Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 11 Julaị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 11 Julaị 2027
Sọnde · Izu nke 15 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 15 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
12Mgbe ahụ, Amazaya gwara Emọs, “Gị onye ọhụ ụzọ, gbara ọsọ gbalaa ala Juda. Jee nʼebe ahụ, rie achịcha nke sitere nʼibu amụma gị, nọrọkwa nʼebe ahụ buo amụma gị. 13Ebula amụma ọzọ na Betel, nʼihi na ọ bụ ebe nsọ nke eze, ọ bụkwa ụlọnsọ ukwu nke alaeze ya.” 14Mgbe ahụ, Emọs zaghachiri Amazaya, “Ọ dịghị mgbe m bụ onye amụma, abụkwaghị m nwa onye amụma, kama abụ m onye na-elekọta igwe ewu na atụrụ, na onye ọrụ na-azụ osisi sikamọ. 15Ma Onyenwe anyị sitere nʼebe ịzụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta m, Onyenwe anyị sịrị m: ‘Gaa buoro ndị m Izrel amụma.’
Abụ Ọma nzaghachi
8Aga m ege ntị mara ihe Chineke, onye bụ Onyenwe anyị ga-ekwu; ọ na-ekwe ndị ya, ndị nsọ ya nkwa udo, ma ka ha ghara ịlọghachi na nzuzu. 9Nʼezie, nzọpụta ya dị nso ndị na-atụ egwu ya, ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị. 10Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala; ezi omume na udo esutula ọnụ. 11Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta, ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya. 12Nʼezie, Onyenwe anyị ga-enye ihe dị mma, ala anyị ga-amịkwa mkpụrụ ubi ya. 13Ezi omume ga-aga nʼihu ya, idoziri ya ụzọ ọ ga-esi gaa.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
3Ka otuto dịrị Chineke, na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ onye gọziri anyị site nʼinye anyị ngọzị niile nke ime mmụọ nke si nʼebe niile nke eluigwe nʼime Kraịst. 4Dịka o si họpụta anyị nʼime Kraịst tupu a tọọ ntọala ụwa, ka anyị bụrụ ndị dị nsọ na ndị na-enweghị ịta ụta nʼihu ya nʼịhụnanya. 5O kpebiri ime anyị ụmụ ya site nʼihi Kraịst Jisọs. Ma o mekwara ihe ndị a niile nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ nʼobi, bụrụkwa ihe o zubere ime. 6Ka e si otu a too ịdị ebube nke amara ya, nke o ji obi ya niile nye anyị nʼime Onye ahụ ọ hụrụ nʼanya. 7Nʼime ya, anyị nwere mgbapụta site nʼọbara ya, bụ mgbaghara nke njehie niile anyị; dị ka ịba ụba nke amara ya si dị, 8nke o mere ka ọ babigara anyị ụba oke site nʼamamihe na nghọta niile. 9O meela ka anyị mata ihe omimi nzube ya, dị ka o si tọọ ya ụtọ, bụ ihe omimi o zubere ime nʼime Kraịst. 10Nke ọ ga-eme ka o mezuo mgbe oge ya niile zuru, nke bụ ịchịkọta ihe niile nʼime ya, bụ ihe ndị dị nʼeluigwe na nʼụwa nʼokpuru Kraịst. 11Nʼime Kraịst ka e mere anyị ndị nketa, ndị e bururị ụzọ họpụta na mbụ, dị ka atụmatụ onye ahụ na-arụpụta ihe niile nʼizuoke nke nzube na ebumnuche ya. 12Nke mere na anyị, ndị buuru ụzọ nwee olileanya na Kraịst, ga-ebi ndụ nʼotuto nke ebube ya. 13Unu bụkwa ndị a gụnyere nʼime Kraịst mgbe unu nụrụ ozi nke eziokwu ahụ bụ oziọma nke nzọpụta. Mgbe unu kwenyere, a kara unu akara nʼime ya bụ akara nke nkwa ahụ bụ Mmụọ Nsọ. 14Nke a bụ ihe nketa anyị tutu ruo mgbe a rụzuru ọrụ mgbapụta nke ndị ahụ niile bụ ihe nweta Chineke. Ka e si otu a too ebube ya.
Oziọma
7Ọ kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ya, nye ha ikike zipụ ha, abụọ abụọ. O nyere ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha. 8Ndị a bụ iwu o nyere: “Unu ewerekwala ihe ọbụla maka njem a, karịkwa mkpanaka. Unu ewela achịcha, maọbụ akpa, unu etinyela ego ọbụla nʼime belịt unu. 9Yirinụ akpụkpọụkwụ unu, unu eyikwala karịa otu uwe. 10Mgbe ọbụla unu banyere nʼụlọ ọbụla, nọgidenụ nʼebe ahụ ruo mgbe unu hapụrụ obodo ahụ. 11Ma ọ bụrụ na obodo ọbụla anabataghị unu maọbụ egeghị unu ntị, kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu mgbe unu na-apụ, ka ọ bụrụ ihe ama megide ha.” 12Ha pụrụ kwusara ndị mmadụ ka ha chegharịa. 13Ha chụpụrụ ọtụtụ mmụọ ọjọọ, teekwa ọtụtụ ndị ahụ na-esighị ike mmanụ, gwọọ ha.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Benedikt, Onyeisi ndị mọnk
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike