Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 15 Julaị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 15 Julaị 2027

Tọọzdee · Izu nke 15 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 15 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Bonaventure, Bishọp na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọpụ 3:13–20

13Ma Mosis jụrụ Chineke sị, “Ọ bụrụ na m agwa ụmụ Izrel sị, ‘Chineke nna nna unu zitere m izi unu ozi,’ ha ga-ajụ m sị, ‘Gịnị bụ aha ya?’ Gịnị ka m ga-aza ha?” 14Chineke sịrị Mosis, “ABỤ M ONYE M BỤ. Naanị gwa ụmụ Izrel na ‘ABỤ M zitere gị.’ ” 15Chineke gakwara nʼihu gwa Mosis sị, Si otu a gwa ụmụ Izrel okwu. “ Onyenwe anyị, Chineke nna nna unu, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik na Chineke Jekọb, zitere m ịbịakwute unu.” Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, aha nke e ji echeta m site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 16“Gaa, kpọkọta ndị okenye Izrel niile zie ha sị, ‘ Onyenwe anyị Chineke nna nna unu, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik, na Chineke Jekọb, egosila m onwe ya, sị m, Eleruola m ọnọdụ unu anya hụ ihe a na-eme unu nʼala Ijipt. 17Ekweela m nkwa ịkpọpụta unu site nʼahụhụ unu na-ahụ nʼala Ijipt duru unu baa nʼala nke ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus bi nʼime ya. Ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.’ 18“Ndị okenye Izrel ga-anabata ozi gị. Mgbe ahụ gị na ha ga-eso gaa nʼihu eze Ijipt gwa ya sị, ‘ Onyenwe anyị, Chineke ndị Hibru ezutela anyị. Kwere ka anyị gaa njem nʼime ọzara abalị atọ gaa chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja.’ 19Amaara m rịị na eze Ijipt agaghị ekwe ka unu gaa, tutu ruo mgbe e ji aka ike kwagide ya. 20Ma aga m esetipụ aka m tie Ijipt ihe otiti, site nʼihe ịrịbama dị iche iche nke m ga-eme nʼetiti ya. Mgbe nke a gasịrị, ọ ga-ahapụ unu ka unu laa.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 105:1, 5, 8–9, 24–27

1Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya. Meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ. 5Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ, ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile si nʼọnụ ya pụta, 8Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi, bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ, 9ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik. 24Onyenwe anyị mere ka ndị ya mụbaa nke ukwuu; o mere ka ndị ya dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị iro ha, 25ndị ọ tụgharịrị obi ha ka ha kpọọ ndị ya asị, ka ha gbaa izu nzuzo megide ndị ohu ya. 26O zipụrụ Mosis, ohu ya, na Erọn, onye ọ họpụtara. 27Ha mere ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche nʼetiti ha, ọrụ ebube ya dị iche iche nʼala Ham.

Oziọma

Mat 11:28–30

28“Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike. 29Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike. 30Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike