Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 16 Julaị
Kalenda Ọtọdọks · 3 Julaị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 16 Julaị 2027
Fraịdee · Izu nke 4 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Martyr Hyacinth of Cæsarea in Cappadocia († 108)
Ụbọchị obubu ọnụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
25Ụmụnna m, achọrọ m ka unu mata ihe omimi a, ka unu ghara ịnya isi. Nnupu isi ụfọdụ ụmụ Izrel agaghị adịgide kama ọ ga-adị ruo nʼoge ọnụọgụgụ ndị mba ọzọ a ga-anabata zuru. 26Mgbe ahụ, a ga-azọpụta Izrel niile. Dịka e dere ya, “Onye nzọpụta ga-esite na Zayọn bịa. Ọ ga-eme ka Jekọb site na ndụ asọpụrụghị Chineke chigharịa. 27Nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị nʼetiti mụ na ha, mgbe m wepụrụ mmehie ha niile.” 28Nʼihe banyere oziọma, ha bụ ndị iro nke Chineke nʼihi unu. Ma a bịa nʼihe gbasara nhọpụta, ha bụ ndị nke a hụrụ nʼanya nʼihi ndị nna nna ha. 29Nʼihi na enye anarakwa adịghị nʼonyinye nakwa ọkpụkpọ Chineke. 30Unu onwe unu ndị na-enupuru Chineke isi na mbụ, anatala ebere ya ugbu a, nʼihi nnupu isi ha. 31Otu a ka ọ dịkwa, ha bụ ndị na-enupu isi ugbu a ka ha nwe ike soro unu keta oke site nʼebere Chineke meere unu. 32Nʼihi na Chineke enyefeela onye ọbụla nʼaka nnupu isi, ka o si otu a gosi mmadụ niile obi ebere ya. 33Leenụ ka o si dị omimi bụ akụ ahụ Chineke nwere! Lee ka ịba ụba nke amamihe ya na ihe ọmụma ya siri dị ukwuu! Apụghị ịchọpụta ikpe ya niile, ụzọ ya niile bụkwa ihe apụghị ịchọpụta. 34“Onye maara uche Onyenwe anyị? Ma ọ bụ onye bụ onye ahụ na-enye ya ndụmọdụ?” 35“Onye burula ụzọ nye Chineke ihe, nke ga-eme ka Chineke kwụghachi ya?” 36Nʼihi na ihe niile sitere nʼime ya, sitekwa nʼaka ya, dịkwara ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi! Amen.
Oziọma
1Nʼoge ahụ, Jisọs sitere nʼubi a kụrụ ọka na-agafe nʼụbọchị izuike. Ma ebe agụụ na-agụ ndị na-eso ụzọ ya, ha malitere ịghọ ogbe ọka, na ịta mkpụrụ ya. 2Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha sịrị ya, “Lee, ndị na-eso ụzọ gị na-eme ihe na-ezighị ezi ime nʼụbọchị izuike!” 3Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtaghị ihe Devid na ndị ya na ha soo mere mgbe agụụ na-agụ ha? 4Otu o si banye nʼụlọ Chineke, ya na ndị so ya, rie achịcha a na-eche nʼihu Chineke, nke na-ezighị ezi nʼiwu ka ha rie, kama ọ dịịrị naanị ndị nchụaja iri ya. 5Ka ọ bụ na unu agụtabeghị ebe e dere ya nʼime akwụkwọ iwu Mosis na ndị nchụaja na-emerụ ụbọchị izuike nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ma ọ dịghị onye na-ata ha ụta? 6Ma ana m agwa unu na onye dị ukwuu karịa ụlọnsọ ukwu nọ nʼebe a. 7Ọ bụrụ na unu ghọtara ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu mgbe ọ na-asị, ‘Ana m achọ ebere, ọ bụghị aja.’ Unu agaraghị ama ndị ikpe na-amaghị ikpe. 8Nʼihi na Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe ụbọchị izuike.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 3 Julaị na kalenda nzukọ bụ 16 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike