Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 22 Julaị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 22 Julaị 2027

Tọọzdee · Izu nke 16 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Onye nsọ Meri Magdalin

Mmemme · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Abụk 3:1–4

ma ọ bụ: 2Kọ 5:14–17

1Achọrọ m onye m hụrụ nʼanya nʼelu ihe ndina m nʼabalị, ma ahụghị m ya. Ebiliri m chọọ ya ma ahụghị m ya. 2Ugbu a, aga m ebili pụọ jegharịa nʼama niile na nʼokporoụzọ niile nke obodo ịchọ ya, m ga-achọgharị onye m hụrụ nʼanya. Ya mere, achọrọ m ya ma ahụghị m ya. 3Ndị nche na-eche obodo hụrụ m, mgbe ha na-agagharị nʼobodo, ma ajụrụ m ha sị, “Biko, unu hụrụ onye ahụ m hụrụ nʼanya?” 4Ọ dịghị anya mgbe m gafere ha, achọtara m onye m hụrụ nʼanya, ejidesiri m ya ike, ahapụghị m ya aka tutu m duta ya nʼụlọ nne m, nʼime ụlọ nwanyị tụrụ ime m.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 63:1–5, 7–8

1Abụ Ọma Devid, mgbe ọ nọ nʼọzara Juda. O Chineke, ị bụ Chineke m, e ji m obi m niile na-achọ gị; akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ, anụ ahụ m na-achọsi gị ike, nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba ebe mmiri na-adịghị nʼime ya. 2Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị, hụkwa ike gị na ebube gị. 3Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ, aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma. 4Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị, aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị. 5Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ; aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị. 7Nʼihi na ị bụ onye inyeaka m, ana m abụ abụ nʼokpuru ndo nke nku gị. 8Mkpụrụobi m na-arapara gị nʼahụ; aka nri gị na-ejigide m.

Oziọma

Jọn 20:1, 11–18

1Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe chi na-abọzibeghị nke ọma, Meri Magdalin bịara nʼili ahụ, ma hụ na e wepụla nkume ahụ e jiri mechie ọnụ ili ahụ. 11Ma Meri guzo nʼakụkụ ili ahụ na-ebe akwa. Mgbe ọ nọ na-ebe akwa, o hulatara ala nyoo anya nʼime ili ahụ 12hụ ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha, ka ha nọdụrụ ala otu nʼisi, nke ọzọ nʼụkwụ, nʼebe ahụ atọgbọrọ ahụ Jisọs. 13Ha sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere i ji ebe akwa?” Ọ sịrị ha, “Ha ebupụla Onyenwe m, amaghị m ebe ha bujere ya.” 14Nʼoge a, ọ tụgharịrị hụ ka Jisọs guzo nʼebe ahụ. Ma ọ mataghị na ọ bụ Jisọs. 15Jisọs sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere iji ebe akwa? Onye ka ị na-achọ?” Ebe o chere na ọ bụ onye na-elekọta ogige ahụ, ọ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe i debere ya ka m gaa buru ya.” 16Jisọs sịrị ya, “Meri.” Ọ tụgharịrị tie mkpu nʼolu Hibru sị ya, “Raboni!” (nke pụtara “Onye nkuzi.)” 17Jisọs sịrị ya, “Emetụkwala m aka nʼihi na alakwurubeghị m Nna m. Kama gakwuru ụmụnna m gwa ha, ‘Ana m alakwuru Nna m na Nna unu. Chineke m na Chineke unu.’ ” 18Meri Magdalin gara gwa ndị na-eso ụzọ ya, “Ahụla m Onyenwe anyị.” Ọ kọọrọ ha na ọ bụ ya gwara ya ihe ndị a niile.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike