Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 22 Julaị
Kalenda Ọtọdọks · 9 Julaị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 22 Julaị 2027
Tọọzdee · Izu nke 5 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Hieromartyr Pancratios, Bishop of Taoromina in Sicily (1st C)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
17Nʼihi ya, ana m anya isi nʼime Kraịst Jisọs banyere ọrụ m na-arụrụ Chineke. 18Agaghị m anwa anwa kwuo okwu banyere ihe ọzọ karịakwa ihe ndị ahụ Kraịst rụpụtara site nʼaka m, bụ idubata ndị mba ọzọ, ime ka ha rube isi nye Chineke, site nʼokwu ọnụ m na ihe m rụrụ, 19nke pụtara ihe nʼọrụ ebube na ihe ịrịbama site nʼike nke Mmụọ nke Chineke. Ya mere, site na Jerusalem ruo Ilirikom, ekwusaala m nʼụzọ zuru ezu, oziọma Kraịst. 20Ọchịchọ obi m mgbe niile bụ ikwusa oziọma ahụ nʼebe ọbụla ndị mmadụ na-anụtụbeghị ihe banyere Kraịst, ka m ghara ịbụ onye na-ewukwasị ihe nʼelu ntọala nke onye ọzọ tọrọ, 21ma dịka e dere ya, “Ndị a na-agwaghị ihe banyere ya ga-ahụ, ndị a ka anụbeghị, ga-aghọtakwa.” 22Nʼezie, nke a bụ ihe mere m na-ejibeghị nwee ohere ịbịakwute unu. 23Nʼihi na ọ dịla ọtụtụ afọ kemgbe m bidoro na-enwe mmasị m ga-abịa hụ unu anya, ma ugbu a, ọrụ m nwere nʼakụkụ a agwụla, oge eruola mgbe m ji ahapụ ebe a. 24Nʼihi na nzube m bụ ijeru obodo Spen. Mgbe ọbụla m ga-agakwa, aga m akwụsị ịhụ unu na elekwa anya na unu ga-edupụ m nʼije m, mgbe mụ na unu jiri ọṅụ nọrọtụ nwa mgbe nta. 25Ma ugbu a, ana m aga Jerusalem ebe m na-ejere ndị nsọ ozi. 26Nʼihi na ọ dị ndị Masidonia na Akaịa ezi mma iwere nʼụfọdụ nʼihe ha nwere nyere ndị ogbenye nọ nʼetiti ndị nsọ nọ na Jerusalem aka. 27Ha ji ọṅụ mee nke a, nʼezie ha ji ha ụgwọ i mere ha otu a. Nʼihi na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ so ha keta oke na ngọzị nke Mmụọ Nsọ, ha ji ụgwọ isite nʼakụnụba ha nwere kenye ha. 28Ya mere, mgbe m mezuru nke a, hụkwa na ha anatala onyinye ahụ a tụkọtara ha, aga m abata ịhụ unu mgbe m na-aga Spen. 29Amaara m na mgbe m ga-abịakwute unu, aga m abịa nʼime ozuzu oke ngọzị nke Kraịst.
Oziọma
46Mgbe ọ nọ na-agwa igwe mmadụ ahụ okwu, nne ya na ụmụnne ya bịara guzoro nʼezi na-eche ka ha gwa ya okwu. 47Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ gwara ya okwu sị, “Lee, nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke na-achọ ịhụ gị nʼezi. Ha chọrọ ịgwa gị okwu.” 48Ma ọ zara onye ahụ gwara ya okwu sị, “Onye bụ nne m? Olee ndị bụ ụmụnne m ndị nwoke?” 49Ọ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya aka, sị, “Lee, ndị a bụ nne m na ụmụnne m ndị nwoke. 50Nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe Nna m bi nʼeluigwe chọrọ, bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, nakwa nne m.” 13:1Nʼotu ụbọchị ahụ, Jisọs hapụrụ ụlọ ahụ gaa nʼọnụ mmiri ebe ọ nọdụrụ ala. 2Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya, nke mere ka ọ baa nʼime ụgbọ mmiri. Nʼime ya ka ọ nọ na-ezi ndị mmadụ nọ nʼọnụ mmiri ahụ na-ege ya ntị ihe. 3O ji ilu gwa ha ọtụtụ ihe. Ọ gwara ha sị, “O nwere otu onye ọrụ ubi gara ịkụ mkpụrụ nʼubi ya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 9 Julaị na kalenda nzukọ bụ 22 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike