Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 2 Julaị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 2 Julaị 2027

Fraịdee · Izu nke 13 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 13 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jen 23:1–4, 19; 24:1–8, 62–67

1Sera dị ndụ ruo narị afọ na iri afọ abụọ na asaa. 2Ọ nwụrụ na Kiriat Arba (nke bụ Hebrọn), nʼala Kenan. Ebraham ruru ụjụ nʼihi Sera, kwaa akwa nke ukwuu nʼihi ọnwụ ya. 3Ebraham sitere nʼebe ozu nwunye ya dị pụọ, jekwuru ụmụ Het gwa ha sị, 4“Abụ m ọbịa na onye obodo ọzọ nʼetiti unu. Resinụ m ala m ji eme ebe olili nʼebe a, ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ.” 19Emesịa, Ebraham liri Sera nwunye ya nʼime ọgba ahụ dị nʼala dị na Makipela na nso Mamre (nke dị na Hebrọn) nʼala ndị Kenan. 24:1Ugbu a, Ebraham aghọọla agadi nʼahụ ya ma nʼọnụọgụgụ afọ ya. Onyenwe anyị agọziela ya nʼụzọ niile 2Ọ gwara onyeisi ndị ozi nʼụlọ ya, onye nke na-elekọta ihe niile o nwere sị ya, “Tinye aka gị nʼokpuru apata m. 3Achọrọ m ka i jiri aha Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe na ụwa, ṅụọra m iyi, na ị gaghị achọtara nwa m nwoke nwunye site nʼetiti ndị Kenan, ndị m bi nʼetiti ha. 4Kama na ị ga-aga nʼala nke m na ụmụnna m lụtara nwa m, bụ Aịzik, nwunye nʼetiti ụmụnna m.” 5Ohu ahụ jụrụ ya, “Ọ bụrụkwanụ na nwaagbọghọ ahụ achọghị isoro m lọghachi nʼebe a, m ga-akpọrọ nwa gị nwoke laghachi nʼobodo i si bịa?” 6Ebraham sịrị ya, “Lezie anya hụ na ị kpọghachighị nwa m nwoke nʼebe ahụ. 7Onyenwe anyị, Chineke nke eluigwe, bụ onye kpọpụtara m site nʼụlọ nna m nakwa obodo nke aka m, onye ahụ gwara m okwu ma kwem nkwa site nʼịṅụ iyi nye sị, ‘Aga m enye ụmụ ụmụ gị ala a.’ Ọ ga-ezipụ mmụọ ozi ya ka ọ gaa nʼihu gị ka i nwee ike inwetara nwa m nwoke nwunye site nʼebe ahụ. 8Ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọghị isoro gị lọghachi, mgbe ahụ, ị ga-abụ onye nwere onwe ya pụọ nʼiyi a ị ṅụrụ. Naanị na ị gaghị eme ka nwa m nwoke laghachi nʼebe ahụ.” 62Nʼoge a, Aịzik bịara nʼebe mbata obodo Bịa-Lahai-Rọị nʼihi na o bi na Negev. 63Aịzik pụtara ịtụgharị uche nʼọhịa nʼoge uhuruchi. Ọ lepụrụ anya hụ ọtụtụ ịnyịnya kamel na-abịanụ. 64Ribeka nʼonwe ya lepụkwara anya hụ Aịzik. O sitere nʼelu ịnyịnya kamel rịdata, 65jụọ ohu ahụ sị, “Onye bụ nwoke a si nʼọhịa na-abịa izute anyị?” Ohu ahụ zara sị ya, “Ọ bụ nna m ukwu” Nʼihi nke a, Ribeka weere akwa mkpudo ya kpuchie ihu ya. 66Ohu ahụ kọọrọ Aịzik akụkọ otu ije ya niile si gaa. 67Aịzik kpọbatara Ribeka nʼụlọ ikwu Sera, nne ya. Ọ lụrụ Ribeka, onye ghọrọ nwunye ya. Aịzik hụrụ ya nʼanya, ma nweta nkasiobi nʼihi ọnwụ nne ya.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 106:1–5

1Toonu Onyenwe anyị. Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 2Onye pụrụ ikwupụtasịcha ihe ukwu niile nke Onyenwe anyị na-arụ maọbụ kwupụta otuto ya niile? 3Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ikpe ziri ezi, ndị ahụ na-eme ezi ihe mgbe niile. 4O Onyenwe anyị, cheta m mgbe ị ga-egosi ndị gị ihuọma, bịa leta m, mgbe ị na-azọpụta ha, 5ka m soro keta oke na ngọzị ndị gị ị họpụtara, ka m keta oke nʼọṅụ ahụ dịrị mba gị sorokwa ihe nketa gị nye otuto.

Oziọma

Mat 9:9–13

9Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-aga, ọ hụrụ otu nwoke a na-akpọ Matiu ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ. Ọ sịrị ya, “Soro m.” Na-atụfughị oge, ọ hapụrụ ihe niile soro ya. 10Dị ka ọ nọdụrụ ala iri nri uhuruchi nʼụlọ Matiu, ọtụtụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie sooro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ na-eri nri. 11Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Gịnị mere onye ozizi unu ji eso ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-eri nri?” 12Mgbe ọ nụrụ nke a, Jisọs sịrị, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike ka mkpa dibịa na-akpa. 13Ma gaanụ mụta ihe okwu a pụtara, ‘Ana m achọ ebere, ọ bụghị aja.’ Nʼihi na abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike