Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 12 Julaị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 12 Julaị 2027

Mọnde · Izu nke 15 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Mọnde nke izu nke 15 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọpụ 1:8–14, 22

8Ma mgbe eze ọhụrụ nke na-amaghị Josef malitere ịchị ọchịchị nʼala Ijipt, 9ọ sịrị ndị ya, “Lee, ndị Izrel abaala ụba nke ukwuu nʼọnụọgụgụ dịkwa ike karịa anyị. 10Ngwanụ, ka anyị were amamihe meso ha mmeso ọjọọ, ma ọ bụghị otu a, ha ga-amụba karịa, mgbe agha ga-adapụta nʼetiti anyị na ndị iro anyị, ha ga-esoro ndị iro anyị lụso anyị agha, site nʼala a gbapụ.” 11Nʼihi nke a, ha tinyere ndịisi ohu ga na eledo ha, bụ ndị ga-eji ọrụ mmanye kpagbuo ha. Ha wuuru Fero obodo Payitọm na Ramesis, ebe ọ na-echekwa ihe. 12Ma dịka a na-ata ụmụ Izrel ahụhụ na-eleghị anya nʼazụ, otu a kwa ka ụmụ Izrel gara nʼihu na-amụba nʼọnụọgụgụ na-agbasakwa. Nke a mere ka ndị Ijipt tụọ ndị Izrel egwu. 13Ha ji oke ọrụ mekpaa ụmụ Izrel ahụ nke ukwuu, 14mee ka ndụ ụmụ Izrel bụrụ ndụ jupụtara nʼihe ilu. Ha nyere ha ọrụ ike nke ịkpụ brik na ụrọ, tinyere ọrụ dị iche iche nʼubi ha. Nʼime ọrụ niile ha na-arụ, ndị Ijipt mesiri ha ike nke ukwuu. 22Mgbe ahụ, Fero nyere ndị ya niile iwu a, “A ga-atụnye ụmụntakịrị ndị ikom Hibru niile a mụrụ ọhụrụ nʼime osimiri Naịl, ma a ga-edebe ụmụntakịrị ọhụrụ bụ ndị inyom ndụ.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 124:1–8

1Abụ nrigo. Nke Devid. A sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, ka Izrel kwuo, 2a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị, 3mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị, ha gaara eloda anyị na ndụ; 4idee mmiri gaara iri anyị, oke mmiri gaara ebufu anyị, 5ebili mmiri niile gaara ebufu anyị. 6Ma otuto dịrị Onyenwe anyị, onye na-ekweghị ka ha jiri eze ha dọrie anyị. 7Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya; ọnya ahụ agbajiela, anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị. 8Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa.

Oziọma

Mat 10:34–11:1

34“Unu echekwala na m bịara iweta udo nʼụwa. Abịaghị m iweta udo, kama ọ bụ iwebata mma agha. 35Abịara m ime, “ ‘Ka nwoke megide nna ya, ka nwa nwanyị megide nne ya, ka nwunye nwa megide nne di ya, 36ndị iro mmadụ ga-abụ ndị ezinaụlọ ya.’ 37“Ọ bụrụ na ị hụrụ nne gị maọbụ nna gị nʼanya karịa m, i kwesighị ịbụ onye nke m. Ọ bụrụ na ị hụrụ nwa gị nwoke, maọbụ nwa gị nwanyị nʼanya karịa m, i kwesighị ịbụ onye nke m. 38Onye ọbụla na-eburughị obe ya soro m, ekwesighị ị bụ onye nke m. 39Onye ọbụla chọtara ndụ ya ga-etufu ya, ma onye ọbụla tufuru ndụ ya maka m, ga-achọtakwa ya. 40“Ndị niile nabatara unu na-anabata m. Mgbe ha nabatara m, ọ bụkwa Onye ahụ zitere m ka ha na-anabata. 41Ọ bụrụ na unu anabata onye amụma nʼihi na ọ bụ onye amụma, unu na onye amụma ahụ ga-enwekọ otu ụgwọ ọrụ. Ọ bụrụkwa na unu anabata onye ezi omume nʼihi ezi omume ya, unu ga-esorokwa ya nata ụgwọ ọrụ nke onye ezi omume. 42Ọ bụrụ na onye ọbụla ekunye otu nʼime ndị a na-eso ụzọ m mmiri oyi ka ọ ṅụọ, nʼihi na ọ bụ onye na-eso ụzọ m, nʼezie, asị m unu, ọ ghaghị ịnata ụgwọ ọrụ ya.” 11:1Mgbe Jisọs nyesịrị ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ ndị a, ọ hapụrụ ebe ahụ pụọ. Bido na-ejegharị nʼobodo dị iche iche na-ezisa oziọma.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike