Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 19 Julaị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 19 Julaị 2027

Mọnde · Izu nke 16 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Mọnde nke izu nke 16 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọpụ 14:5–18

5Mgbe a gwara eze Ijipt na ndị a agbaala ọsọ, obi Fero na ndị ozi ya gbanwere megide ndị Izrel. Ha sịrị, “Gịnị bụ ihe anyị mere, site na izipụ ndị Izrel nʼọrụ ife anyị?” 6Na-atụfughị oge, Fero rigoro nʼelu ụgbọ agha ya, duru ndị agha ya ịchụso ha. 7Ọ chịịrị ụgbọ agha dị narị isii e leziri anya họpụta, tinyere ụgbọ agha Ijipt niile. Ndịisi agha ndị Ijipt nọcha nʼelu ha niile. 8Onyenwe anyị mere ka obi Fero eze Ijipt sie ike. Ọ chụsoro ụmụ Izrel, ndị na-aga nʼihu nʼije ha, na-atụghị egwu maọbụ ịda mba. 9Ndị Ijipt chụsoro ha ọsọ, ịnyịnya Fero na ụgbọ agha, na ndị na-agba ịnyịnya na ndị agha ndị ọzọ chụsoro ndị Izrel ọsọ chụkwute ha nʼebe ha na-ezu ike nʼakụkụ osimiri dị nso na Pi Hahirot na ncherita ihu Baal-Zefọn. 10Mgbe ndị agha Fero na-abịa nso, ndị Izrel lere anya nʼazụ, hụ ndị Ijipt ka ha na-abịa nso. Ha tụrụ egwu, tie mkpu akwa, kpọkuo Onyenwe anyị. 11Ha jụrụ Mosis sị, “Ọ bụ na o nweghị ili dị nʼala Ijipt, i ji kwagide anyị ka anyị niile bịa nwụọ nʼebe a nʼọzara? Gịnị mere i ji kwagide anyị ka anyị hapụ Ijipt? 12Ọ bụ na anyị agwaghị gị nʼala Ijipt si gị, ‘Hapụ anyị ka anyị nọgide na-ejere ndị Ijipt ozi?’ Ọ gara akara anyị mma ị bụ ohu ndị Ijipt karịa ịnwụ nʼọzara.” 13Mosis zaghachiri ha sị, “Unu atụla egwu. Guzosienụ ike. Unu ga-ahụ ụzọ dị ebube Onyenwe anyị ga-esi zọpụta unu taa. Ndị Ijipt a unu na-ahụ taa, unu agaghị ahụkwa ha ọzọ. 14Nọrọnụ jii. Onyenwe anyị ga-alụrụ unu ọgụ.” 15Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Gịnị mere i ji na-akpọku m. Gwa ụmụ Izrel ka ha gaa nʼihu. 16Welie mkpanaka gị elu. Setịpụ ya nʼelu osimiri ahụ ka o kewaa abụọ. Ụzọ ga-adịkwa nʼetiti osimiri ahụ. Ụmụ Izrel ga-esitekwa nʼala akọrọ gafee. 17Aga m eme ka obi ndị Ijipt sie ike, ka ha sorokwa unu nʼazụ banye. Aga m ewetara onwe m otuto site na Fero, na ndị agha niile, na ụgbọ agha niile nakwa ndị na-agba ịnyịnya ya. 18Nʼoge ahụ, ndị Ijipt ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. M ga-enweta nsọpụrụ site na Fero, na ụgbọ agha ya niile, na ndị na-agba ịnyịnya ya.”

Abụ Ọma nzaghachi

Ọpụ 15:1–6

1Mgbe ahụ, Mosis na ụmụ Izrel bụkuru Onyenwe anyị abụ dị otu a sị, “Aga m abụku Onyenwe anyị abụ nʼihi na o buliela onwe ya elu nke ukwuu. Ọ tụnyela ịnyịnya na onye na-agba ya nʼosimiri. 2“ Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m. Ọ ghọrọla m nzọpụta. Ọ bụ Chineke m, aga m etokwa ya, Chineke nke nna m, aga m ebulikwa ya elu. 3Onye na-ebu agha ka Onyenwe anyị bụ. Nʼezie, aha ya bụ Onyenwe anyị. 4Ụgbọ agha Fero na usuu ndị agha ya, ka ọ tụnyere nʼosimiri ahụ. Ndịisi agha Fero, ndị ahọrọ ahọ, ka o mere ka Osimiri Uhie rie. 5Ogbu osimiri ahụ ekpuchiela ha. Nʼime mmiri ahụ dị omimi ka ha rịdaruru dịka nkume. 6Aka nri gị Onyenwe anyị, dị ike, dịkwa ebube. Aka nri gị, Onyenwe anyị na-etipịasị ndị iro.

Oziọma

Mat 12:38–42

38Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị ozizi iwu na ndị Farisii gwara Jisọs sị ya, “Onye nkuzi, anyị chọrọ ka i gosi anyị ihe ịrịbama.” 39Ma ọ zara sị ha, “Ọ bụ naanị ajọ ọgbọ nke na-enweghị okwukwe ga-achọkwa ka e gosi ha ihe ịrịbama. Ma ọ dịkwaghị ihe ịrịbama ọzọ a ga-egosi unu karịa ihe ịrịbama Jona onye amụma. 40Nʼihi na dị ka Jona nọrọ ụbọchị atọ, ehihie na abalị nʼafọ azụ dị ukwuu, otu a ka Nwa nke Mmadụ ga-esi nọọkwa ụbọchị atọ, ehihie na abalị nʼobi nke ala. 41Ndị ikom Ninive ga-eso ọgbọ a bilie nʼụbọchị ikpe maa ya ikpe. Nʼihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ nkwusa Jona. Ma lee onye karịrị Jona ukwuu nọ nʼebe a. 42Nʼụbọchị ikpe ahụ kwa, eze nwanyị nke Ndịda ga-eso ọgbọ a bilie boo ya ebubo. Ọ ga-amakwa unu ikpe. Nʼihi na o siri nʼebe dị ụwa sọtụrụ bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn. Ma ugbu a onye ahụ dị ukwuu karịa Solomọn nọ nʼebe a, ma unu jụrụ i kwere na ya.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike