Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 21 Julaị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 21 Julaị 2027

Wenezdee · Izu nke 16 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 16 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Lọrens nke Brindisi, Onye ụkọchukwu na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọpụ 16:1–5, 9–15

1Ọgbakọ ụmụ Izrel niile hapụrụ obodo Elim, jere ije bịarute nʼọzara Sin nke dị nʼetiti Saịnaị na Elim. Ha bịaruru nʼebe ahụ nʼabalị iri na ise nke ọnwa abụọ, site na mgbe ha hapụrụ Ijipt. 2Nʼọzara ahụ, nzukọ ahụ niile tamuru ntamu megide Mosis na Erọn. 3Ụmụ Izrel gwara ha sị, “Ọ gaara adị anyị mma ma a sị na Onyenwe anyị gburu anyị nʼala Ijipt. Nʼebe ahụ ite anụ dị iche iche na-adọ nʼihu anyị, anyị na-erikwa ụdị nri ọbụla anyị chọrọ. Ugbu a, i dubatala anyị nʼọzara ka anyị niile nwụọ nʼagụụ.” 4Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Lee anya, aga m esi nʼeluigwe zitere unu achịcha. Onye ọbụla ga-aga tụtụkọtara onwe ya ihe oriri ụbọchị ọbụla dịka ọ chọrọ. Aga m eji nke a lee ha ule ịmata ma ha ga-eme ihe m nyere ha nʼiwu. 5Gwa ha na nʼụbọchị nke isii, ha ga-ewere nri ha ga-ericha nʼụbọchị ahụ, ma nri ha ga-eri nʼụbọchị nke asaa, ka ha ga-achịkọta nʼụbọchị nke isii.” 9Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn okwu sị ya, “Gwa nzukọ Izrel niile okwu sị ha, ‘Pụtanụ bịa nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ nụla ntamu unu.’ ” 10Mgbe Erọn nọ na-agwa nzukọ Izrel okwu, ha lepụrụ anya nʼọzara hụ ebube Onyenwe anyị ka ọ pụtara ihe nʼigwe ojii. 11Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 12“Anụla m ntamu nke ụmụ Izrel na-atamu. Gwa ha sị, ‘Nʼanyasị taa, unu ga-ata anụ, nʼụtụtụ echi unu ga-eri achịcha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ” 13Nʼoge uhuruchi ụbọchị ahụ, nnụnụ kweel bịara kpuchie ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Nʼisi ụtụtụ echi ya, igirigi dakwara gburugburu ọmụma ụlọ ikwu ahụ. 14Mgbe ala kọrọ mmiri igirigi ahụ, ihe dịka achịcha mbadamba nta jupụtara nʼala ọzara ahụ niile. 15Mgbe ụmụ Izrel hụrụ ya, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a?” Mosis zaghachiri ha sị, “Ọ bụ achịcha Onyenwe anyị nyere unu ka unu rie.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 78:18–19, 23–28

18Ha kpachara anya nwaa Chineke ọnwụnwa, mgbe ha rịọrọ ya nri nke obi ha chọrọ. 19Ha kwuhiere Chineke; jụọ ya ọnụ sị, “Chineke ọ pụrụ inye anyị ezi nri na mmiri ọṅụṅụ nʼọzara a? 23Nʼagbanyeghị ihe ndị a, o nyere mbara eluigwe iwu meghekwa ọnụ ụzọ niile nke eluigwe. 24O mere ka mánà zokwasị ndị mmadụ a dịka mmiri, ka ha rie. O nyere ha mkpụrụ ọka nke si nʼeluigwe. 25Ndị mmadụ tara achịcha ndị mmụọ ozi. O zitere ha nri niile ha nwere ike iri. 26O sitere nʼeluigwe tọpụ ikuku nke ọwụwa anyanwụ, o jikwa ike ya duo ikuku nke ndịda. 27O zidatara ha anụ dị ukwuu dịka ọ bụ uzuzu, anụ ufe ọnụọgụgụ ha dịka ọnụọgụgụ aja dị nʼala ọnụ oke osimiri. 28O mere ka ụmụ anụ ufe ndị a daara ha nʼala nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha nakwa gburugburu ụlọ ikwu ha.

Oziọma

Mat 13:1–9

1Nʼotu ụbọchị ahụ, Jisọs hapụrụ ụlọ ahụ gaa nʼọnụ mmiri ebe ọ nọdụrụ ala. 2Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya, nke mere ka ọ baa nʼime ụgbọ mmiri. Nʼime ya ka ọ nọ na-ezi ndị mmadụ nọ nʼọnụ mmiri ahụ na-ege ya ntị ihe. 3O ji ilu gwa ha ọtụtụ ihe. Ọ gwara ha sị, “O nwere otu onye ọrụ ubi gara ịkụ mkpụrụ nʼubi ya. 4Mgbe ọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nʼime ha dara nʼakụkụ ụzọ ebe ụmụ nnụnụ bịara tụrịa ha loo. 5Ma ụfọdụ nʼime ha dara nʼala dị nkume nkume. Ọ dịghị anya ha puputara, too, nʼihi na aja dị nʼebe ahụ emighị emi. 6Ma mgbe anwụ mụkwasịrị ha, ha chanwụrụ, kpọnwụọ, nʼihi na mgbọrọgwụ ha emikpughị emikpu nʼime ala. 7Mkpụrụ ụfọdụ danyere nʼetiti ogwu, ogwu ahụ topụtara kpagbuo ha. 8Ma ụfọdụ mkpụrụ dara nʼezi ala, mịakwa ọtụtụ mkpụrụ. Ụfọdụ mịrị mkpụrụ iri atọ, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ kwa otu narị. 9Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike