Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 12 Julaị

Kalenda Ọtọdọks · 29 Jun (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 12 Julaị 2027

Mọnde · Izu nke 4 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

The Holy Glorious and All-Praised Leaders of the Apostles, Peter and Paul

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

1Pt 1:3–9

3Otuto dịrị Chineke Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst! Site nʼịba ụba nke ebere ya, o nyela anyị ndụ ọhụrụ baa nʼolileanya dị ndụ site na mbilite nʼọnwụ Jisọs Kraịst. 4Anyị nwekwara ihe nketa nke na-apụghị imebi emebi, nke na-agaghị ere ure, maọbụ gbanwee ụdịdị ya, nke e debeere anyị nʼeluigwe. 5Anyị bụ ndị e sitere nʼokwukwe na-echekwa nʼike Chineke, tutu ruo ọbịbịa nzọpụta ahụ, nke a na-ejikere ime ka ọ pụta ìhè nʼọgwụgwụ oge. 6Nʼime ihe ndị a ka unu na-aṅụrị oke ọṅụ, ọ bụ ezie na nʼoge ndị a dị nta, unu agabigala ọtụtụ ihe mgbu nʼihi ụdị ọnwụnwa dị iche iche bịakwasịrị unu. 7Ọnwụnwa ndị a na-abịa ime ka okwukwe unu, nke dị oke ọnụahịa karịa ọlaedo na-ala nʼiyi nʼagbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya; bụrụ nke ga-eweta otuto, na ebube, na nsọpụrụ, mgbe e mere ka Jisọs Kraịst pụta ìhè. 8Ọ bụ ezie na unu ejibeghị anya unu hụ ya mgbe ọbụla, ma unu hụrụ ya nʼanya, ọ bụkwa ezie na unu adịghị ahụ ya anya ugbu a, ma unu kwere na ya. Unu jupụtakwara nʼọṅụ ahụ dị ebube nke ọnụ na-apụghị ịkọwa. 9Ụgwọ ọrụ ọzọ unu ga-enweta nʼihi okwukwe unu nʼime ya ga-abụ nzọpụta a ga-azọpụta mkpụrụobi unu.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

1Pt 1:13–19

13Nʼihi ya, werenụ uche unu niile jikere ịrụ ọrụ, anya dokwaa unu. Nweenụ olileanya zuruoke nʼamara nke a ga-ewetara unu mgbe a ga-ekpughe Jisọs Kraịst. 14Dị ka ụmụ na-erube isi, unu ekwela ka ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ unu agụụ mgbe unu nọ nʼọchịchịrị, na-achị ndụ unu. 15Kama bụrụnụ ndị dị nsọ nʼihe niile unu na-eme, dịka onye kpọrọ unu si dị nsọ. 16Nʼihi na e dere ya ede, “Dịnụ nsọ, nʼihi na adị m nsọ.” 17Ebe unu na-akpọku Nna ahụ na-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya sịrị dị na-eleghị mmadụ anya nʼihu, bienụ ndụ unu nʼịtụ egwu Chineke, dịka ndị mbịarambịa nʼụwa a. 18Nʼihi na unu matara na-ejighị ihe pụrụ imebi emebi, dịka ọlaọcha na ọlaedo gbapụta unu site nʼibi ndụ ọjọọ ahụ nna nna unu ha nyefere unu nʼaka 19kama ọ bụ ọbara dị oke ọnụahịa nke Kraịst bụ nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ ọbụla maọbụ ọrụsị.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

1Pt 2:11–24

11Nʼihi ya, ndị enyi m, ana m arịọ unu, dịka ndị bụ ọbịa na ndị na-agba ọsọ ndụ nʼụwa a, nke unu bụ, na-asị unu, wezuganụ onwe unu site nʼagụụ mmehie nke na-ebuso mkpụrụobi unu agha. 12Bienụ ezi ndụ nʼetiti ndị mba ọzọ, ka ọ ga-abụ na a sị na ha ebo unu ebubo ime ihe ọjọọ, ha ga-ahụ ọrụ ọma unu, ma nye Chineke otuto nʼụbọchị ahụ ọ ga-abịa. 13Werenụ onwe unu nyefee, nʼihi Onyenwe anyị, nʼokpuru ọchịchị niile e guzobere nʼetiti ụmụ mmadụ, ma ọchịchị ahụ ọ bụ nke eze, dịka onye ike ya kacha nke ibe ya, 14maọbụ nke ọchịchị gọvanọ, onye e guzobere nʼihi ịta ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ, na ito ndị na-eme ezi ihe otuto. 15Nʼihi na ọ bụ uche Chineke na unu ga-esite nʼezi ọrụ unu kpuchie ọnụ ndị ahụ na-esite na-amaghị ihe ha, na-ekwu okwu nzuzu. 16Na-ebinụ ndụ dị ka ndị nwere onwe ha, ma unu ejikwala mnwere onwe unu mere ihe mkpuchi nke ajọ ihe. Bienụ dịka ụmụodibo Chineke. 17Sọpụrụnụ mmadụ niile dịka o si kwesi. Gosi ndị niile kwere ekwe ịhụnanya. Tụọ Chineke egwu, ma na-asọpụrụ eze. 18Ndị ohu, ruberenụ ndị nwe unu isi, na-enyekwa ha nsọpụrụ na ugwu ruuru ha. Unu emela nke a nye naanị ndị bụ ezi mmadụ, na ndị nwere obiọma nʼebe unu nọ, kama meekwanụ ya ọ bụladị nye ndị afọ tara mmiri. 19Nʼihi na nke a bụ ihe inye ekele ma ọ bụrụ na unu ejiri ntachiobi na-edi ahụhụ na-ezighị ezi na-adakwasị unu, nʼihi na unu na-eme ihe Chineke na-achọ. 20Ma o nweghị otuto ọbụla dịrị unu mgbe a tara unu ahụhụ nʼihi na unu mejọrọ, unu na-edikwa ya? Ma ọ bụrụ na unu enwee ntachiobi mgbe a na-ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọma unu na-eme, nke a na-ewetara Chineke otuto. 21Ọ bụ nʼihi ihe dị otu a, ka e jiri kpọọ unu, nʼihi na Kraịst hụrụ ahụhụ nʼihi unu. Ọ bụkwa ihe ịmaatụ nye unu. Na-esonụ nzọ ụkwụ ya. 22“O nweghị mgbe ọbụla o mehiere, o nwekwaghị mgbe onye ọbụla nụrụ okwu aghụghọ nʼọnụ ya.” 23O kwutọghị onye ọbụla mgbe ha na-ekwutọ ya. Ọ baghị mba ọbụla mgbe ha na-ata ya ahụhụ, kama o were ya nyefee nʼaka onye ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi. 24Nʼelu obe ahụ, o buuru mmehie anyị niile bokwasị onwe ya mgbe ọ nwụrụ, ime ka anyị nwee ike ịbụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị; ma dịrị ndụ nʼebe ezi omume dị. Ọ bụkwa site nʼapa ọnya dị ya nʼahụ ka o ji gwọọ unu.

Ofufe ụtụtụ: Oziọma

Jọn 21:15–25

15Mgbe ha risiri nri ụtụtụ, Jisọs sịrị Saimọn Pita, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya karịa ndị a niile?” Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” 16Jisọs sịrị ya nke ugboro abụọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Ọ sịrị ya, “Na-elekọta atụrụ m.” 17Ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” O wutere Pita na ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị mazuru ihe niile, ị makwaara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ atụrụ m. 18Nʼezie, nʼezie asị m gị, mgbe ị bụ okorobịa ị na-eke ajị nʼukwu, gaa ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi, ị ga-esetipụ aka gị, onye ọzọ ga-ekee gị ihe okike nʼukwu ma duru gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.” 19O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ iji nye Chineke otuto. Mgbe nke a mesịrị, ọ sịrị ya, “Soro m.” 20Pita chigharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya ka ọ na-esokwa ha nʼazụ. (Ọ bụ onyeozi ahụ dabeere ya nʼobi na nri anyasị, nke sịrị, “Onyenwe anyị, onye ga-arara gị nye?”) 21Mgbe Pita hụrụ ya, ọ sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị kedụ maka onye a?” 22Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụ nye gị? Soro m.” 23Ya mere, akụkọ a gbasara nʼetiti ụmụnna na onye a na-eso ụzọ ya agaghị anwụ. Ma Jisọs asịghị ya na ọ gaghị anwụ anwụ, kama, “Ọ bụrụ na m chọrọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ gbasara gị?” 24Nke a bụ onye ahụ na-eso ụzọ ya onye na-agba ama ihe ndị a niile, ma deekwa ha nʼakwụkwọ. Anyị makwaara na ama ya bụ eziokwu. 25Ma ọ dị ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jisọs mere. Ọ bụrụ na e dee ha niile nʼakwụkwọ, ọ dịghị m ka ụwa niile ọ ga-aba akwụkwọ a ga-ede banyere ha.

Akwụkwọ ozi (maka ndị ozi)

2Kọ 11:21–12:9

21Nʼezie, ọ bụ ihere m, ịnabata na anyị bụ ndị na-adịghị ike nʼezie nye nke a. Ọ bụrụ na onye ọbụla anwaa anwaa nyaa isi nʼihe ọbụla (ana m ekwu dịka onye nʼenweghị uche), mụ onwe m ga-anyakwa isi. 22Ha bụ ndị Hibru? Mụ onwe m bụkwa ya. Ha bụ ndị Izrel? Mụ onwe m bụkwa ya. Ha bụ ndị agbụrụ Ebraham? Mụ onwe m bụkwa. 23Ha bụ ndị na-ejere Kraịst ozi? (Ana m ekwu dịka onye anya na-adịghị mma.) Ma mụ onwe m ejela ozi karịa. Adọgbuola m onwe m nʼọrụ karịa ha niile. Etinyela m nʼụlọ mkpọrọ ọtụtụ mgbe, tinyere ọtụtụ ihe otiti, mgbe mgbe anọọla m nʼọnụ ọnwụ. 24Ugboro ise ka ndị Juu pịara m ọnụ ụtarị iri anọ e wepụrụ otu. 25E jirila okporo igwe tie m ugboro atọ. Atụrụ m nkume otu ugboro. Ugboro atọ ka ụgbọ mmiri m nọ nʼime ya kpuru nʼoke osimiri. Anọọla m otu abalị na ụbọchị so ya nʼelu oke osimiri ebe mmiri na-ebugharị m. 26Ejeela m ọtụtụ ogologo ije nke ọtụtụ ihe ize ndụ dị nʼime ya. Nʼize ndụ site nʼosimiri, ize ndụ site na ndị na-apụnarị mmadụ ihe nʼike, ize ndụ site nʼaka ndị obodo nke aka m. Ọtụtụ mgbe ka m zere ndụ site nʼaka ndị mba ọzọ, nʼime obodo ukwu, nʼọzara ma nʼoke osimiri; na nʼaka ndị kpọrọ onwe ha ụmụnna m, ma ha bụ ndị ụgha. 27Adọgbuola m onwe m nʼọrụ, anọọla m nʼọnọdụ ịhụju anya na ịmụ anya ọtụtụ abalị. Ọtụtụ mgbe ana m anọ agụụ na-erighị ihe ọbụla, maọbụ ịṅụ ihe ọbụla. Anọọla m ọtụtụ mgbe nʼoge oyi na-ama jijiji nʼihi enweghị uwe dị mma m ji achụ oyi. 28Ma e wezuga ihe ndị a niile, ana m anọ nʼechiche mgbe niile banyere otu ihe niile si aga nʼime nzukọ. 29Onye bụ onye ahụ na-adịghị ike nke m na-adịghị eso ya kere oke na-adịghị ike ya? Onye ka e dubara na mmehie nke ọnọdụ ya na-adịghị emetụ m nʼobi? 30Kama ọ bụrụ na o kwesiri ka m nyaa isi aga m anya isi banyere ihe ndị ahụ na-egosi adịghị ike m. 31Chineke, na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs, onye e kwesiri ito aha ya ruo mgbe ebighị ebi, maara na ihe ndị a niile m na-ekwu bụ eziokwu. 32Nʼobodo Damaskọs, onye ọchịchị ala ahụ nke eze obodo ahụ a na-akpọ Aretas họpụtara, ndị na-eche obodo Damaskọs nche ka ha jide m. 33Ma e tinyere m nʼime nkata, site nʼoghere dị na mgbidi gbara obodo ahụ gburugburu wedata m, m gbanarị ya. 12:1Aghaghị m ịnya isi, ọ bụ ezie na ọ baghị uru, ugbu a ka m gwa unu ihe banyere ọhụ m hụrụ, na ihe niile Onyenwe anyị kpughere gosi m. 2Amaara m otu nwoke nọ nʼime Kraịst, onye e duuru gaa nʼeluigwe nke atọ ihe dị ka afọ iri na anọ gara aga, maọbụ nʼanụ ahụ, maọbụ nʼime mmụọ amaghị m, ma Chineke ma. 3Amatakwara m nwoke dị otu a, maọbụ nʼanụ ahụ, maọbụ nʼime mmụọ amaghị m, ma Chineke maara 4onye a, nke a kpọọrọ banye na paradaịs, ebe ọ nụrụ ihe ọnụ mmadụ na-apụghị ịkọwa, nke e nyeghịkwa mmadụ ọbụla ike ikwu ihe banyere ya. 5Ekwesiri m ịnya isi nʼihi nwoke dị otu a ma agaghị m anya isi maka mụ onwe m, ma ọ bụghị maka adịghị ike m. 6A sị na m chọrọ ịnya isi, agaghị m abụ onye nzuzu, nʼihi na aga m ekwu naanị eziokwu. Otu ọ dị, agaghị m anya isi ka onye ọbụla ghara ịgụ ọnọdụ m karịa ihe ọ hụrụ nʼime m, maọbụ karịa ihe ọ nụrụ nʼọnụ m. 7Ma nʼihi na ọtụtụ ihe ndị a m ji anya m hụ bụ ihe pụrụ ime ka m bulie onwe m elu karịa ka o si kwesi. E tinyere ihe mgbu nʼanụ ahụ m ka ọ na-adụ m dịka ogwu. Ihe mgbu a dị nʼanụ ahụ m na-eti m aka dịka onyeozi nke ekwensu, na-eme ka m ghara ịfụlị onwe m elu karịa. 8Ekpeela m ekpere ugboro atọ rịọ Onyenwe anyị ka o wepụrụ m ahụ mgbu a. 9Ma ọ sịrị m, “Amara m ezuorola gị. Nʼihi na ike m na-ezu oke nʼime adịghị ike.” Ugbu a, obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nʼihi na ọ bụ site nʼọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nʼahụ m.

Oziọma (maka ndị ozi)

Mat 16:13–19

13Mgbe Jisọs bịaruru obodo a na-akpọ Sizaria Filipai, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke Mmadụ bụ?” 14Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ụfọdụ na-asị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọ na-asịkwa na ị bụ Jeremaya, maọbụ otu nʼime ndị amụma.” 15Ọ jụrụ ha sị, “Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?” 16Saimọn Pita zara sị ya, “Ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.” 17Jisọs gwara ya sị, “Saimọn Pita nwa Jona, ị bụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na anụ ahụ na ọbara ekpugheghị ya nye gị. Kama, ọ bụ Nna m bi nʼeluigwe mere ka ị mata ya. 18Ma mụ onwe m na-agwa gị, na gị onwe gị bụ Pita. Ọ bụkwa nʼelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike niile nke ọkụ ala mmụọ apụghịkwa iguzo megide ya. 19Aga m enye gị mkpisi igodo alaeze eluigwe. Ihe ọbụla ị ga-eke agbụ nʼelu ụwa, ka a ga-ekekwa agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla ị ga-atọpụ nʼagbụ nʼụwa, a ga-atọpụkwa ya nʼeluigwe.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 29 Jun na kalenda nzukọ bụ 12 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike