Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 13 Julaị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 13 Julaị 2027
Tiuzdee · Izu nke 15 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 15 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Henri · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Nʼoge a, otu nwoke onye Hibru si nʼebo Livayị, gakwara lụọ otu nwaada onye Livayị. 2Nwanyị a tụụrụ ime, mụọ otu nwa nwoke. Mgbe ọ hụrụ na nwa ọhụrụ ahụ mara mma, o zoro ya nʼụlọ ọnwa atọ. 3Mgbe ọ na-enweghịkwa ike izo nwantakịrị a gaa nʼihu, o jiri ahịhịa papịrọs kpaa nkata, were korota tee nʼahụ nkata ahụ niile igbochi mmiri ịbata nʼime ya. O kunyere nwantakịrị ahụ nʼime ya buru nkata ahụ debe ya nʼakụkụ osimiri Naịl ebe ahịhịa mmiri na-eto. 4Nwanne nwantakịrị ahụ, nke nwanyị, gakwara guzo nʼebe dị anya na-eche nwantakịrị ahụ nche, ịhụ ihe ga-eme ya. 5Ọ dịghị anya, ada Fero bịara nʼakụkụ osimiri Naịl ahụ ịsa ahụ. Mgbe ọ nọ na-asa ahụ, ụmụ agbọghọ na-ejere ya ozi malitere ịgagharị nʼakụkụ osimiri Naịl. Ma ada Fero lepụrụ anya hụ nkata ahụ nʼetiti riidi, zie otu nʼime ohu ya nwanyị ka ọ gaa bute ya. 6Mgbe o bupụtara ya, meghee ya, ada Fero hụrụ nwantakịrị ahụ ka ọ na-akwa akwa. O nwere ọmịiko nʼebe nwantakịrị ahụ nọ. Ọ sịrị, “Nwatakịrị a ga-abụrịrị otu nʼime ụmụ ndị Hibru.” 7Mgbe ahụ, nwanne nwanyị nwantakịrị a jụrụ ada Fero sị, “Ọ bụ m gaa chọọrọ gị otu nwanyị nʼime ndị inyom Hibru ka ọ na-elekọtaara gị nwantakịrị a anya?” 8Ada Fero zaghachiri sị, “Ee, gaa mee otu ahụ.” Nwaagbọghọ ahụ gara ngwangwa nʼụlọ ha kpọọ nne nwantakịrị ahụ. 9Mgbe ha bịaghachiri, ada Fero gwara nne nwantakịrị ahụ sị ya, “Kuru nwantakịrị a, gaa zụpụtara m ya. Aga m akwụ gị ụgwọ nke ọma.” Ya mere, nwanyị ahụ kuuru nwantakịrị ahụ, gaa zụọ ya. 10Mgbe nwantakịrị ahụ tolitere, nne ya kulaara ya ada Fero, ka ọ bụrụ nwa ada Fero. Aha ada Fero gụrụ ya bụ Mosis, nʼihi ọ sịrị, “Esi m na mmiri gụpụta ya.” 11Otu ụbọchị, mgbe Mosis toro, ọ pụrụ gaa nʼebe ụmụnna ya nọ, ilele ha mgbe ha nọ na-arụ ọrụ ike ha. Ọ hụrụ otu onye Ijipt ka ọ na-eti onye Hibru ihe, bụ otu nʼime ụmụnna ya. 12Mosis lere anya nʼakụkụ abụọ. Mgbe ọ hụrụ na ọ dịghị onye na-ele ya anya, o gburu onye Ijipt ahụ, lie ya nʼime aja. 13Nʼechi ya, Mosis pụrụ hụ ndị Hibru abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Mosis jụrụ onye nke ikpe mara ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji si otu a na-eti nwanna gị ihe?” 14Ma onye ahụ jụrụ Mosis ajụjụ sị, “Onye mere gị onyeisi na onye ikpe nʼetiti anyị? Ị na-achọ igbu m dị ka i si gbuo onye Ijipt ahụ?” Mgbe ahụ Mosis tụrụ ụjọ. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Ndị mmadụ amatala banyere ihe ahụ m mere.” 15Mgbe Fero nụrụ ihe Mosis mere, ọ gbalịrị igbu Mosis. Ma Mosis si nʼihu Fero gbapụ ọsọ gbaga ala Midia. Nʼebe ahụ ọ gara nọdụ ala nʼakụkụ olulu mmiri.
Abụ Ọma nzaghachi
2Ana m emikpu nʼụrụrọ ebe dị omimi, e nwekwaghị ebe ịzọkwasị ụkwụ dị. Abịala m nʼebe mmiri dị omimi; uju mmiri na-achọkwa ikpuchigide m. 13O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị nʼekpere, nʼoge ihuọma gị; na oke ịhụnanya gị, O Chineke m, zaa m nʼeziokwu nke nzọpụta gị. 29Anọ m nʼụfụ na ihe mgbu, O Chineke, mee ka nzọpụta gị kpuchie m. 30Aga m eji ịbụ abụ too aha Chineke, jirikwa ekele bulie ya elu. 32Ndị ogbenye ga-ahụ ya ma ṅụrịakwa ọṅụ; unu ndị na-achọ Chineke, ka obi unu na-adị ndụ. 33Onyenwe anyị na-anụ ekpere ndị nọ na mkpa, ọ naghị eledakwa ndị ya a dọtara nʼagha anya.
Oziọma
20Mgbe ahụ ọ bidoro ịbụ obodo niile ebe ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube ọnụ, nʼihi na obodo ndị a echegharịghị. 21“Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin. Ahụhụ ga-adịkwara gị Betsaida. Nʼihi na a sị na ọ bụ nʼime Taịa na Saịdọn ka a rụrụ ọrụ ebube niile a rụrụ nʼime unu, ha gaara echegharị ma gosikwa nchegharị ha site nʼiyi uwe mkpe na ikpokwasị onwe ha ntụ nʼisi. 22Nʼezie asị m unu na ọ ga-adịrị unu njọ nʼụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Taịa na Saịdọn. 23Ma gị Kapanọm bụ obodo a na-asọpụrụ, a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba, ị ga-arịdaru ọkụ ala mmụọ. Nʼihi na a sị na a rụrụ ọrụ ebube m rụrụ nʼime gị nʼobodo Sọdọm, a garaghị ala ya nʼiyi. Ọ gaara adịrị ruo taa. 24Nʼezie asị m unu, ọ ga-adịrị unu njọ nʼụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Sọdọm.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Henri
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike