Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 18 Julaị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 18 Julaị 2027
Sọnde · Izu nke 16 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 16 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1“Ahụhụ dịrị ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-achụsasị, ma na-ebibi igwe atụrụ m ha kwesiri ilekọtazi anya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 2Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-agwa ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-elekọta ndị m, “Ebe ọ bụ na unu akpasasịala igwe ewu na atụrụ m, chụsaa ha, kama ilekọtazi ha anya nke ọma, aga m ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ ndị a unu mere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 3“Mụ onwe m ga-eji aka m chịkọta ndị m fọdụrụ nʼigwe ewu na atụrụ m site na mba ahụ niile m chụgara ha, kpọghachikwa ha nʼebe ịta nri ha, ebe ha ga-anọ mụbaa, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. 4Aga m ahọpụtakwa ndị ọzụzụ atụrụ, ndị ga-elekọtazi ha anya. Egwu agaghị atụ ha, ọ dịkwaghị onye ga-emenye ha ụjọ. O nwekwaghị onye ga-akpafu akpafu nʼime ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 5“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka Ngalaba na-eme ezi omume bilie nʼezinaụlọ Devid. Ọ ga-abụ Eze ga-eji amamihe chịa ndị ya. Ọ ga-eme ezi ihe, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ. 6Nʼụbọchị, ya ka a ga-azọpụta Juda, Izrel ga-ebikwa nʼudo. Nke a bụ aha a ga-akpọ ya: Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ Ezi omume Anyị.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m. 2Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto, ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ, 3ọ na-atụte mkpụrụobi m. Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume nʼihi aha ya. 4A sịkwarị na m na-aga ije, na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ, agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla; nʼihi na ị nọnyeere m, mkpọrọ gị na mkpanaka gị na-akasị m obi. 5Ị na-akwado tebul nʼihu m, nʼanya ndị iro m. I tere isi m mmanụ iko m na-ejubiga oke. 6Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m ogologo ụbọchị niile nke ndụ m, m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe niile ebighị ebi.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
13Ma ugbu a nʼime Kraịst Jisọs, unu bụ ndị nọ nʼebe dị anya nʼoge gara aga, ka e mere ka unu bịaruo nso site nʼọbara Kraịst nke a wụsiri. 14Nʼihi na ya onwe ya bụ udo anyị, o mere ka ụzọ otu abụọ bụrụ otu ihe nʼime ahụ ya, site na ịkwatu mgbidi kewara ha na mgbe ochie, bụ mgbidi nke ịkpọ asị dị nʼetiti anyị. 15Ọ bụ nʼime anụ ahụ ya ka ọ mere ka iwu ahụ na ụkpụrụ ya niile ghara ịdị ire. Ebumnobi ya bụ i kee nʼime onwe ya otu onye ọhụrụ site na mmadụ abụọ ahụ, si otu a mee ka udo dịrị. 16Nʼụzọ dị otu a ka ọ ga-esi kpeziere anyị na Chineke site nʼobe ya, wetakwa nʼisi ngwụcha, iro dị nʼetiti ha abụọ. 17Ya mere, ọ bịara kwusaa udo nye unu ndị nọ ebe dị anya na unu ndị nọ nso, 18Nʼihi na anyị abụọ sitere nʼaka ya nweta nnabata anyị ịbịa nʼihu Nna site nʼotu Mmụọ ahụ.
Oziọma
30Ndị ozi Jisọs gbara ya gburugburu kọọrọ ya ihe niile ha mere, na ihe niile ha kuziri. 31Nʼoge ahụ, nʼihi na ọtụtụ ndị mmadụ na-abịa na-apụkwa nke mere na ha enweghị ohere iri nri, ọ sịrị ha, “Soronụ m, unu niile, ka anyị ga ebe dị jụụ, zuo ike nwa oge nta.” 32Ya mere ha pụrụ baa nʼime ụgbọ mmiri gaa nʼebe ha ga-anọdụrụ naanị onwe ha. 33Ma ọtụtụ mmadụ ndị hụrụ ha mgbe ha na-apụ matara ha, sitekwara nʼobodo niile dị ebe ahụ gburugburu gbara ọsọ gbaruo ebe ahụ tupu ya na ndị na-eso ụzọ ya abịaruo. 34Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ a ka ha zukọrọ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, nʼihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. Ọ malitekwara izi ha ọtụtụ ihe.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike