Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 9 Julaị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 9 Julaị 2027
Fraịdee · Izu nke 14 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 14 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Ọgọstin Zhao Rong, Onye ụkọchukwu, na ndị otu ya, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Izrel biliri ije, ya na ihe niile o nwere rute Bịasheba. Ebe a, ọ chụrụ aja nye Chineke nke nna ya Aịzik. 2Chineke gwara Izrel okwu nʼọhụ nke abalị. Ọ sịrị, “Jekọb! Jekọb!” Ọ zara sị, “Lee m nʼebe a.” 3Chineke gwara ya sị, “Abụ m Chineke, Chineke nke nna gị. Atụla egwu ịgbada Ijipt nʼihi na aga m eme gị ka ị ghọọ mba dị ukwuu nʼebe ahụ. 4Mụ onwe m ga-eso gị agbada nʼala Ijipt. Mụ onwe m ga-akpọlatakwa gị ọzọ. Josef nʼonwe ya ga-eji aka ya ekpuchikwa gị anya.” 5Jekọb mechara si na Bịasheba pụta. Ụmụ Izrel kuuru Jekọb nna ha, na ụmụaka ha na ndị nwunye ha, kubanye nʼụgbọala ahụ Fero zitere ka ha ji bute ya. 6Ha buuru anụ ụlọ ha niile, na ihe onwunwe ha niile, nke ha kpatara nʼala Kenan, gaa Ijipt. Jekọb na agbụrụ ya niile so. 7Ụmụ ya ndị ikom niile, na ụmụ ụmụ ya ndị ikom niile, na ụmụ ya ndị inyom niile, na ụmụ ụmụ ya ndị inyom niile, na ndị niile bụ mkpụrụ afọ ya, ka ọ kpọrọ gaa Ijipt. 28Jekọb zipụrụ Juda ka jekwuru Josef ịjụta ya ụzọ Goshen. Mgbe ha rutere nʼala Goshen, 29Josef kwadoro ịnyịnya ụgbọ ya gawa Goshen izute nna ya Izrel. Mgbe Josef bịara nʼihu nna ya, ọ makụrụ ya, bee akwa ogologo oge. 30Izrel gwara Josef sị, “Ugbu a ejikerela m ịnwụ, ebe m hụrụ ihu gị anya ọzọ, mata na ị ka dị ndụ.”
Abụ Ọma nzaghachi
Abụ 37:3–4, 18–19, 27–28, 39–40
3Tụkwasị Onyenwe anyị obi meekwa ihe ziri ezi; biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ. 4Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ. Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị. 18Ndị na-enweghị ịta ụta na-ebi ndụ ha nʼokpuru nlekọta Onyenwe anyị, ihe nketa ha ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 19Nʼoge ihe ndakwasị, ha agaghị akpọnwụ; ha ga-erijukwa afọ nʼụbọchị ụnwụ. 27Site nʼihe ọjọọ pụọ, mee ezi ihe, mgbe ahụ, i ga-ebi nʼala a ruo mgbe ebighị ebi. 28Onyenwe anyị na-ahụ onye ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya. Ọ gaghị ahapụkwa ndị ya kwesiri ntụkwasị obi. A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi, ma ụmụ ndị ajọ omume ka a ga-egbuchapụ; 39Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka Onyenwe anyị bịa; ọ bụ ebe ha e wusiri ike nʼoge nsogbu. 40Onyenwe anyị na-enyere ha aka, na-anapụtakwa ha ma na-azọpụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume, nʼihi na ha mere ya ebe mgbaba ha.
Oziọma
16“Ana m ezipu unu dị ka atụrụ nʼetiti agụ. Ya mere, nweenụ uche dịka agwọ. Burunu ndị a na-apụghị ịta ụta dịka nduru. 17Kpachapụnụ anya. Nʼihi na a ga-enyefe unu nʼaka nzukọ ndị ụlọ ikpe, pịaakwa unu ihe nʼụlọ ekpere ha. 18A ga-ekpe unu ikpe nʼihu ndị na-achị achị na nʼihu ndị eze nʼihi m. Ma nke a ga-enye unu ohere ịgwa ha ihe banyere m. E, nke a ga-enye unu ohere ịgba ama banyere m nye ndị mba ọzọ. 19Mgbe ha jidere unu na-ekpe unu ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu, maọbụ otu unu ga-esi kwuo ya. Nʼihi na a ga-eme ka unu mata ihe unu ga-ekwu nʼoge ahụ. 20Nʼihi na ọ bụghị unu ga-ekwu nʼonwe unu. Kama Mmụọ nke Nna unu bi nʼeluigwe ga-esite nʼọnụ unu kwuo okwu. 21“Nwanne ga-arara nwanne ya nye ka e gbuo ya, nna ga-ararakwa nwa ya nye. Ụmụ ga-ebili megide ndị mụrụ ha mee ka e gbuo ha. 22Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta. 23Mgbe ọbụla ndị mmadụ sogburu unu nʼotu obodo gbalaganụ nʼobodo ọzọ. Nʼezie, asị m unu, unu agaghị agazucha obodo niile nke Izrel tupu Nwa nke Mmadụ alọghachi.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Ọgọstin Zhao Rong, Onye ụkọchukwu, na ndị otu ya, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike