Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 6 Julaị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 6 Julaị 2027

Tiuzdee · Izu nke 14 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 14 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Maria Goretti, Nwaagbọghọ na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jen 32:22–32

22Nʼabalị ahụ, Jekọb biliri duru ndị nwunye ya abụọ na ndị odibo nwanyị ya abụọ, na ụmụ ya iri na otu, site nʼebe na-adịghị omimi nke iyi Jabọk kpọfee ha. 23Mgbe ọ kpọfechara ha, o bufekwara ihe niile o nwere. 24Emesịa, Jekọb lọghachiri nọdụ naanị ya. Mgbe ahụ, otu nwoke bịara gbaso ya mgba. Ha abụọ gbagidere mgba a tutu chi ebido ịbọ. 25Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọ pụghị imeri Jekọb na mgba ahụ, o tiri Jekọb aka nʼọkpụ, mee ka ọkpụ ya hịkwapụ site nʼọnọdụ ya. 26Mgbe nke a mesịrị, nwoke ahụ gwara Jekọb sị ya: “Hapụ m aka ka m laa, nʼihi na chi ebidola ịbọ.” Ma Jekọb zara sị ya, “Ọ bụ naanị mgbe ị gọziri m ka m ga-ahapụ gị ka ị laa.” 27Mgbe ahụ nwoke ahụ jụrụ Jekọb ajụjụ sị ya, “Gịnị bụ aha gị?” Ọ zara sị, “Aha m bụ Jekọb.” 28Nwoke ahụ zara sị ya, “Aha gị agaghị abụkwa Jekọb, kama ọ ga-abụ Izrel, nʼihi na gị na Chineke na ndị mmadụ gbara mgba, ị mmeri.” 29Jekọb sịrị, “Biko gwa m aha gị.” Ma ọ zaghachiri, “Gịnị mere ị ji ajụ aha m?” Mgbe ahụ, ọ gọziri ya nʼebe ahụ. 30Jekọb kpọrọ aha ebe ahụ Peniel, nʼihi na ọ sịrị, “Ahụla m Chineke ihu na ihu, ma e chebere ndụ m.” 31Anyanwụ awaala mgbe Jekọb si Peniel gafee. Ma nʼihi ihe mere ya nʼọkpụ, ọ naghị agazikwa ije. 32Ọ bụ ihe a mere ụmụ Izrel adịghị eri akwara anụ jikọtara ukwu anụ na ọkpụ ya ruo taa. Nʼihi na ihe ahụ mere Jekọb metụtara akwara ukwu ya.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 17:1–3, 6–8, 15

1Ekpere Devid. O Onyenwe anyị, nụrụ arịrịọ m ziri ezi, nụrụkwa mkpu akwa m. Gee ntị nʼekpere m nʼihi na o siteghị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu okwu aghụghọ. 2Ka mkpepụta m si nʼaka gị bịa; ka anya gị hụ ihe ziri ezi. 3Ọ bụ ezie na ị nyochaala obi m, i letala m nʼabalị, nwalekwaa m, ị ga-achọpụta na o nweghị ihe ọ ọjọọ bụla m zubere, na ọnụ m ekwuhiebeghị. 6Ana m akpọku gị, O Chineke, nʼihi na amaara m na ị ga-aza m; gee m ntị ma nụrụ ekpere m. 7Zipụta ịhụnanya gị dị oke ebube; gị onye na-eji aka nri gị dị ike azọpụta ndị niile gbabara na gị site nʼaka ndị iro ha. 8Chebe m dịka mkpụrụ anya gị; zoo m na ndo nke nku gị, 15Ma mụ onwe m ga-ahụ ihu gị site nʼezi omume; mgbe m ga-ebili, afọ ga-eju m nke ọma, nʼihi na aga m ahụ gị ihu na ihu.

Oziọma

Mat 9:32–38

32Mgbe ndị a sitere nʼebe ahụ pụọ, ndị ọzọ buteere ya nwoke dara ogbi, onye mmụọ ọjọọ bikwa nʼime ya. 33Mgbe ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ bidoro ikwu okwu. Ibubo nwụrụ igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ha sịrị, “Anyị ahụtụbeghị ihe dị otu a nʼala Izrel.” 34Ma ndị Farisii sịrị, “Ọ bụ ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ, na-enye ya ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ.” 35Jisọs jegharịrị nʼobodo niile na ogbe niile dị nʼebe ahụ, ma ndị ukwu na ndị nta, na-ezi ihe nʼụlọ ekpere ndị Juu, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche. 36Mgbe ọ hụrụ igwe mmadụ niile na-abịakwute ya, ọmịiko ha mere ya, nʼihi na ha bụ ndị a na-esogbu. Ndị na-enweghị onye inyeaka. Ndị dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. 37Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Owuwe ihe ubi hiri nne nʼezie. Ma ndị ọrụ dị ole na ole. 38Ya mere, rịọọnụ Onyenwe owuwe ihe ubi ka o zite ndị ọrụ nʼowuwe ihe ubi ya.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike