Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 6 Julaị
Kalenda Ọtọdọks · 23 Jun (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 6 Julaị 2027
Tiuzdee · Izu nke 3 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Martyr Agrippina of Rome († c. 255)
Obubu ọnụ Ndị Ozi
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe ụtụtụ: Oziọma (maka Aịkọn Vladimir nke Nne Chineke)
39Nʼoge ahụ, Meri biliri gaa ọsịịsọ nʼotu obodo dị nʼugwu Juda. 40Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼụlọ Zekaraya, kelee Elizabet. 41Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya nʼafọ megharịrị ahụ. E mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ nsọ. 42O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nʼetiti ụmụ nwanyị niile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị bu nʼafọ bụkwa. 43Onye kwanụ ka m bụ na ihuọma dị otu a kpọrọ m na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m? 44Ngwangwa m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nʼafọ wuliri elu nʼọṅụ. 45Ngọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime.” 46Ma Meri sịrị, “Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu 47mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m, 48nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m, bụ odibo ya dị ala. Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi. 49Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ. 56Meri nọnyeere ya ihe dịka ọnwa atọ ma mesie laghachi nʼụlọ ya.
Akwụkwọ ozi
14Anyị matara na iwu bụ ihe nke mmụọ ebe mụ onwe m bụ anụ ahụ efu, onye e rere dịka ohu nye mmehie. 15O nweghị ụzọ ihe m na-eme si doo m anya. Nʼihi na ihe m na-eme abụghị ihe m chọrọ ime, ọ bụ ihe m kpọrọ asị bụ ihe na-agara m aka ime mgbe niile. 16Ma ọ bụrụ na m eme ihe m na-achọghị ime, ana m ekwenye na iwu dị mma. 17Ma dịka ọ dị, ọ bụkwaghị mụ onwe m na-eme ihe ndị a, kama ọ bụ mmehie bi nʼime m. 18O doro m anya na o nweghị ihe ọma ọbụla dị nʼime m, ya bụ nʼime anụ ahụ m. Nʼihi na ọ na-agụ m agụụ ime ezi ihe, ma ike ime ezi ihe adịghị nʼime m. 19Ihe m na-eme mgbe m chọrọ ime ezi ihe abụghị ezi ihe ahụ m chọrọ ime kama ọ bụ ajọọ ihe ahụ m na-achọghị ime ka m na-eme. 20Ọ bụrụ na m na-eme ihe ahụ m na-achọghị ime, ọ pụtara na ọ bụghị mụ onwe m na-eme ihe ndị ahụ. Kama ọ bụ mmehie bi nʼime m na-eme ha. 21Achọpụtara m iwu nke na-arụ ọrụ nʼime m. Mgbe m chọrọ ime ihe ọma, naanị ihe ọjọọ bụ ihe na-agara m aka ime. 22Nʼime ime onwe m, ọ na-agụ m agụụ ime ihe iwu Chineke kwuru. 23Ma ana m ahụta iwu ọzọ dị nʼime m nke na-agba mgba megide iwu nke dị nʼuche m, ime ka m bụrụ ohu nye iwu nke mmehie na-arụ ọrụ ya nʼanụ ahụ m. 24Lee ụdị ọnọdụ ọjọọ nke m hụtara onwe m nʼime ya! Onye pụrụ ịnapụta m site nʼanụ ahụ a nke na-eduba m nʼọnwụ? 25Ma ekele dịrị Chineke, onye na-anapụta m site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị! Ya mere, nʼime mmụọ m, abụ m odibo nye iwu Chineke, ma nʼime anụ ahụ mmehie m, abụ m ohu nye iwu nke mmehie. 8:1Ya mere, ikpe ọmụma ọbụla adịghịkwa ugbu a nye ndị niile nọ nʼime Jisọs Kraịst. 2Nʼihi na site na Kraịst Jisọs iwu nke Mmụọ na-enye ndụ emeela ka m nwere onwe m site nʼiwu nke mmehie na ọnwụ.
Akwụkwọ ozi (maka Wenezdee)
2Nʼihi na site na Kraịst Jisọs iwu nke Mmụọ na-enye ndụ emeela ka m nwere onwe m site nʼiwu nke mmehie na ọnwụ. 3Nʼihi na ihe iwu na-enweghị ike ime, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ, ka Chineke mere, site nʼizite Ọkpara ya, ka ọ bịa nʼụdịdị anụ ahụ mmehie, bụrụ aja mmehie, site otu a, maa mmehie ikpe na anụ ahụ. 4Ka izu ezu nke ihe niile iwu chọrọ nʼaka anyị bụrụ ihe e mezuru nʼime anyị, bụ ndị na-adịghị ebi ndụ dịka ọchịchọ anụ ahụ si dịrị, kama dịka ọchịchọ Mmụọ Nsọ si dị. 5Ndị niile na-ebi ndụ ha dịka anụ ahụ siri chọọ, na-ebi ya naanị imezu agụụ niile na-agụ anụ ahụ ha. Ma ndị niile na-agbaso ụzọ nke Mmụọ na-achọpụta na ha na-eme ihe Mmụọ na-achọ. 6Ịtụkwasị uche nʼihe nke anụ ahụ na-eweta ọnwụ. Ma ịtụkwasị uche nʼihe nke Mmụọ Nsọ na-eweta ndụ na udo. 7Nʼihi na onye ọbụla tụkwasịrị uche ya nʼihe nke anụ ahụ na-ebuso Chineke agha, ọ naghị edebe iwu nke Chineke. Nʼeziokwu, ọ gaghị enwe ike idebe ya. 8Ya mere, ndị na-erubere anụ ahụ ha isi apụghị ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. 9Ma lee! Unu onwe unu anaghị ebizi ndụ nʼusoro nke anụ ahụ, kama unu na-ebi nʼusoro nke Mmụọ Nsọ nʼihi na Mmụọ nke Chineke bi nʼime unu. Onye ọbụla na-enweghị Mmụọ nke Kraịst abụghị nke ya. 10Ọ bụrụkwa na Kraịst bi nʼime unu, anụ ahụ unu ga-abụ ihe nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị, ma mmụọ unu dị ndụ nʼihi na a gụọla unu na ndị ezi omume. 11Ọ bụrụ na Mmụọ onye mere ka Jisọs si nʼọnwụ bilie, bi nʼime gị, onye ahụ nke mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie ga-emekwa ka anụ ahụ gị dị ndụ site nʼike Mmụọ Nsọ ahụ, onye bi nʼime gị. 12Ya mere, ụmụnna m, anyị ji ụgwọ ma ọ bụghị anụ ahụ ka anyị ji ụgwọ ịdị ndụ dịka ọchịchọ ya si dị. 13Ọ bụrụ na unu na-ebi ndụ dịka anụ ahụ si chọọ, unu ga-anwụ. Ma ọ bụrụ na unu ga-eji ike nke Mmụọ Nsọ mee ka omume niile nke anụ ahụ nwụọ, unu ga-adị ndụ.
Akwụkwọ ozi (maka Aịkọn Vladimir nke Nne Chineke)
5Na mmekọrịta unu na ibe unu, nweenụ ụdị uche ahụ nke dị nʼime Jisọs Kraịst: 6Onye ọ bụ ezie na o nwere ụdịdị Chineke site na mmalite ma ọ gụghị ụdịdị ya dị ka Chineke dị ka ihe ọ ga-ejidesi aka ike. 7Kama, ọ gụrụ onwe ya dị ka ihe efu, site na ịnara ụdịdị nke onye bụ ohu, onye nke a mụrụ dị ka mmadụ. 8Ebe ahụrụ ya ka ọ dịka mmadụ nʼoyiyi, o wedakwara onwe ya ala, site nʼirube isi ruo ọnwụ, bụ ọnwụ nke obe. 9Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke ji bulie ya elu nʼebe kachasị elu, nyekwa ya aha kachasị aha niile elu. 10Ka ọ ga-abụ mgbe ọbụla a kpọrọ aha Jisọs ka ikpere niile ọbụla gbuo nʼala, ihe niile dị nʼeluigwe, ndị niile bi nʼụwa, na ndị bi nʼokpuru ụwa. 11Ka ire niile ọbụla kwupụta na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, maka inye Chineke bụ Nna, otuto.
Oziọma
9“Mgbe unu na-aga, unu anatala ọlaọcha maọbụ ọlaedo, maọbụ ọla ọbụla tinye nʼime belịt unu. 10Unu ejikwala akpa maka njem unu, maọbụ uwe abụọ, maọbụ akpụkpọụkwụ, maọbụ mkpanaka. Nʼihi na onye ọrụ kwesiri ihe e ji azụ ya. 11Ma obodo ọbụla maọbụ ogbe ọbụla unu bara nʼime ya, chọọnụ ụfọdụ ndị kwesiri nsọpụrụ bi nʼobodo ahụ. Nọgidekwanụ nʼụlọ ha ruo mgbe unu ga-ahapụ obodo ahụ. 12Mgbe unu na-abanye nʼụlọ ahụ, keleenụ ndị bi na ya sị, udo dịrị unu. 13Ọ bụrụ na ndị nọ nʼụlọ ahụ anabata unu, meenụ ka udo unu bịakwasị nʼụlọ ahụ. Ọ bụrụkwanụ na ha anabataghị unu, ka udo unu lọghachikwute unu. 14Ọ bụrụ na onye ọbụla anabataghị unu, maọbụ jụ ịnụrụ okwu unu, mgbe unu na-ahapụ ụlọ ahụ maọbụ obodo ahụ kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu. 15Nʼeziokwu, ọ ga-adịrị obodo ahụ njọ nʼụbọchị ikpe karịa obodo Sọdọm na Gọmọra.
Oziọma (maka Wenezdee)
16“Ana m ezipu unu dị ka atụrụ nʼetiti agụ. Ya mere, nweenụ uche dịka agwọ. Burunu ndị a na-apụghị ịta ụta dịka nduru. 17Kpachapụnụ anya. Nʼihi na a ga-enyefe unu nʼaka nzukọ ndị ụlọ ikpe, pịaakwa unu ihe nʼụlọ ekpere ha. 18A ga-ekpe unu ikpe nʼihu ndị na-achị achị na nʼihu ndị eze nʼihi m. Ma nke a ga-enye unu ohere ịgwa ha ihe banyere m. E, nke a ga-enye unu ohere ịgba ama banyere m nye ndị mba ọzọ. 19Mgbe ha jidere unu na-ekpe unu ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu, maọbụ otu unu ga-esi kwuo ya. Nʼihi na a ga-eme ka unu mata ihe unu ga-ekwu nʼoge ahụ. 20Nʼihi na ọ bụghị unu ga-ekwu nʼonwe unu. Kama Mmụọ nke Nna unu bi nʼeluigwe ga-esite nʼọnụ unu kwuo okwu. 21“Nwanne ga-arara nwanne ya nye ka e gbuo ya, nna ga-ararakwa nwa ya nye. Ụmụ ga-ebili megide ndị mụrụ ha mee ka e gbuo ha. 22Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.
Oziọma (maka Aịkọn Vladimir nke Nne Chineke)
38Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ banyere nʼotu obodo nta ebe nwanyị a na-akpọ Mata nabatara ya nʼụlọ ya. 39O nwere nwanne nwanyị a na-akpọ Meri nke nọdụrụ ala nʼụkwụ Onyenwe anyị na-ege ntị nʼihe ọ na-ekwu. 40Ma uche Mata gbasasịrị agbasa ebe ọ na-akwado maka ile ọbịa. Ọ bịakwutere ya sị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ na o metụghị gị nʼobi na nwanne m nwanyị hapụrụ naanị m ije ozi niile? Gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.” 41Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị ma na-adọgbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe, 42maọbụ naanị otu ihe dị mkpa, Meri ahọrọla nke ka mma, nke a na-agaghị anapụkwa ya.” 11:27Mgbe ọ kpụ okwu a nʼọnụ, otu nwanyị sitere nʼime igwe mmadụ ahụ tie mkpu sị, “Ngọzị na-adịrị afọ mụrụ gị na ara nke e jiri zụọ gị.” 28Ma ọ sịrị, kama, “Ngọzị na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke, na-emekwa ha.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 23 Jun na kalenda nzukọ bụ 6 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike