Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 31 Julaị
Kalenda Ọtọdọks · 18 Julaị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 31 Julaị 2027
Satọdee · Izu nke 6 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Martyr Hyacinth of Amastris (4th c.)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Ana m ekwu eziokwu nʼime Kraịst. Anaghị m ekwu okwu ụgha. Akọnuche m nke Mmụọ Nsọ na-achị na-agbakwara m ama. 2A nọ m nʼọnọdụ oke ihe mwute na ihe mgbu dị ukwuu nʼobi m. 3A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe mee, ejikeere m ịbụ onye a bụrụ ọnụ na onye e wepụrụ site nʼebe Kraịst nọ nʼihi ụmụnna m na ndị ikwu m, 4bụ ndị Izrel. Ndị Chineke họọrọ ka ha bụrụ ụmụ ya, ndị o nyere ebube ya na ọgbụgba ndụ ya. O nyekwara ha iwu na ife ofufe nʼụlọnsọ ukwu ahụ na ọtụtụ nkwa dị iche iche. 5Ha si nʼagbụrụ nna nna anyị ochie ha. Kraịst nʼonwe ya, nʼụdịdị mmadụ, sikwa nʼagbụrụ ha pụta, onye bụ Chineke nke ihe niile, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen.
Oziọma
18Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu, otu onyeisi ụlọ ekpere bịara kpọọ isiala nye ya, sị, “Ọ dịbeghị anya nwa m nwanyị nwụrụ. Otu ọ dị, bịa ka ị bikwasị ya aka gị. Ọ ga-ebili dịkwa ndụ ọzọ.” 19Nʼihi nke a, Jisọs soro ya gawa. Ndị na-eso ụzọ ya sokwara ha. 20Ma o nwere otu nwanyị onye ahụ na-esighị ike. Nwanyị a anọọla nʼọrịa a afọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ọrịa oruru ọbara nke na-adịghị akwụsị akwụsị ka ọ na-arịa. Nwanyị a sitere nʼazụ bịaruo ya nso, metụ ọnụ uwe ya aka. 21Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m ga-enwe ike metụ ọnụ uwe ya aka, a ga-agwọ m.” 22Jisọs chigharịrị lee ya anya sị ya, “Ada m, nwee obi ike, nʼihi na e sitela nʼokwukwe gị mee ka ahụ dị gị mma.” Ahụ dịkwara nwanyị ahụ mma site nʼoge ahụ. 23Mgbe Jisọs batara nʼụlọ onyendu ụlọ ekpere ndị Juu ahụ, hụ igwe mmadụ ka ha na-atụ ụzụ na ndị na-egbu ọja. 24Ọ sịrị ha, “Sinụ ebe a pụọ, nwata nwanyị a anwụghị anwụ, kama ọ nọ nʼụra.” Ma ha chịrị ya ọchị. 25Ma mgbe achụpụsịrị igwe mmadụ ahụ, ọ banyere nʼime ụlọ, jide nwata nwanyị ahụ nʼaka, o bilie ọtọ. 26Akụkọ ọrụ ebube a gbasara nʼebe niile nʼala ahụ.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 18 Julaị na kalenda nzukọ bụ 31 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike