyị, anyị na-erikwa ụdị nri ọbụla anyị chọrọ. Ugbu a, i dubatala anyị nʼọzara ka anyị niile nwụọ nʼagụụ.” 4Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Lee anya, aga m esi nʼeluigwe zitere unu achịcha. Onye ọbụla ga-aga tụtụkọtara onwe ya ihe oriri ụbọchị ọbụla dịka ọ chọrọ. Aga m eji nke a lee ha ule ịmata ma ha ga-eme ihe m nyere ha nʼiwu. 12“Anụla m ntamu nke ụmụ Izrel na-atamu. Gwa ha sị, ‘Nʼanyasị taa, unu ga-ata anụ, nʼụtụtụ echi unu ga-eri achịcha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ” 13Nʼoge uhuruchi ụbọchị ahụ, nnụnụ kweel bịara kpuchie ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Nʼisi ụtụtụ echi ya, igirigi dakwara gburugburu ọmụma ụlọ ikwu ahụ. 14Mgbe ala kọrọ mmiri igirigi ahụ, ihe dịka achịcha mbadamba nta jupụtara nʼala ọzara ahụ niile. 15Mgbe ụmụ Izrel hụrụ ya, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a?” Mosis zaghachiri ha sị, “Ọ bụ achịcha Onyenwe anyị nyere unu ka unu rie.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 78:3–4, 23–25, 54

3ihe ndị anyị nụrụla, marakwa, ihe ndị nna nna anyị ha gwara anyị. 4Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a, kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu akụkọ ịdị ike Onyenwe anyị, na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere. 23Nʼagbanyeghị ihe ndị a, o nyere mbara eluigwe iwu meghekwa ọnụ ụzọ niile nke eluigwe. 24O mere ka mánà zokwasị ndị mmadụ a dịka mmiri, ka ha rie. O nyere ha mkpụrụ ọka nke si nʼeluigwe. 25Ndị mmadụ tara achịcha ndị mmụọ ozi. O zitere ha nri niile ha nwere ike iri. 54Otu a ka o si duru ha bịaruo nʼoke ala nsọ ya, ala ugwu ugwu ahụ nke aka nri ya nwetara.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Efe 4:17, 20–24

17Ya mere, ana m ekwu nke a, ma na-eguzokwa na ya nʼime Onyenwe, ka unu hapụ ibi ndụ dị ka ndị mba ọzọ si ebi, na echiche ha na-abaghị uru. 20Ma nke a abụghị otu unu siri mụta Kraịst, 21ma ọ bụrụ na unu anụla ihe banyere ya, ọ bụrụkwa na unu amụtala ihe site nʼaka ya banyere eziokwu ahụ dị nʼime Jisọs. 22Yipụnụ mmadụ ochie unu, nke mere ka unu na-ebi ndụ ọjọọ na mbụ, bụ mmadụ ochie ahụ nke jupụtara nʼagụụ ime ihe ọjọọ niile, 23ka eme ka mmụọ nke uche unu dị ọhụrụ. 24Ma yikwasịnụ onwe unu mmadụ ọhụrụ, nke e kere nʼụdịdị Chineke nʼezi omume nʼezie nakwa nʼịdị nsọ.

Oziọma

Jọn 6:24–35

24Ma mgbe igwe mmadụ ahụ ghọtara na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya anọghị nʼebe ahụ, ha banyere nʼụgbọ mmiri nta ndị ahụ kwọfee gawa Kapanọm ịchọ Jisọs. 25Mgbe ha hụrụ ya nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ, ha sịrị ya, “Onye ozizi, olee mgbe i jiri bịa nʼebe a?” 26Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ihe unu ji na-achọ m abụghị nʼihi na unu hụrụ ihe ịrịbama m mere, kama na unu riri achịcha rijuokwa afọ. 27Unu adọgbula onwe unu maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke na-adịgide ruo ndụ ebighị ebi, bụ nke Nwa nke Mmadụ ga-enye unu. Nʼihi na Chineke Nna akakwasịla ya akara nkwado ya.” 28Mgbe ahụ, ha sịrị, “Gịnị ka anyị ga-eme iji rụọ ọrụ Chineke?” 29Jisọs zara sị ha, “Ọrụ Chineke bụ nke a, ikwere nʼonye ahụ o zitere.” 30Ya mere ha sịrị ya, “Olee ihe ịrịbama ị ga-egosi anyị nke anyị ga-ahụ ma kwere na gị? Kedụ ọrụ ị ga-arụ? 31Nna nna anyị ha riri mánà nʼọzara; dị ka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘O sitere nʼeluigwe nye ha achịcha ka ha rie.’” 32Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụghị Mosis nyere unu achịcha ahụ site nʼeluigwe, kama ọ bụ Nna m na-enye unu ezi achịcha ahụ site nʼeluigwe. 33Nʼihi na achịcha Chineke bụ nke ahụ si nʼeluigwe rịdata, na-enyekwa ụwa ndụ.” 34Ha sịrị ya, “Nna anyị ukwu, nye anyị ụdị achịcha a site ugbu a gawa.” 35Jisọs sịrị ha, “Abụ m achịcha ahụ na-enye ndụ. Onye ọbụla na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya. Onye ọbụla kwa kweere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike