Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 19 Julaị

Kalenda Ọtọdọks · 6 Julaị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 19 Julaị 2027

Mọnde · Izu nke 5 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Venerable Sisoes the Great († 429)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Rom 12:4–5, 15–21

4Dịka anyị niile nʼotu nʼotu si nwe anụ ahụ nke nwere akụkụ dị iche iche, bụ akụkụ ndị na-arụ ọrụ dị iche iche, 5nʼotu aka ahụ, nʼime Kraịst anyị bụ otu, nʼagbanyeghị na anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu anụ ahụ. E jikọtara anyị niile nʼotu nʼotu nye ibe anyị. 15Mgbe ndị ọzọ na-aṅụrị ọṅụ, soronụ ha ṅụrịa ọṅụ. Mgbe ha nọ nʼiru ụjụ, soronụ ha ruo ụjụ. 16Na-ebinụ nʼudo. A bụla onye mpako, unu na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwe mmekọrịta, echekwala na ị maara ihe niile. 17Ejikwala ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere gị. Kama, na-echenụ otu unu ga-esi mee ihe dị mma nʼanya mmadụ niile. 18Dịka ike gị niile ha, mee ka gị na onye ọbụla biri nʼudo. 19Ndị enyi m, unu abọla ọbọ, kama hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọtara unu ọbọ. Nʼihi na e dere ya, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,” ka Onyenwe anyị kwuru. 20Ma otu ọ dị, “ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, were nri zụọ ya, ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ihe ọṅụṅụ ka ọ ṅụọ, mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya.” 21Unu ekwela ka ihe ọjọọ merie unu, kama werenụ ezi ihe merie ihe ọjọọ.

Oziọma

Mat 12:9–13

9O sitere nʼebe ahụ pụọ banye nʼụlọ nzukọ ha. 10Nʼebe a ka ọ hụrụ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ndị nọ nʼebe ahụ jụrụ ya ajụjụ sị, “O ziri ezi nʼiwu ịgwọ mmadụ nʼụbọchị izuike?” 11Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu nwere otu atụrụ danyere nʼime olulu nʼụbọchị izuike gịnị ka ọ ga-eme? Ọ ga-ahapụ ya nʼebe ahụ? Ọ gaghị ejide ya dọpụta ya? 12Mmadụ ọ dịghị mkpa karịa atụrụ? Ya mere, o ziri ezi nʼiwu bụ ịrụ ọrụ ọma nʼụbọchị izuike.” 13Mgbe ahụ ọ sịrị nwoke ahụ, “Setịpụ aka gị.” Nwoke ahụ setịpụrụ aka ya. Aka ahụ dịkwara ya mma dị ka aka nke ọzọ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 6 Julaị na kalenda nzukọ bụ 19 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike