Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 10 Julaị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 10 Julaị 2027

Satọdee · Izu nke 14 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 14 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jen 49:29–32; 50:15–26

29Emesịa, o nyere ha ndụmọdụ sị ha, “Nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, aga m anwụ. Unu aghaghị ili m nʼebe e liri nna m ha, nʼala Kenan, nʼime ọgba ahụ dị nʼọhịa Efrọn, onye Het. 30Nʼime ọgba dị nʼọhịa Makipela, nke dị nso na Mamre, nʼala Kenan, ọhịa Ebraham zụtara site nʼaka Efrọn onye Het, maka ili ozu. 31Nʼebe ahụ ka e liri Ebraham na Sera nwunye ya. Nʼebe ahụ kwa ka e liri Aịzik na Ribeka nwunye ya. Nʼebe ahụ ka m liri Lịa. 32Ebraham nna nna m zụrụ ala ahụ na ọgba dị nʼime ya site nʼaka ụmụ Het.” 50:15Mgbe ụmụnne Josef hụrụ na nna ha anwụọla, ha sịrị, “Eleghị anya Josef ga-akpọ anyị asị, kwụghachi anyị ụgwọ ihe ọjọọ niile anyị mere ya?” 16Nʼihi nke a, ha zipụrụ Josef ozi sị, “Nna gị nyere iwu a tupu ọ nwụọ. 17‘Gwa Josef sị ya, Arịọọ m gị, gbaghara ihe ọjọọ niile ụmụnne gị mere, na mmehie ha mere megide gị.’ Ugbu a, gbaghara mmehie anyị bụ ndị ohu Chineke nna gị.” Mgbe Josef nụrụ ihe ha kwuru, ọ kwara akwa. 18Ụmụnne ya bịakwara daa nʼihu ya, sị, “Anyị bụ ndị ohu gị.” 19Ma Josef sịrị ha, “Unu atụla egwu. Abụ m Chineke onye na-ekpe ikpe nke m ga-eji taa unu ahụhụ? 20Ọ bụ ezie na unu chere ime m ihe ọjọọ, ma Chineke chere ya ka ọ bụrụ ezi ihe, iji debe ọtụtụ ndụ dịka ọ na-eme taa. 21Ya mere, ụjọ atụla unu. Mụ onwe m ga-azụ unu na ụmụntakịrị unu.” Ọ kasịrị ha obi, gwa ha okwu bara ha nʼobi. 22Josef biri nʼIjipt, ya na ụmụnne ya, na ndị ụlọ ha. Josef gbara narị afọ na iri. 23Josef hụrụ ụmụ Ifrem, na ụmụ ụmụ ya. Ọ nọkwa ndụ hụ ụmụ Makia nwa Manase, ndị e kukwasịrị nʼikpere ya. 24Mgbe ahụ, Josef sịrị ụmụnne ya, “Agala m ịnwụ, ma Chineke ga-abịa ileta unu. Ọ ga-esi nʼala a kpọpụta unu kpọgakwa unu nʼala ahụ ọ ṅụụrụ Ebraham na Aịzik na Jekọb iyi, na ọ ga-enye ha.” 25Mgbe ahụ, Josef mere ka ụmụ Izrel ṅụọrọ ya iyi sị, “Mgbe Chineke bịara ileta unu, unu aghaghị ị site nʼebe a chịkọrọ ọkpụkpụ m.” 26Josef nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ na iri. Ha gbasiri ozu ya, tinye ya nʼime igbe ozu, nʼala Ijipt.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 105:1–4, 6–7

1Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya. Meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ. 2Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto; kwupụtanụ ọrụ ihe ịrịbama ya niile. 3Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa. 4Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile. 6unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya, unu ụmụ ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara. 7Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị; ikpe ya dị nʼụwa niile.

Oziọma

Mat 10:24–33

24“Nwata akwụkwọ adịghị akarị onye nkuzi ya. Ohu adịghị akarịkwa nna ya ukwu. 25O zuorela onye na-eso ụzọ onye nkuzi ka ọ dị ka onye nkuzi ya, na ohu ahụ ka ọ dị ka onyenwe ya. Ọ bụrụ na a kpọrọ nna nwe ụlọ Belzebub, a ga-esi aṅaa ghara ịkpọ ndị ezinaụlọ ya ihe karịrị nke a? 26“Ya mere unu atụla ha egwu. O nweghị ihe ọbụla e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe, maọbụ ihe e zoro ezo nke a na-agaghị eme ka ọ pụta ìhè. 27Ihe m na-agwa unu ugbu a na nzuzo, kọsaanụ ya mgbe chi bọrọ. Ihe m ji nwayọọ mee ka ọ baa unu na ntị, nọdụnụ nʼelu ụlọ kwusaa ya. 28Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu naanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụobi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Onye ahụ nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụobi, tụbakwa ha nʼọkụ ala mmụọ. 29Ọ bụghị otu kobo ka a na-ere ụmụ nza abụọ? Ma otu nʼime ha agaghị ada nʼala ma ọ bụrụ na Nna unu bi nʼeluigwe amaghị. 30Ọ bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ka a maara ọnụọgụgụ ha. 31Ya mere, unu atụla egwu. Unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza. 32“Ya mere, onye ọbụla kwupụtara m nʼihu ụmụ mmadụ, ka mụ onwe m ga-ekwupụta nʼihu Nna m bi nʼeluigwe. 33Ma onye ọbụla na-agọnarị m nʼihu ndị mmadụ, mụ onwe m ga-agọnarịkwa ya nʼihu Nna m bi nʼeluigwe.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike