Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 10 Julaị
Kalenda Ọtọdọks · 27 Jun (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 10 Julaị 2027
Satọdee · Izu nke 3 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
St. Joanna the Myrrhbearer (1st C)
Obubu ọnụ Ndị Ozi
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
28Ya mere, anyị na-agụnye mmadụ nʼonye ezi omume nʼihi okwukwe o nwere, ọ bụghị nʼihi na o mere ihe iwu kwuru. 29Chineke ọ bụ naanị nke ndị Juu? Ọ bụkwaghị nke ndị mba ọzọ? Nʼezie, ọ bụkwa nke ndị mba ọzọ. 30Nʼihi na Chineke dị naanị otu, ọ bụ site nʼokwukwe ka ọ ga-anabata ndị ahụ ebiri ugwu, sitekwa nʼotu okwukwe ahụ gụọ ndị a na-ebighị ugwu ka ndị ezi omume. 31Ọ bụrụ na ọ dị otu a, anyị na-esite nʼokwukwe anyị mee ka iwu ghara ịdị ire? Mba! Kama anyị na-enye iwu ọnọdụ kwesiri ya. 4:1Gịnị ka anyị nwere ikwu banyere Ebraham, nna nna anyị na o nwetara ihe niile site nʼanụ ahụ? 2A sị na a gụrụ Ebraham dịka onye ezi omume site nʼọrụ aka ya, ọ gaara enwe ihe ọ ga-eji anya isi, ma na ọ bụghị nʼihu Chineke. 3Ma gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru? “Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume.”
Oziọma
24“Onye ọbụla ṅara ntị nʼokwu ndị a m kwuru, ma meekwa ha, dị ka nwoke ahụ maara ihe, onye wuru ụlọ ya nʼelu oke nkume. 25Mmiri zosikwara ike nʼelu ụlọ ahụ, idee mmiri sọkwara, tie nʼụlọ ahụ. Ifufe siri ike fekwara, ma ụlọ ahụ adaghị. Nʼihi na e wuru ntọala ya nʼelu oke nkume. 26Ma ndị niile nụrụ okwu ndị a, ma lefuru ha anya, bụ ndị nzuzu. Ha dị ka nwoke wuru ụlọ ya nʼelu aja. 27Ngwangwa mmiri zoro, idee mmiri sọkwara, ifufe fesikwara ike tie nʼụlọ ahụ, ụlọ ahụ dara daruo ala. Ọdịda ya dị ukwuu.” 28Mgbe Jisọs kwuchara okwu ndị a, ozizi ya juru igwe mmadụ ahụ niile anya. 29Nʼihi na o ziri ihe dịka onye nwere ikike. Ọ bụghị dị ka ndị ozizi iwu ha. 8:1Ọtụtụ mmadụ sooro Jisọs mgbe o si nʼugwu ahụ rịdata. 2Mgbe ha na-aga nʼụzọ, otu onye ekpenta bịakwutere ya kpọọ isiala nye ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” 3O setịpụrụ aka ya, metụ ya sị, “Achọrọ m ka ị dị ọcha, dịrịkwa ọcha!” Ngwangwa, ekpenta ahụ lara. 4Jisọs nyere nwoke ahụ iwu sị ya, “Hụ na ịgwaghị onye ọbụla, kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chụọkwa aja onyinye dịka Mosis, nyere nʼiwu, ka ọ bụrụ ihe ama nye ya.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 27 Jun na kalenda nzukọ bụ 10 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike