Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 20 Julaị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 20 Julaị 2027

Tiuzdee · Izu nke 16 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 16 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Apolinaris, Bishọp na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọpụ 14:21–15:1

21Mgbe ahụ, Mosis setịpụrụ aka ya nʼelu Osimiri Uhie ahụ. Onyenwe anyị ji oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke fere nʼabalị ahụ niile, nughachi osimiri ahụ, mee ka osimiri ahụ kebie ụzọ abụọ, ka ụzọ pụta nʼala osimiri ahụ. 22Ụmụ Izrel sitere nʼetiti osimiri ahụ gafee. Mmiri osimiri ahụ ghọọrọ mgbidi nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha. 23Mgbe ndị agha Ijipt na-achụ ha ọsọ hụrụ ha ka ha na-agafe, ha sogidere ha baa, ọ bụladị nʼetiti osimiri ahụ. Ndị agha Ijipt niile sooro ha, ya bụ, ụgbọ agha Fero, ndị agha ya na ndị na-agba ịnyịnya ya niile. 24Nʼisi ụtụtụ echi ya, Onyenwe anyị ledatara anya site nʼogidi igwe ojii ahụ na-enye ihe. O legidere ndị agha Ijipt anya, tinyekwa ha ụjọ nʼobi nke mere na ha amakwaghị onwe ha. 25O mebiri ụkwụ ụgbọ agha ha mee ka o siere ịnyịnya ha ike ịdọkpụ ụgbọ agha ndị ahụ. Mgbe ahụ, ndị Ijipt kwuru sị, “Ka anyị sinụ nʼịchụ ndị Izrel gbapụ, nʼihi na Onyenwe anyị na-alụrụ ha ọgụ, na-emegidekwa anyị.” 26Mgbe ụmụ Izrel gafesịrị ruo nʼakụkụ nke ọzọ nke osimiri ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Setịpụ aka gị ọzọ ka mmiri ahụ kpuchigide ndị Ijipt, na ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya ya.” 27Mosis setịpụrụ aka nʼelu osimiri ahụ. Nʼụtụtụ ya, mmiri osimiri ahụ sọghachiri gaa ebe ọ nọ na mbụ. Ndị Ijipt chọsịrị ụzọ ha si agbapụ ike, ma Onyenwe anyị mere ka osimiri ahụ kpuchie ha. 28Osimiri ahụ kpuchigidere ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya, na ndị agha Fero niile ndị chụụrụ ụmụ Izrel baa nʼime osimiri ahụ. O nweghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ. 29Ma ụmụ Izrel esitelarị nʼala nke mmiri kọrọ gafee osimiri ahụ. Mgbe ha na-agafekwa, akụkụ abụọ nke osimiri ahụ guzoro ọtọ dịka mgbidi, nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha. 30Site nʼụzọ dị otu a, Onyenwe anyị zọpụtara ụmụ Izrel site nʼaka ndị Ijipt. Ụmụ Izrel hụkwara ozu ndị Ijipt nʼikpere mmiri osimiri ahụ. 31Ụmụ Izrel tụrụ egwu Onyenwe anyị mgbe ha hụrụ ihe ịrịbama ndị a Onyenwe anyị ji zọpụta ha site nʼaka ndị Ijipt. Ha kwenyere na Onyenwe anyị, kwenyekwa na Mosis ohu ya. 15:1Mgbe ahụ, Mosis na ụmụ Izrel bụkuru Onyenwe anyị abụ dị otu a sị, “Aga m abụku Onyenwe anyị abụ nʼihi na o buliela onwe ya elu nke ukwuu. Ọ tụnyela ịnyịnya na onye na-agba ya nʼosimiri.

Abụ Ọma nzaghachi

Ọpụ 15:8–10, 12, 17

8I sitere na nkuume nke oghere imi gị, mee ka mmiri osimiri guzoro ọtọ. Mmiri ahụ na-erugharị erugharị guzoro nʼotu ebe dịka mgbidi; ogbu mmiri kpụkọtara rahụ nʼala ala nsọtụ nke osimiri. 9Onye iro nyara isi sị, ‘Aga m achụso ha, gafee ha. Aga m ekesa ihe a kwatara nʼagha. Nyejuo onwe m afọ site na ha. Aga m amịpụta mma agha m. Jiri aka m laa ha nʼiyi.’ 10Ma i kupụrụ ikuku si gị nʼimi pụta, osimiri riri ha, ha mikpuru nʼime osimiri ukwu ahụ dịka igwe. 12“I setịpụrụ aka nri gị, ala meghere ọnụ ya loo ndị iro gị niile. 17Gị onwe gị ga-akpọbata ha, kụọ ha dịka mkpụrụ, nʼelu ugwu nke ihe nketa gị. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị, i mere ka ọ bụrụ ebe obibi gị, ebe nsọ ahụ, Onyenwe anyị, nke i ji aka gị tọọ ntọala ya.

Oziọma

Mat 12:46–50

46Mgbe ọ nọ na-agwa igwe mmadụ ahụ okwu, nne ya na ụmụnne ya bịara guzoro nʼezi na-eche ka ha gwa ya okwu. 47Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ gwara ya okwu sị, “Lee, nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke na-achọ ịhụ gị nʼezi. Ha chọrọ ịgwa gị okwu.” 48Ma ọ zara onye ahụ gwara ya okwu sị, “Onye bụ nne m? Olee ndị bụ ụmụnne m ndị nwoke?” 49Ọ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya aka, sị, “Lee, ndị a bụ nne m na ụmụnne m ndị nwoke. 50Nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe Nna m bi nʼeluigwe chọrọ, bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, nakwa nne m.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike