Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 16 Julaị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 16 Julaị 2027

Fraịdee · Izu nke 15 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 15 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Nne anyị nke Ugwu Kamel · Ncheta a na-ahọrọ

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọpụ 11:10–12:14

10Ọ bụ ezie na Mosis na Erọn mere ihe ebube ndị a nʼihu Fero, ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike, ka ọ hapụ ikwe ka ụmụ Izrel si nʼala ya pụọ. 12:1Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu nʼala Ijipt sị ha, 2“Ọnwa a ga-abụrụ unu isi ọnwa. Ọ ga-abụ ọnwa mbụ nke ọnwa niile nʼafọ unu. 3Gwa ọgbakọ ụmụ Izrel niile okwu sị ha, Nʼafọ ọbụla, nʼabalị iri nke ọnwa a, nwoke ọbụla ga-eweta nwa atụrụ nʼisi ezinaụlọ ọbụla. 4Ezinaụlọ ọbụla nke dịkarịrị nta, nke na-enweghị ike iweta na iricha otu nwa atụrụ, ga-ejekwuru ezinaụlọ ọzọ dịkwa nta, ka ha jikọtaa onwe ha ọnụ weta nwa atụrụ. Ndị ga-ejikọta onwe ha ọnụ aghaghị ibu ụzọ pịa mmadụ ole ha ga-adị nwee ike richaa otu atụrụ. 5Nwa atụrụ a ga-eweta ga-abụ oke gbara naanị otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla nʼahụ ya. Unu nwere ike họrọ atụrụ maọbụ ewu. 6Unu ga-elekọta ya anya ruo nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa a. Nʼabalị ụbọchị ahụ ka ọgbakọ Izrel niile ga-egbu ya. 7Ha ga-ewere ọbara ya tee nʼelu na nʼakụkụ ibo ọnụ ụzọ nke dị nʼezinaụlọ ha niile, ebe ha ga-anọ rie anụ atụrụ ahụ. 8Ha ga-eri anụ atụrụ a, nke a ga-ahụ nʼọkụ nʼabalị ahụ, ya na achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ndụ na-elu ilu. 9A gaghị eri nwa atụrụ ọbụla na ndụ, a gaghị esikwa ya esi, kama a ga-ahụ ya nʼọkụ. A ga-ahụ akụkụ ahụ nwa atụrụ ọbụla nʼọkụ, tinyere isi ya, ụkwụ ya na ihe dị nʼime afọ ya. 10Unu agaghị erifọdụ ya ruo nʼụtụtụ echi ya. Nke ọbụla ga-afọdụ nʼabalị ahụ, a ga-akpọ ya ọkụ. 11Otu a ka unu ga-esi rie ya: yirinụ uwe unu, na akpụkpọụkwụ unu. Jirikwanụ mkpara unu. Jikerenụ dịka ndị na-aga njem dị anya. Unu ga-eri anụ atụrụ a na achịcha na-ekoghị eko ngwangwa. A ga-akpọ oriri a Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị. 12“Aga m agafe nʼala Ijipt nʼabalị ahụ, igbu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ, ma anụmanụ. Aga m emekwa ka ikpe ọmụma bịakwasị chi ndị ọzọ ahụ niile Ijipt na-efe ofufe. Abụ m Onyenwe anyị. 13Ọbara ahụ unu ga-ete nʼọnụ ibo ụlọ unu ga-abụ ihe ama igosi ebe unu bi, nʼihi na mgbe m hụrụ ọbara ahụ, aga m agafe unu. Ọ nwekwaghị ihe otiti ga-abịakwasị unu mgbe m ga-egbu ndị Ijipt. 14“Ụbọchị a ga-abụrụ unu ihe ncheta nye ọgbọ niile ndị na-eso nʼazụ. Unu ga-emekwa ya ka ọ bụrụ mmemme nye Onyenwe anyị. Ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 116:12–13, 15–18

12Gịnị ka m ga-enyeghachi Onyenwe anyị nʼihi mmeso ọma niile o mesoro m? 13Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. 15Ọnwụ nke ndị nsọ ya dị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị. 16O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị; abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị; ị zọpụtala m site na agbụ e kere m. 17Aga m achụrụ gị aja ekele kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. 18Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ kwụghachi Onyenwe anyị nkwa m kwere,

Oziọma

Mat 12:1–8

1Nʼoge ahụ, Jisọs sitere nʼubi a kụrụ ọka na-agafe nʼụbọchị izuike. Ma ebe agụụ na-agụ ndị na-eso ụzọ ya, ha malitere ịghọ ogbe ọka, na ịta mkpụrụ ya. 2Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha sịrị ya, “Lee, ndị na-eso ụzọ gị na-eme ihe na-ezighị ezi ime nʼụbọchị izuike!” 3Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtaghị ihe Devid na ndị ya na ha soo mere mgbe agụụ na-agụ ha? 4Otu o si banye nʼụlọ Chineke, ya na ndị so ya, rie achịcha a na-eche nʼihu Chineke, nke na-ezighị ezi nʼiwu ka ha rie, kama ọ dịịrị naanị ndị nchụaja iri ya. 5Ka ọ bụ na unu agụtabeghị ebe e dere ya nʼime akwụkwọ iwu Mosis na ndị nchụaja na-emerụ ụbọchị izuike nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ma ọ dịghị onye na-ata ha ụta? 6Ma ana m agwa unu na onye dị ukwuu karịa ụlọnsọ ukwu nọ nʼebe a. 7Ọ bụrụ na unu ghọtara ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu mgbe ọ na-asị, ‘Ana m achọ ebere, ọ bụghị aja.’ Unu agaraghị ama ndị ikpe na-amaghị ikpe. 8Nʼihi na Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe ụbọchị izuike.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike