Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 2 Julaị

Kalenda Ọtọdọks · 19 Jun (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 2 Julaị 2027

Fraịdee · Izu nke 2 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8

Mmemme na ndị nsọ

Holy Apostle Jude, the Brother of the Lord († c. 80)

Obubu ọnụ Ndị Ozi

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jud 1:1–10

1Jud, odibo Jisọs Kraịst, na nwanne Jemis, Na-edegara ndị niile a kpọrọ, ndị ahụrụ nʼanya nʼime Chineke, bụ Nna, na ndị nọkwa nʼokpuru nchebe Jisọs Kraịst akwụkwọ ozi a: 2Ka ebere na udo na ịhụnanya bara unu ụba. 3Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ na-anụ m ọkụ nʼobi idere unu akwụkwọ banyere nzọpụta ahụ anyị nwekọrọ nʼotu, ma ahụrụ m mkpa ọ dị idere unu akwụkwọ a, ịrịọ unu ka unu guzosie ike buo agha ichebe okwukwe ahụ, nke e nyefere ndị nsọ nʼaka idebe. 4Nʼihi na ụfọdụ mmadụ, bụ ndị e dere ihe banyere ọmụma ikpe dịrị ha, siterị nʼoge gara aga, ezobatala nʼetiti unu. Ha bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-agbanwe amara Chineke anyị, mee ya ka ọ bụrụ ohere ha nwere ibi ndụ ịkwa iko, na nke ịgọnarị Jisọs Kraịst, onye naanị ya bụ Onye kachasị ihe niile elu na Onyenwe. 5Ọ bụ ezie na unu maa ihe ndị a niile, ma achọrọ m ichetara unu otu Onyenwe anyị si zọpụta ndị ya site nʼala Ijipt, ma mesịa laa ndị niile na-ekweghị ekwe nʼiyi. 6Ndị mmụọ ozi nupuru isi, ndị na-anọgideghị nʼọnọdụ e nyere ha, kama ha si nʼebe obibi ha gbapụ. O jirila igwe kee ha agbụ ebighị ebi, debe ha nʼọchịchịrị nʼime ala, ebe ha ga-anọ ruo ụbọchị ikpe ahụ dị egwu. 7Otu a kwa, Sọdọm na Gọmọra na obodo niile gbara ha gburugburu, bụ ndị nyefere onwe ha na ndụ ịkwa iko nakwa omume ibi ndụ ọjọọ dị iche iche nke anụ ahụ, bụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị mmadụ site nʼahụhụ ha tara nʼihi mmehie nʼime ọkụ ebighị ebi. 8Nʼụzọ dị otu a kwa, ndị a na-emerụ anụ ahụ ha nʼirọ nrọ ha, na-ajụkwa ike ọchịchị niile, ma na-ekwulukwa ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ. 9Ma Maikel onyeisi ndị mmụọ ozi, mgbe o guzogidere ekwensu na-arụrịtakwa ụka banyere ozu Mosis, ya onwe ya enweghị anya ike ịma ya ikpe nʼihi okwu nkwulu, kama ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị baara gị mba.” 10Ma ndị a na-ekwulu ihe niile ọbụla ha na-aghọtaghị. Dịka ụmụ anụmanụ a na-azụghị azụ, ha na-eme ihe ọbụla dị ha mma nʼanya si otu a na-ala onwe ha nʼiyi.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jud 1:11–16

11Ahụhụ ga-adịrị ha, nʼihi na ha soro nzọ ụkwụ Ken, nyefee onwe ha na ndahie Belam nʼihi ihe nrite nʼuru, ma laa nʼiyi na nnupu isi Kora. 12Ndị a bụ ihe ntụpọ nʼetiti unu nʼoge mmemme oriri ịhụnanya unu, ha na-eso unu na-erikọ nri na-atụghị egwu ọbụla. Ha bụ ndị na-elekọta naanị onwe ha. Ha dị ka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri, nke ifufe na-ebugharị. Ha bụ osisi a na-ahụ nʼoge ọkọchị nke na-adịghị amị mkpụrụ, nke e si na mgbọrọgwụ ya hoputa, nke nwụrụ anwụ ugboro abụọ. 13Ha bụ ebili mmiri na-amagharị nʼosimiri, nke na-asọpụta ihere ha dịka ụfụfụ, kpakpando na-awagharị awagharị, bụ ndị nke a kwadooro ebe kachasị ịgba ọchịchịrị ruo ebighị ebi. 14Ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka Enọk, onye bụ agbụrụ nke asaa site nʼAdam buru nʼamụma banyere ha sị, “Lee! Onyenwe anyị na-abịa, ya na puku kwụrụ puku ndị nsọ ya. 15Ọ na-abịa ikpe mmadụ niile ikpe, na ịtụ ha niile mmehie ajọ omume niile ha nʼanya, bụ nke ha mere nʼụzọ na-ezighị ezi. Tinyere okwu ọjọọ niile nke ndị mmehie ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke kwuru megide ya.” 16Ndị a bụ ndị na-atamu ntamu oge niile, ndị o nweghị ihe ọbụla na-adị ha mma. Ndị na-agbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ. Ha na-anya isi banyere onwe ha, na-aja ndị ọzọ mma; ka ha nwee ike nweta ihe ha na-achọ nʼaka ha.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jud 1:17–25

17Ma unu, ndị m hụrụ nʼanya, chetanụ ihe ndị ozi Onyenwe anyị Jisọs Kraịst kwuru na ha ga-emezu. 18Nʼihi na ha sịrị unu, “Nʼọgwụgwụ oge ahụ, ndị na-eji ihe niile na-emere ihe ọchị ga-adị. Ndị na-agbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ. 19Ọ bụ ndị anụ ahụ ha na-achị, ndị na-enweghị Mmụọ Nsọ nʼime ha, bụ ndị na-eweta nkewa nʼetiti unu.” 20Ma unu, ndị m hụrụ nʼanya, nọgidenụ na-ewuli onwe unu elu na ntọala okwukwe unu dịkarịsịrị nsọ. Na-ekpekwanụ ekpere nʼime Mmụọ Nsọ. 21Doonụ onwe unu nʼokpuru ịhụnanya Chineke, dịka unu na-echere ebere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nke na-eduba na ndụ ebighị ebi. 22Gosinụ ụfọdụ ndị na-enwe obi abụọ ebere. 23Zọpụtanụ ndị ọzọ site nʼịgụpụta ha nʼọkụ. Nʼebe ndị ọzọ nọ gosinụ ha obi ebere, kama jirinụ ịtụ egwu mee nke a, kpọọnụ ọ bụladị uwe nke anụ ahụ mmehie merụrụ asị. 24Ugbu a, nye onye ahụ pụrụ ichebe unu, ka unu ghara ịda, onye pụrụ ịkpọbata unu nʼihu ya dị ebube nʼọnọdụ enweghị ntụpọ ọbụla nʼoke ọṅụ 25ka otuto, na ịdị ukwuu, na ike, na ikike ọchịchị; dịrị Onye naanị ya bụ Chineke, Onye nzọpụta anyị, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị, tupu nʼọgbọ niile ebido, ka ọ dịrị ya ugbu a, na mgbe niile ebighị ebi. Amen.

Ofufe ụtụtụ: Oziọma

Jọn 21:15–25

15Mgbe ha risiri nri ụtụtụ, Jisọs sịrị Saimọn Pita, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya karịa ndị a niile?” Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” 16Jisọs sịrị ya nke ugboro abụọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Ọ sịrị ya, “Na-elekọta atụrụ m.” 17Ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” O wutere Pita na ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị mazuru ihe niile, ị makwaara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ atụrụ m. 18Nʼezie, nʼezie asị m gị, mgbe ị bụ okorobịa ị na-eke ajị nʼukwu, gaa ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi, ị ga-esetipụ aka gị, onye ọzọ ga-ekee gị ihe okike nʼukwu ma duru gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.” 19O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ iji nye Chineke otuto. Mgbe nke a mesịrị, ọ sịrị ya, “Soro m.” 20Pita chigharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya ka ọ na-esokwa ha nʼazụ. (Ọ bụ onyeozi ahụ dabeere ya nʼobi na nri anyasị, nke sịrị, “Onyenwe anyị, onye ga-arara gị nye?”) 21Mgbe Pita hụrụ ya, ọ sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị kedụ maka onye a?” 22Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụ nye gị? Soro m.” 23Ya mere, akụkọ a gbasara nʼetiti ụmụnna na onye a na-eso ụzọ ya agaghị anwụ. Ma Jisọs asịghị ya na ọ gaghị anwụ anwụ, kama, “Ọ bụrụ na m chọrọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ gbasara gị?” 24Nke a bụ onye ahụ na-eso ụzọ ya onye na-agba ama ihe ndị a niile, ma deekwa ha nʼakwụkwọ. Anyị makwaara na ama ya bụ eziokwu. 25Ma ọ dị ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jisọs mere. Ọ bụrụ na e dee ha niile nʼakwụkwọ, ọ dịghị m ka ụwa niile ọ ga-aba akwụkwọ a ga-ede banyere ha.

Akwụkwọ ozi

Rom 5:17–6:2

17Ya mere, ọ bụrụ na ọnwụ chịrị ọchịchị site na njehie nke otu onye, ọ bụghị ihe dị ukwu karịa na ndị nabatara onyinye amara Chineke bara ụba, ya na onyinye ezi omume, ga-achị achị na ndụ site nʼotu onye ahụ bụ Jisọs Kraịst. 18Ya mere, dịka otu njehie si weta ikpe ọmụma nye mmadụ niile, otu ahụ kwa ka e si gụọ mmadụ niile dịka ndị ezi omume na ndị nwere ndụ site nʼotu ọrụ ezi omume. 19Nʼihi na dịka ọtụtụ mmadụ si bụrụ ndị mmehie nʼihi nnupu isi nke otu nwoke, otu a kwa ka ọtụtụ mmadụ ga-abụkwa ndị ezi omume nʼihi nrube isi nke otu nwoke. 20Iwu bịara mee ka mmehie na-aba ụba, ma dịka mmehie na-aba ụba, amara na-abakwa ụba karịa. 21Ya mere, dịka mmehie si bụrụ eze nʼọnwụ, otu a kwa ka amara ga-esi bụrụ eze site nʼezi omume iweta ndụ ebighị ebi site nʼaka Jisọs Kraịst, Onyenwe anyị. 6:1Gịnị ọzọkwa ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-anọgide nʼime mmehie ka amara na-aba ụba? 2E e! O kwesighị! Olee otu anyị ga-esi na-adị ndụ nʼime mmehie, mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị?

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Jud)

Jud 1:1–10

1Jud, odibo Jisọs Kraịst, na nwanne Jemis, Na-edegara ndị niile a kpọrọ, ndị ahụrụ nʼanya nʼime Chineke, bụ Nna, na ndị nọkwa nʼokpuru nchebe Jisọs Kraịst akwụkwọ ozi a: 2Ka ebere na udo na ịhụnanya bara unu ụba. 3Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ na-anụ m ọkụ nʼobi idere unu akwụkwọ banyere nzọpụta ahụ anyị nwekọrọ nʼotu, ma ahụrụ m mkpa ọ dị idere unu akwụkwọ a, ịrịọ unu ka unu guzosie ike buo agha ichebe okwukwe ahụ, nke e nyefere ndị nsọ nʼaka idebe. 4Nʼihi na ụfọdụ mmadụ, bụ ndị e dere ihe banyere ọmụma ikpe dịrị ha, siterị nʼoge gara aga, ezobatala nʼetiti unu. Ha bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-agbanwe amara Chineke anyị, mee ya ka ọ bụrụ ohere ha nwere ibi ndụ ịkwa iko, na nke ịgọnarị Jisọs Kraịst, onye naanị ya bụ Onye kachasị ihe niile elu na Onyenwe. 5Ọ bụ ezie na unu maa ihe ndị a niile, ma achọrọ m ichetara unu otu Onyenwe anyị si zọpụta ndị ya site nʼala Ijipt, ma mesịa laa ndị niile na-ekweghị ekwe nʼiyi. 6Ndị mmụọ ozi nupuru isi, ndị na-anọgideghị nʼọnọdụ e nyere ha, kama ha si nʼebe obibi ha gbapụ. O jirila igwe kee ha agbụ ebighị ebi, debe ha nʼọchịchịrị nʼime ala, ebe ha ga-anọ ruo ụbọchị ikpe ahụ dị egwu. 7Otu a kwa, Sọdọm na Gọmọra na obodo niile gbara ha gburugburu, bụ ndị nyefere onwe ha na ndụ ịkwa iko nakwa omume ibi ndụ ọjọọ dị iche iche nke anụ ahụ, bụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị mmadụ site nʼahụhụ ha tara nʼihi mmehie nʼime ọkụ ebighị ebi. 8Nʼụzọ dị otu a kwa, ndị a na-emerụ anụ ahụ ha nʼirọ nrọ ha, na-ajụkwa ike ọchịchị niile, ma na-ekwulukwa ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ. 9Ma Maikel onyeisi ndị mmụọ ozi, mgbe o guzogidere ekwensu na-arụrịtakwa ụka banyere ozu Mosis, ya onwe ya enweghị anya ike ịma ya ikpe nʼihi okwu nkwulu, kama ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị baara gị mba.” 10Ma ndị a na-ekwulu ihe niile ọbụla ha na-aghọtaghị. Dịka ụmụ anụmanụ a na-azụghị azụ, ha na-eme ihe ọbụla dị ha mma nʼanya si otu a na-ala onwe ha nʼiyi.

Oziọma

Mat 9:14–17

14Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jọn bịara jụọ ya ajụjụ sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebu ọnụ dị ka anyị onwe anyị na ndị Farisii na-eme?” 15Jisọs jụrụ ha sị, “O kwesiri ka ndị enyi onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọrọ na mwute na-erighị nri, mgbe ha na di nwanyị ọhụrụ nọ? Oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ di nwanyị ọhụrụ nʼetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ. 16“Ọ dịghị onye na-eji akwa ọhụrụ kwachie ebe akwa ochie siri dọkaa, nʼihi na akwa ahụ ga-esi nʼebe a kwachiri ya dọwaa; mee ka ọ dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ. 17Ọ dịkwaghị onye ga-etinye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ochie, nʼihi na karama ochie ahụ ga-agbawa mee ka mmanya ọhụrụ ahụ wufuo. Kama ọ dị mma itinye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ, nke ga-echekwa ha abụọ nke ọma.”

Oziọma (maka Onye nsọ Jud)

Jọn 14:21–24

21Onye ọbụla nabatara iwu m ma na-edebekwa ha bụ onye hụrụ m nʼanya. Onye hụrụ m nʼanya ka Nna m ga-ahụ nʼanya. Aga m ahụkwa ya nʼanya gosikwa ya onwe m.” 22Judas (ọ bụghị Iskarịọt) sịrị ya, “Onyenwe anyị, olee otu ị ga-esi gosi anyị onwe gị ma hapụ igosi ụwa onwe gị?” 23Jisọs zara sị ya, “Onye ọbụla hụrụ m nʼanya, ga-edebe okwu m. Nna m ga-ahụkwa ya nʼanya. Mụ na Nna m ga-abịakwa nʼebe onye ahụ nọ soro ya biri. 24Onye na-ahụghị m nʼanya agaghị edebe okwu m. Okwu ndị a niile unu nụrụ abụghị nke m. Ha bụ nke Nna ahụ, onye zitere m.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 19 Jun na kalenda nzukọ bụ 2 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike