Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 23 Julaị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 23 Julaị 2027
Fraịdee · Izu nke 16 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 16 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Brijit, Onye okpukpe · Ncheta a na-ahọrọ
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Chineke kwuru okwu ndị a niile sị: 2“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼIjipt, bụ ala nke ibu ohu. 3“Ị gaghị enwe chi ọzọ tinyere m. 4Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, nʼoyiyi nke ụdị ọbụla nke yiri ihe dị nʼeluigwe maọbụ nke yiri ihe dị nʼụwa, nʼokpuru ya maọbụ nʼime mmiri, nʼokpuru ụwa. 5Gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe, nʼihi na Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, abụ m Chineke ekworo. Onye na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ahụhụ, nʼihi ajọ omume nke ndị mụrụ ha, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ, nke ndị ahụ kpọrọ m asị. 6Ma na egosi ịhụnanya nye puku ọgbọ niile nke ndị hụrụ m nʼanya, bụ ndị na-edebe ihe niile m nyere nʼiwu. 7Gị ejikwala aha Onyenwe anyị bụ Chineke gị eme ihe efu, nʼihi na Onyenwe anyị agaghị agụ onye ji aha ya eme ihe efu dịka onye ikpe na-amaghị. 8Cheta ụbọchị izuike site nʼido ya nsọ. 9Nʼime ụbọchị isii ka ị ga-eje ozi gị niile. Ọ bụkwa nʼime ha ka ị ga-arụzu ọrụ gị niile. 10Ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, gị onwe gị, nwa gị nwoke na nwa gị nwanyị, onye ọrụ gị nwoke, onye ọrụ gị nwanyị, maọbụ anụ ụlọ gị ọbụla, ọbụladị onye ọbịa bi nʼobodo gị. 11Nʼihi na ọ bụ nʼime ụbọchị isii ka Onyenwe anyị kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri, na ihe niile dị nʼime ha. O zuru ike nʼụbọchị nke asaa. Nʼihi nke a Onyenwe anyị gọziri ụbọchị nke asaa doo ya nsọ, ka ọ bụrụ ụbọchị izuike. 12Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị. 13Gị egbula mmadụ. 14Gị akwala iko. 15Gị ezula ohi. 16Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị. 17Gị enwela anya ukwu nʼebe ụlọ onye agbataobi gị dị. Gị enwekwala anya ukwu nʼebe nwunye onye agbataobi gị dị, maọbụ ohu ya nwoke maọbụ ohu ya nwanyị, ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, ma ọ bụkwanụ nʼihe ọbụla nke onye agbataobi gị nwere dị.”
Abụ Ọma nzaghachi
8Iwu Onyenwe anyị ziri ezi, ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ. Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke, ọ na-enye anya ìhè. 9Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha, ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike, ha niile bụkwa ihe ziri ezi. 10Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo, karịa ọlaedo a nụchara anụcha; ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ, karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ. 11Ọ bụ site na ha ka a na-adọ ohu gị aka na ntị; ụgwọ ọrụ dị ukwuu dị nʼidebe ha.
Oziọma
18“Ugbu nụrụnụ nkọwa ilu ọgha mkpụrụ ahụ. 19Mgbe onye ọbụla nụrụ oziọma nke alaeze ahụ, ma ọ ghọtaghị ya, ajọ onye ahụ na-abịa napụ ya ihe ahụ akụrụ nʼobi ya. Nke a bụ mkpụrụ ahụ nke dara nʼokporoụzọ. 20Mkpụrụ nke dara nʼala nkume nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ oziọma ahụ, jirikwa oke ọṅụ nabata ya. 21Ma ebe ha na-enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha. Ha na-anọ nwa oge nta. Mgbe nsogbu maọbụ mkpagbu bịara nʼihi okwu ahụ, ngwangwa ha na-adachapụ. 22Mkpụrụ nke dara nʼala ahụ ogwu ogwu dị nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ oziọma ahụ, ma ọchịchọ nke ụwa a, ya na itinye obi nʼakụ nke ụwa a, kpagidere okwu dị nʼime ya, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ. 23Ma mkpụrụ dara nʼala ọma ahụ nọchiri anya obi mmadụ onye gere ntị nʼoziọma ahụ, ghọtakwa ya. Ọ na-amịta mkpụrụ dị narị, maọbụ iri isii, maọbụ iri atọ karịa ihe akụnyere nʼime ya.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Brijit, Onye okpukpe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike