Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 2 Ọgọọst
Kalenda Ọtọdọks · 20 Julaị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 2 Ọgọọst 2027
Mọnde · Izu nke 7 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Holy Glorious Prophet Elijah (9th C BC)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Ugbu a, Ịlaịja onye Tishbe, onye si obodo Tishbe, nke dị nʼala Gilead, sịrị Ehab, “Eji m aha Onyenwe anyị Chineke Izrel dị ndụ, onye m na-efe na onye m na-ejere ozi na-agwa gị na igirigi agaghị ada, mmiri agaghị ezo ọzọ nʼafọ ndị a na-abịa karịa ma ọ bụghị naanị site nʼokwu ọnụ m!” 2Okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja ntị, sị ya, 3“Si nʼebe a pụọ. Soro ụzọ ọwụwa anyanwụ, gaa zoo onwe gị nʼakụkụ iyi Kerit, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ya, nke bụ nʼihu Jọdan. 4Nọdụ nʼebe ahụ ṅụọ mmiri si nʼiyi ahụ, riekwa nri ọbụla ụmụ ugolọma ga-ebutere gị, nʼihi na enyela m ha iwu ka ha nye gị nri.” 5O mere ihe Onyenwe anyị gwara ya ka o mee. Ọ gara nʼakụkụ iyi nta Kerit nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan nọrọ nʼebe ahụ. 6Ugolọma na-ebutere ya achịcha na anụ, ụtụtụ na anyasị niile. Ọ na-aṅụkwa mmiri site nʼiyi ahụ. 7Ma mgbe ụbọchị ụfọdụ gasịrị, mmiri ahụ tara, nʼihi na mmiri adịghị ezokwa nʼala ahụ. 8Okwu Onyenwe anyị bịakwutere ya, 9“Bilie, jee Zarefat, obodo dị Saịdọn nso, biri nʼebe ahụ. O nwere otu nwanyị di ya nwụrụ, onye m nyere iwu ka o nye gị nri.” 10Ịlaịja biliri jee Zarefat. Mgbe o ruru ọnụ ụzọ ama e si abanye obodo ahụ, ọ hụrụ otu nwanyị di ya nwụrụ ka ọ nọ na-achịkọta nkụ. Ịlaịja kpọrọ ya oku sị ya, “Biko, kutere m ntakịrị mmiri nʼiko ka m ṅụọ.” 11Mgbe nwanyị ahụ na-aga ikute mmiri ahụ, Ịlaịja kpọrọ ya oku ọzọ sị ya, “Biko, wetara m otu iberibe achịcha ka m taa.” 12Ma nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị Chineke na-adị ndụ, enweghị m achịcha ọbụla nʼụlọ m. Naanị ihe m nwere bụ otu njuaka ụtụ ọka dị nʼite, na mmanụ ntakịrị dị na karama. Ugbu a, ana m achịkọta nkụ ka m baa ga siere onwe m siekwara nwa m nri, ka anyị rie, chere ọnwụ ga-abịa egburu anyị.” 13Ịlaịja sịrị ya, “Atụla egwu! Gaa mee dịka i kwuru. Ma naanị buru ụzọ meere m ogbe achịcha ntakịrị site nʼihe i nwere, wetara m ya. Emesịa, mee nke gị na nwa gị ga-eri. 14Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Ụtụ ọka dị nʼite ahụ agaghị agwụ, mmanụ ahụ dị nʼite ahụ agakwaghị akọ tutu ruo ụbọchị ahụ Onyenwe anyị ga-ezite mmiri ozuzo nʼala a.’ ” 15Nwanyị ahụ mere dịka Ịlaịja kwuru. Sitekwa nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ihe oriri akọkwaghị Ịlaịja na nwanyị ahụ, na ezinaụlọ ya. 16Nʼihi na ụtụ ọka ahụ agwụghị, mmanụ akọkwaghị nwanyị ahụ, dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Ịlaịja, onye amụma. 17Mgbe ihe ndị a gasịrị, nwa nwanyị ahụ nwe ụlọ rịara ọrịa. Ọrịa a bịara sie ike nke ukwuu na ume afọdụghị nʼime ya. 18Mgbe ahụ, nwanyị ahụ kwaara akwa bịakwute Ịlaịja sị ya, “Ewoo, onye nke Chineke, gịnị ka i nwere megide m? Ị bịara ka i chetara m mmehie m, na igbu nwa m nwoke?” 19Ịlaịja zara sị ya, “Kunye m nwa gị nwoke.” Ịlaịja kuuru ya site nʼaka nne ya rigoo nʼụlọ elu ebe ya onwe ya na-edina, nibe ya nʼelu ihe ndina ya. 20Ọ kpọkuru Onyenwe anyị sị ya, “ Onyenwe anyị Chineke m, gịnị mere i ji wetara nwanyị a m bi nʼụlọ ya ihe mgbu site nʼikwe ka nwa nwoke ya nwụọ?” 21Ịlaịja gbatịrị onwe ya nʼahụ nwantakịrị ahụ ugboro atọ, kpọkuo Onyenwe anyị, sị, “Biko, Onyenwe anyị Chineke m, kwere ka mkpụrụobi nwantakịrị a laghachikwute ya.” 22Onyenwe anyị nụrụ ekpere Ịlaịja, ndụ nwantakịrị ahụ laghachikwutere ya, ọ dịkwara ndụ ọzọ. 23Mgbe ahụ, Ịlaịja kuuru ya si nʼụlọ elu ahụ rịdata, kunye ya nne ya, gwa ya okwu sị, “Lee, nwa gị dị ndụ!”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
19Ịlaịja sitere nʼebe ahụ pụọ gaa chọta Ịlaisha nwa Shafat ebe ọ nọ na-akọ ala ubi. Iri ehi abụọ na anọ e jikọtara abụọ abụọ dị ya nʼihu, ma ya onwe ya ji ehi abụọ e jikọtara ọnụ, nke iri na abụọ ya na-akọ ala ubi. Ịlaịja jekwuru Ịlaisha wụkwasị ya uwe mwụda ya nʼubu ya. 20Mgbe ahụ, Ịlaisha hapụrụ ehi ndị ahụ ebe ha guzoro nʼubi ahụ gbara ọsọ gbakwuru Ịlaịja sị ya, “Biko, kwere ka m gaa sutu nna m na nne m ọnụ, sị ha nọdụ nke ọma. Emesịa, aga m esokwa gị.” Ịlaịja zara sị ya, “Laghachi azụ, ọ bụ gịnị ka m mere gị?” 21Ịlaisha laghachiri azụ, gbuo ehi abụọ ahụ e jikọtara nʼotu, kpọọ ihe ahụ e ji arụ ọrụ nʼubi ọkụ, were ha sie anụ ahụ nye ndị mmadụ, ha rie. Mgbe ahụ, o biliri ije pụọ ga soro Ịlaịja, bụrụ nwaodibo ya. 2:1O ruo mgbe Onyenwe anyị chọrọ ị kpọrọ Ịlaịja laa nʼeluigwe site nʼoke ifufe, Ịlaịja na Ịlaisha nọ nʼụzọ sitere Gilgal. 6Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ka m jee Jọdan.” Ma ọ zara, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere, ha abụọ sooro na-eje. 7Iri ndị amụma ise sitere nʼetiti ndị amụma sooro ha guzoro nʼebe dị anya na ncherita ihu ebe Ịlaịja na Ịlaisha kwụsịrị nʼakụkụ Jọdan. 8Mgbe ahụ, Ịlaịja chịịrị uwe mwụda ya, pịakọtaa ya, tie ya nʼelu osimiri ahụ. Mmiri ahụ kewara ụzọ abụọ, ala akọrọ pụtakwara. Nʼebe ahụ ka Ịlaịja na Ịlaisha si gafee nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ. 9Mgbe ha abụọ gafesịrị, Ịlaịja jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị tupu e site nʼebe ị nọ wepụ m?” Ịlaisha rịọrọ sị ya, “Biko, mee ka m nweta ụdị mmụọ i nwere okpukpu abụọ.” 10Ịlaịja zara sị ya, “Ihe ị rịọrọ bụ ihe sịrị ike omume. Ọ bụrụ na ị hụ m mgbe a na-ewepụ m site nʼebe ị nọ, ị ga-enweta ihe ị rịọrọ. Ma ọ bụrụ na ị hụghị m, ị gaghị enweta ihe ị rịọrọ.” 11Mgbe ha na-aga nʼihu nʼije ha na-akparịta ụka, na mberede, ụgbọ ọkụ nke ịnyịnya ọkụ na-adọkpụ pụtara ihe kewaa ha abụọ. Mgbe ahụ kwa oke ifufe buuru Ịlaịja rigoro nʼeluigwe. 12Ịlaisha hụrụ ya, lelie anya elu tie mkpu akwa sị, “Nna m! Nna m! Usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!” Ọ hụkwaghị Ịlaịja anya ọzọ. O jidere uwe o yi nʼahụ dọwaa ya ibe abụọ. 13Emesịa, ọ chịlịri uwe mwụda Ịlaịja nke dapụrụ mgbe e weliri ya elu, laghachi bịa guzo nʼakụkụ osimiri Jọdan. 14O tiri akwa ahụ nʼelu mmiri ahụ jụọ sị, “Olee ebe Onyenwe anyị, Chineke Ịlaịja nọ?” Mgbe o tiri mmiri ahụ ihe, o kewakwara otu ụzọ nʼaka nri nke ọzọ nʼaka ekpe, Ịlaisha gafere nʼofe nke ọzọ.
Ofufe ụtụtụ: Oziọma
22Mmadụ niile kwuru okwu ọma banyere ya nʼihi okwu amara niile si ya nʼọnụ pụta nke mere na ha jụrịtara onwe ha sị, “Onye a, ọ bụghị nwa nwoke Josef?” 23Ọ sịrị ha, “Nʼezie, amaara m na unu ga-atụrụ m ilu a: ‘Dibịa, gwọọ onwe gị!’ Sikwa m, ‘Ihe ndị ahụ niile anyị nụrụ ị na-eme na Kapanọm mee ha nʼebe a bụ obodo gị.’ ” 24Ọ gara nʼihu sị, “Ma ị gwa unu eziokwu, o nweghị onye amụma ọbụla a na-anabata nke ọma nʼobodo a mụrụ ya. 25Nʼezie, chetakwanụ na e nwere ọtụtụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ nʼoge Ịlaịja onye amụma. Nʼoge oke ụnwụ dara nʼala ahụ dum, mgbe e mechiri eluigwe na mmiri ezoghị nʼala Izrel afọ atọ na ọnwa isii. 26Ma e zigaghị Ịlaịja ka o jekwuru onye ọbụla nʼime ha karịakwa nwanyị di ya nwụrụ anwụ nʼobodo Zarefat nʼakụkụ Saịdọn. 27Nʼoge Ịlaisha onye amụma, e nwere ọtụtụ ndị ekpenta nʼala Izrel, ma o nweghị onye e mere ka ọ dị ọcha nʼetiti ha karịakwa Neeman onye Siria.” 28Mgbe ndị nọ nʼụlọ ekpere ahụ nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu. 29Ha biliri, kwapụ ya site nʼobodo ahụ, dọkpụrụ ya gaa nʼelu ugwu nke e wukwasịrị obodo ahụ ka ha nwee ike tụpụ ya site nʼugwu ahụ. 30Ma o sitere nʼetiti igwe mmadụ ahụ pụọ, gawara onwe ya.
Akwụkwọ ozi
9E dere m unu nʼime akwụkwọ ozi m, ka unu na ndị na-akwa iko ghara inwe mmekọ ọbụla. 10Ọ bụghị ihe gbasara ndị nke ụwa ndị na-akwa iko, maọbụ ndị anya ukwu, na ndị na-apụnara mmadụ ihe, maọbụ ndị na-ekpere arụsị. Ọ bụrụ otu a, ọ pụtara na unu ga-esi nʼụwa pụọ. 11Ma ugbu a, a na m edere unu ka unu na onye ọbụla nke na-akpọ onwe ya nwanna nwoke maọbụ nwanna nwanyị ghara imekọ ihe, ma ọ bụrụ na ọ na-ebi ndụ ịkwa iko, maọbụ nwee anya ukwu, maọbụ na-ekpere arụsị, onye na-ekwutọ ibe ya, onye na-aṅụbiga mmanya oke, maọbụ onye na-apụnara mmadụ ihe. Unu na ndị dị otu a erikọla nri. 12Kedụ nke gbasara m ikpe ndị na-esoghị na chọọchị ikpe? Ọ bụghị ndị nọ nʼime ka unu ga-ekpe ikpe. 13Chineke ga-ekpe ndị nọ nʼezi ikpe. “Chụpụnụ onye ajọọ mmadụ ahụ site nʼetiti unu.” 6:1Mgbe onye ọbụla nʼetiti unu nwere esemokwu megide ibe ya, unu ọ pụrụ i buru okwu ahụ gaa nʼụlọikpe ka ndị ajọ omume kpeere unu ikpe, karịa ịga ya nʼihu ndị nsọ? 2Ọ bụ na unu amabeghị na ọ bụ ndị nsọ ga-ekpe ụwa ikpe? Ọ bụrụkwa na unu ga-ekpe ụwa ikpe, ọ pụtara na unu etozughị oke idozi okwu ntakịrị dapụtara nʼetiti unu? 3Ọ bụ na unu amataghị na ọ bụ anyị ga-ekpe ndị mmụọ ozi ikpe? Gịnị ga-emekwa ka anyị ghara idozi okwu ụka dịkarịsịrị nta nke ndụ a? 4Ya mere, ọ bụrụ na esemokwu dị otu a adapụta nʼetiti unu, unu ga-ewere okwu ahụ jekwuru ndị ibi ndụ ha na-akpọ nzukọ ihe efu ka ha kpee ya? 5Ana m ekwu nke a ime ka ihere mee unu. Ọ ga-abụ na e nweghị ike ịchọta ọ bụladị otu onye maara ihe nʼetiti unu, onye ga na-ekpe ikpe dị nʼetiti nwanna na ibe ya? 6Ma lee, nwanna na-akpọrọ nwanna ya aga ụlọ ikpe, ka ndị na-ekweghị ekwe kpee ha ikpe! 7Ebe unu na-enwe esemokwu nke ikpe ikpe nʼetiti unu, ọ pụtara na unu bụ ndị emeriri kpamkpam. Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka emejọ unu? Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka a ghọgbuo unu? 8Ma unu onwe unu na-emejọ, ma na-aghọgbu, ọ bụladị ụmụnna unu nʼime Kraịst. 9Ọ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ajọ omume dị otu a enweghị oke ọbụla nʼalaeze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu. Nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla na-akwa iko, na ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwunye na-akwa iko, na ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko, 10ndị niile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, maọbụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nʼalaeze Chineke. 11Na mbụ, ụfọdụ nʼime unu na-ebi ndụ dị otu a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye Chineke. Ọ bụkwa site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nʼime Mmụọ nke Chineke anyị ka a gụrụ unu ka ndị ezi omume.
Akwụkwọ ozi (maka Onye amụma Ịlaịja)
10Ụmụnna m, dị ka ihe ilere anya banyere inwe ndidi na ahụhụ, mụtanụ ihe site nʼaka ndị amụma bụ ndị kwuru okwu nʼaha Onyenwe anyị. 11Anyị na-agụ ha ugbu a dịka ndị a gọziri agọzi nʼihi iguzosike ha. Unu anụla maka ogologo ntachiobi nke Job nwere, unu ahụkwala nzube Onyenwe anyị nʼihi na Onyenwe anyị jupụtara nʼebere na ọmịiko. 12Karịsịa ụmụnna m, unu aṅụla iyi. Unu aṅụkwala iyi mgbe ọbụla, ọ bụladị iji eluigwe maọbụ ụwa, maọbụ ihe ọbụla ọzọ ṅụọ iyi. Kama ka “E” unu bụrụ “E.” Ka “E e,” unu bụrụkwa “E e.” Ka unu hapụ isite nʼụzọ dị otu a mehie ma wetakwara onwe unu ikpe ọmụma. 13Ọ dị onye ọbụla nʼetiti unu nọ na nsogbu? Ka onye dị otu ahụ kpee ekpere. Ọ dị onye na-aṅụrị ọṅụ? Ya bụọ abụ otuto. 14Ọ dị onye nọ nʼetiti unu ahụ na-esighị ike? Ya kpọọ ndị okenye chọọchị ka ha kpeere ya ekpere, ka ha wụkwasịkwa ya mmanụ otite nʼisi kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. 15Ekpere nke okwukwe ga-azọpụta onye ọrịa ahụ. Onyenwe anyị ga-ekulite ya, ọ bụrụkwa na o mehiere, a ga-agbaghara ya. 16Ya mere kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu. Kpeekwaranụ ibe unu ekpere ka e nwe ike gwọọ unu. Ekpere onye ezi omume dị ike dịkwa ire. 17Ịlaịja bụ mmadụ dị ka anyị, ma o kpere ekpere rịọ ka mmiri hapụ izo, mmiri ezokwaghị nʼala ahụ ruo afọ atọ na ọnwa isii. 18Emesịa, o kpekwara ekpere ọzọ, eluigwe nyere mmiri ozuzo, meekwa ka ala pupụta ihe oriri. 19Ụmụnna m, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼetiti unu esite nʼeziokwu ahụ jehie, ma otu onye nʼime unu akpọghachi ya azụ, 20chetanụ nke a na onye ọbụla kpọghachitere onye mmehie azụ site na njehie ya, ga-azọpụta ha nʼaka ọnwụ ma kpuchiekwa ọtụtụ mmehie.
Oziọma
54O rutere nʼobodo ya, malite izi ha ihe nʼụlọ ekpere ha, nke a jukwara ha anya. Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Ebee ka o si nweta amamihe a? Ebee ka o si nweta ike ịrụ ọrụ ebube ndị a niile? 55Nwoke a, ọ bụghị nwa onye kapinta? Ọ bụ na-adịghị akpọ nne ya Meri? Jemis, Josef, Saimọn na Judas, ha abụghị ụmụnne ya ndị ikom? 56Ụmụnne ya ndị inyom niile, ha anọghị nʼetiti anyị? Olee ebekwa ka nwoke a si nweta ihe ndị a?” 57Iwe were ha nʼebe ọ nọ. Ma Jisọs gwara ha okwu sị ha, “A na-asọpụrụ onye amụma nʼebe niile, ma a dịghị asọpụrụ ya nʼobodo a mụrụ ya, nakwa nʼezinaụlọ nke ya.” 58Ya mere, ọ rụghị ọtụtụ ọrụ ebube nʼebe ahụ, nʼihi na ha enweghị okwukwe nʼime ha.
Oziọma (maka Onye amụma Ịlaịja)
22Mmadụ niile kwuru okwu ọma banyere ya nʼihi okwu amara niile si ya nʼọnụ pụta nke mere na ha jụrịtara onwe ha sị, “Onye a, ọ bụghị nwa nwoke Josef?” 23Ọ sịrị ha, “Nʼezie, amaara m na unu ga-atụrụ m ilu a: ‘Dibịa, gwọọ onwe gị!’ Sikwa m, ‘Ihe ndị ahụ niile anyị nụrụ ị na-eme na Kapanọm mee ha nʼebe a bụ obodo gị.’ ” 24Ọ gara nʼihu sị, “Ma ị gwa unu eziokwu, o nweghị onye amụma ọbụla a na-anabata nke ọma nʼobodo a mụrụ ya. 25Nʼezie, chetakwanụ na e nwere ọtụtụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ nʼoge Ịlaịja onye amụma. Nʼoge oke ụnwụ dara nʼala ahụ dum, mgbe e mechiri eluigwe na mmiri ezoghị nʼala Izrel afọ atọ na ọnwa isii. 26Ma e zigaghị Ịlaịja ka o jekwuru onye ọbụla nʼime ha karịakwa nwanyị di ya nwụrụ anwụ nʼobodo Zarefat nʼakụkụ Saịdọn. 27Nʼoge Ịlaisha onye amụma, e nwere ọtụtụ ndị ekpenta nʼala Izrel, ma o nweghị onye e mere ka ọ dị ọcha nʼetiti ha karịakwa Neeman onye Siria.” 28Mgbe ndị nọ nʼụlọ ekpere ahụ nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu. 29Ha biliri, kwapụ ya site nʼobodo ahụ, dọkpụrụ ya gaa nʼelu ugwu nke e wukwasịrị obodo ahụ ka ha nwee ike tụpụ ya site nʼugwu ahụ. 30Ma o sitere nʼetiti igwe mmadụ ahụ pụọ, gawara onwe ya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 20 Julaị na kalenda nzukọ bụ 2 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike