Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 7 Julaị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 7 Julaị 2027
Wenezdee · Izu nke 14 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 14 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
55Ka agụ jidere ala Ijipt niile, ndị mmadụ tikuru Fero ka o nye ha nri. Ma Fero gwara ndị Ijipt niile, “Jekwurunụ Josef. Ihe ọbụla ọ gwara unu meenụ ya.” 56Mgbe ụnwụ ahụ gbasara ruo nʼakụkụ niile nke ala ahụ, Josef meghepụrụ ụlọ ichebe nri niile bido iresi ndị Ijipt nri, nʼihi na ụnwụ ahụ dị njọ nʼala Ijipt niile. 57Mba niile bịara Ijipt ịzụ nri site nʼaka Josef nʼihi na ụnwụ ahụ dị njọ nʼụwa niile. 42:5Otu a, ụmụ Izrel so nʼọtụtụ ndị ọzọ ndị jekwara ịzụrụ nri nʼIjipt, nʼihi na ụnwụ ahụ dị njọ nʼala Kenan. 6Nʼoge a, Josef na-achị ala Ijipt, bụrụkwa onye iresi ndị obodo ọka dị nʼaka. Ya mere, mgbe ụmụnne Josef rutere, ha bịara hulata kpọọ isiala nye Josef. 7Mgbe Josef hụrụ ụmụnne ya, ọ matara ndị ha bụ. Ma ọ kpara agwa dịka onye na-amaghị ha, gwa ha okwu nʼolu ike, sị ha, “Ebee ka unu si bịa?” Ha zara, “Anyị si ala Kenan bịa. Anyị bịara ịzụrụ nri.” 17O tinyere ha niile nʼụlọ mkpọrọ, hapụ ha nʼebe ahụ abalị atọ. 18Josef gwara ha, nʼụbọchị nke atọ, “Nke a bụ ihe unu ga-eme ma dị ndụ, nʼihi na abụ m onye na-atụ egwu Chineke. 19Ọ bụrụ na unu bụ ndị ezi mmadụ, ka otu onye nʼime unu nọdụ nʼebe a, nʼụlọ mkpọrọ, ka ndị fọdụrụ buru ọka bulaara ndị ezinaụlọ unu nọ nʼagụụ. 20Ma kpọtaranụ m nwanne unu nke nta nʼebe a, nke a ga-egosi na okwu unu bụ eziokwu, na unu agaghịkwa anwụ.” Ha mere otu a. 21Ha gwarịtara onwe ha okwu sị, “Nʼezie, ọ bụ nʼihi nwanne anyị nwoke ka ahụhụ ndị a ji abịakwasị anyị. Anyị hụrụ obi mgbawa ya, mgbe ọ na-arịọ ka anyị chebe ndụ ya, ma anyị egeghị ya ntị. Ọ bụ nke a mere mmekpa ahụ ndị a ji bịakwasị anyị ugbu a.” 22Ruben zara sị ha, “Ọ bụ na mụ agwaghị unu sị unu hapụ imejọ nwantakịrị ahụ, ma unu egeghị ntị? Ugbu a, anyị na-asa ajụjụ banyere ọbara ya.” 23Ha amataghị na Josef na-anụ ihe ha na-ekwu, nʼihi na onye nsụgharị okwu nọ nʼetiti ha. 24O sitere nʼebe ha nọ tụgharịa gaa kwaa akwa. Ọ lọghachikwutere ha ọzọ gwakwa ha okwu. O si nʼetiti ha kpọpụta Simiọn kee ya agbụ ka ha na-ele ya anya.
Abụ Ọma nzaghachi
2Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị; werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu. 3Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ; were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ. 10Onyenwe anyị na-emebi atụmatụ mba niile; ọ na-emebi ebumnobi ụmụ mmadụ. 11Atụmatụ Onyenwe anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ebumnobi ya ruo ọgbọ niile. 18Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche, ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ. 19Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ. Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ.
Oziọma
1Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ nye ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha, na ịgwọ nrịa nrịa na ọrịa niile dị iche iche. 2Nke a bụ aha ndị ozi iri na abụọ ahụ: Saimọn (onye a na-akpọkwa Pita) na Andru nwanne Saimọn; Jemis nwa Zebedi, na Jọn nwanne ya. 3Filip na Batalomi; Tọmọs na Matiu onye ọna ụtụ; Jemis nwa Alfiọs, na Tadiọs. 4Saimọn onye a na-akpọ Zilọt na Judas Iskarịọt, onye raara ya nye nʼaka ndị gburu ya. 5Ndị ikom iri na abụọ ndị a ka Jisọs nyere ikike zipụ. Maara ha ọkwa sị ha: “Unu agala nʼebe ndị mba ọzọ, maọbụ nʼebe ndị Sameria nọ. 6Kama jekwurunụ ụmụ Izrel, ndị bụ atụrụ furu efu. 7Mgbe unu na-aga, na-ekwusaaranụ ha sị, ‘alaeze eluigwe a dịla nso.’
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike