Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 17 Julaị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 17 Julaị 2027
Satọdee · Izu nke 15 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 15 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
37Mgbe nke a gasịrị, ụmụ Izrel malitere ije ha site na Ramesis. Mgbe ha hapụrụ Ramesis, na-eje Sukọt, ha dị narị puku ndị ikom isii, na-agụghị ndị inyom na ụmụntakịrị. 38Ọtụtụ mmadụ dị iche iche sooro ha nʼije ha. Ha dukwa igwe anụ ụlọ, igwe ewu na atụrụ ha, nke dị ukwu nʼọnụọgụgụ. 39Ha ji ụtụ ọka ha si Ijipt buputa mee achịcha na-ekoghị eko. Nʼihi na a chụpụrụ ha achụpụ site nʼIjipt, ha enweghị ezi ohere kwadooro onwe ha ihe oriri. 40Tupu ha ahapụ ala Ijipt, ụmụ Izrel ebiela nʼebe ahụ narị afọ anọ na iri afọ atọ. 41Mgbe narị afọ anọ na iri afọ atọ zuru, nʼụbọchị ahụ o zuru, usuu ndị Onyenwe anyị niile hapụrụ Ijipt. 42Onyenwe anyị chere nche nʼabalị ụbọchị ahụ maka ịkpọpụta ha site nʼala Ijipt. Nʼihi ya, abalị ụbọchị ahụ bụ mgbe pụrụ iche nye ụmụ Izrel maka iji iche nche sọpụrụ Onyenwe anyị nʼọgbọ ha niile.
Abụ Ọma nzaghachi
1Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 23Onye chetara anyị mgbe anyị na-adịghị ike, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 24Mee ka anyị nwere onwe anyị site nʼaka ndị iro anyị, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 10Onye ahụ tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼIjipt, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 11O duuru ndị Izrel site nʼIjipt pụta, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 12O ji aka ya dị ike nke o setịpụrụ esetipụ dupụta ha; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 13Onye ahụ kewara Osimiri Uhie abụọ, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 14Onye duuru ndị Izrel gafee nʼetiti ya, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 15Ma Osimiri Uhie riri Fero na ndị agha ya niile; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Oziọma
14Nʼihi nke a ndị Farisii sitere nʼebe ahụ pụọ, ga gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya. 15Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-ezube ime, o sitere nʼebe ahụ pụọ. Ma ọtụtụ ndị mmadụ sooro ya. Ọ gwọkwara ha nrịa nrịa ha niile. 16Ma o nyere ha iwu ka ha hapụ ịgwa ndị ọzọ onye ọ bụ. 17Nke a bụ ka emezuo okwu ahụ Aịzaya onye amụma kwuru, 18“Onye a bụ onye na-ejere m ozi, onye m họpụtara. Onye m hụkwara nʼanya. O bụkwa onye ihe ya na-atọ m ụtọ. Aga m etinye Mmụọ m nʼime ya. Ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka. 19Ọ gaghị ese okwu, ọ gaghị etisikwa mkpu ike. O nweghị onye ga-anụ olu okwu ya nʼezi. 20Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi azọpịara nʼala, maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị, tutu ruo mgbe ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi merie. 21Ọ bụkwa nʼaha ya ka mba niile dị nʼụwa ga-atụkwasị olileanya ha.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike