Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 5 Julaị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 5 Julaị 2027

Mọnde · Izu nke 14 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Mọnde nke izu nke 14 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Antoni Zaccaria, Onye ụkọchukwu · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jen 28:10–22

10Jekọb hapụrụ Bịasheba gawa Haran. 11Mgbe chi na-eji, ọ kwụsịrị ebe ọ ga-anọ zuo ike abalị. Mgbe ọ chọrọ idina ala, o weere otu nʼime nkume ndị dị nʼebe ahụ hinye nʼisi ya, dinara ala ịrahụ ụra. 12Nʼabalị ahụ, ọ rọrọ nrọ, hụ mbube e ji arị elu. E mere ka o guzo site nʼụwa ruo nʼeluigwe. Ọ hụkwara ndị mmụọ ozi Chineke ka ha si na ya na-arịgo na-arịdakwa. 13Nʼelu ya, ọ hụrụ Onyenwe anyị ka o guzo, nụkwa ka ọ na-agwa ya okwu sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, Chineke nna gị Ebraham, na Chineke Aịzik. Aga m enye gị na ụmụ ụmụ gị ala ahụ nke i dina nʼelu ya. 14Ụmụ gị ga-adị ukwuu, dị ka aja dị nʼala. Ha ga-ejupụta ala a, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, sitekwa nʼugwu ruo na ndịda. A ga-esitekwa na gị na mkpụrụ gị, gọzie mba niile nke ụwa a. 15Anọnyeere m gị. Aga m echebe gị ebe ọbụla ị na-aga. Aga m akpọghachite gị nʼala a. Agaghị m ahapụ gị tutu ruo mgbe m mezuoro gị ihe niile m kwere gị na nkwa.” 16Jekọb tetara nʼụra sị, “Nʼezie Onyenwe anyị nọ nʼebe a. Ma amaghị m ya.” 17Ọ tụrụ egwu sị, “Lee ka ebe a si dị oke egwu, o nweghị ihe ebe a bụ karịa ụlọ Chineke, nʼezie ọ bụ ọnụ ụzọ ama eluigwe.” 18Nʼisi ụtụtụ echi ya, Jekọb weere nkume ahụ o hinyere nʼisi ya guzo ya dịka ogidi, wụsa mmanụ nʼelu ya. 19Ọ kpọrọ ebe ahụ Betel, ọ bụ ezie na Luz bụ aha obodo ahụ na mbụ. 20Mgbe ahụ, Jekọb kwere nkwa sị, “Ọ bụrụ na Chineke ga-anọnyere m, chebe m nʼije m na-eje, ọ bụrụ na ọ ga-enye m ihe oriri m ga-eri na uwe m ga-eyi, 21m lọghachi nʼụlọ nna m nʼudo, mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-abụ Chineke m. 22Nkume a m doziri elu dịka ogidi ga-abụ ụlọ Chineke. Aga m eke ihe niile i nyere m ụzọ iri, nyeghachi gị otu ụzọ.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 91:1–4, 14–15

1Onye ahụ na-ebi nʼebe mgbaba Onye kachasị ihe niile elu ga-ezu ike nʼokpuru ndo Onye pụrụ ime ihe niile. 2Nke a ka m ga-ekwu maka Onyenwe anyị, “Ọ bụ ebe mgbaba m na ebe nchebe m e wusiri ike, Chineke m, onye m na-atụkwasị obi m.” 3Nʼezie, ọ ga-anapụta gị site nʼọnya nke onye osi ọnya na site nʼaka ajọ ọrịa na-efe efe na-eweta ịla nʼiyi. 4Ọ ga-eji nku ya kpuchie gị. Ọ bụkwa nʼokpuru nku ya abụọ, ka ị ga-agbaba zere ndụ, ikwesi ntụkwasị obi ya ga-echebe gị, ghọkwaara gị ọta. 14“Nʼihi na ọ hụrụ m nʼanya, Mụ onwe m ga-agbapụta ya, ka Onyenwe anyị kwuru; aga m echebe ya, nʼihi na ọ maara aha m. 15Ọ ga-akpọku m, aga m azakwa ya. Aga m anọnyere ya nʼime nsogbu ya, aga m adọpụta, ma sọpụrụkwa ya.

Oziọma

Mat 9:18–26

18Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu, otu onyeisi ụlọ ekpere bịara kpọọ isiala nye ya, sị, “Ọ dịbeghị anya nwa m nwanyị nwụrụ. Otu ọ dị, bịa ka ị bikwasị ya aka gị. Ọ ga-ebili dịkwa ndụ ọzọ.” 19Nʼihi nke a, Jisọs soro ya gawa. Ndị na-eso ụzọ ya sokwara ha. 20Ma o nwere otu nwanyị onye ahụ na-esighị ike. Nwanyị a anọọla nʼọrịa a afọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ọrịa oruru ọbara nke na-adịghị akwụsị akwụsị ka ọ na-arịa. Nwanyị a sitere nʼazụ bịaruo ya nso, metụ ọnụ uwe ya aka. 21Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m ga-enwe ike metụ ọnụ uwe ya aka, a ga-agwọ m.” 22Jisọs chigharịrị lee ya anya sị ya, “Ada m, nwee obi ike, nʼihi na e sitela nʼokwukwe gị mee ka ahụ dị gị mma.” Ahụ dịkwara nwanyị ahụ mma site nʼoge ahụ. 23Mgbe Jisọs batara nʼụlọ onyendu ụlọ ekpere ndị Juu ahụ, hụ igwe mmadụ ka ha na-atụ ụzụ na ndị na-egbu ọja. 24Ọ sịrị ha, “Sinụ ebe a pụọ, nwata nwanyị a anwụghị anwụ, kama ọ nọ nʼụra.” Ma ha chịrị ya ọchị. 25Ma mgbe achụpụsịrị igwe mmadụ ahụ, ọ banyere nʼime ụlọ, jide nwata nwanyị ahụ nʼaka, o bilie ọtọ. 26Akụkọ ọrụ ebube a gbasara nʼebe niile nʼala ahụ.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike